Ozi Ọma Jizọs Kwusara
Ị ga-amụtakwu banyere Jizọs Kraịst, bụ́ Ọkpara Chineke na Onye Nzọpụta ụmụ mmadụ, na vidio a tọrọ ezigbo ụtọ.
Nke 1: Ezigbo Ìhè nke Ụwa
Olee otú a ga-esi napụta ndị mmadụ n’aka mmehie Adam buteere ha? Ọ bụ naanị Mezaya ga-azọpụtali ndị mmadụ.
Vidio Nke 2: “Onye A Bụ Ọkpara M”
Jọn Onye Na-eme Baptizim kwadebeere Mezaya ụzọ. Lee ihe ndị dị ịtụnanya mere mgbe Jizọs malitere ọrụ ya n’ụwa.
Nke 3: ‘Ọ Bụ Mụnwa Bụ Ya’
Jizọs mere ka nwaanyị Sameria, Nikọdimọs, na ndị bi na Nazaret mara na ọ bụ ya bụ Mezaya. Ma, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole nwere ezigbo obi nabatara ya. Mgbe ọ rụchara ọrụ ebube dị ịtụnanya, ọ gwara ndị na-akụ azụ̀ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya.
Nke 4: “Ọ Bụ Ihe Mere M Ji Bịa”
Jizọs ji ike Chineke nyere ya gwọọ ndị mmadụ, chụpụkwa ndị mmụọ ọjọọ. Ma, ụfọdụ ndị gbara ọrụ ya ụkwụ, kpaakwa nkata igbu ya. Jizọs gosiri na ya dị umeala n’obi, kụzie ihe otú na-enweghị atụ, kwusaa ozi ọma, họpụtakwa ndị ozi iri na abụọ.
Nke 5: ‘Otú O Si Ezi Ihe Juru Ha Anya’
Mgbe Jizọs gwọchara nnukwu ìgwè mmadụ, ọ malitere ịkụziri ha ihe otú ndị nkụzi ha na-akụzitụbeghị. Ikike Jizọs nwere, ihe atụ ndị o mere, na otú ihe ọ kụziri si daba n’ihe na-eme kwa ụbọchị juru ndị ọ na-agwa okwu anya.
Nke 6: “Ọ̀ Bụ Gị Bụ Onye Anyị Na-atụ Anya Ya Kemgbe?”
Jizọs gosiri na o nwere ikike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ọrụ ebube ndị ọ rụrụ na ihe ndị ọ kụziri mere ka a mata ihe dị ndị ọ na-agwa okwu n’obi. Jizọs ji ihe atụ dị iche iche kọwaa Alaeze Chineke.
Ihe Ndị Si na Vidio Dị Iche Iche nke Vidio Ozi Ọma Jizọs Kwusara
Lee ihe ndị si n’ọmarịcha vidio ndị a bụ́ ndị ga-eme ka ọ dị gị ka ị̀ nọ ya mgbe ihe ndị e kwuru n’Ozi Ọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn na-eme.

