TETA! Nke 1 n'Afọ 2025 | Otú A Ihe Si Arị Elu Ọjị, Gịnị Ka Anyị Ga-eme?
Ị̀ na-echegbu onwe gị maka otú ihe si arị elu ọjị? Ị̀ na-arụgbu onwe gị n’ọrụ iji kpaa afọ gị? Ọ̀ na-esiri gị ike inweta ohere gị na ndị ị hụrụ n’anya ga-eji na-anọrị? Ọ bụrụ otú ahụ, isiokwu ndị dị na Teta! a ga-enyere gị aka. Ha ga-agwa gị ihe ndị ị ga-eme ka ị na-enwekwu obi ụtọ ma belata nchegbu ị na-enwe. Isiokwu ikpeazụ ga-agwa gị ihe mere ị ga-eji nwee ezigbo olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Olileanya a nwedịrị ike ịkasi gị obi ugbu a.
Were Ihe Otú I Si Hụ Ya
Ọ bụrụ na anyị ewere otú ihe si na-ada ọnụ otú anyị si hụ ya, ihe nwere ike ịkatụrụ anyị mma.
Kpachara Anya Otú I Si Emefu Ego
Leba anya n’ihe ise ị ga na-eme ka ị ghara ịna-emefusị ego gị.
Ka Ihe Ndị I Nwere Ju Gị Afọ
Ị ga-amụta otú ị ga-esi na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na i nwechaghị ego.
Na-emesapụ Aka
Olee otú imesapụ aka n’oge ihe siri ike ga-esi abara gị uru?
Nwee Olileanya
Baịbụl kwuru ihe mere anyị ga-eji nwee ezigbo olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Olileanya a na-akasi anyị obi ma n’oge a.
Mụtakwuo Ihe Ndị Ọzọ
Baịbụl na-enyere ọtụtụ ndị aka ịma ihe ha ga-eme n’oge a ihe na-arị elu ọjị. O nwekwara ike inyere gịnwa aka.

