Mozis na Erọn Gosiri na Ha Nwere Ezigbo Obi Ike
Mozis na Erọn gosiri na ha nwere ezigbo obi ike mgbe ha na-agwa Fero okwu n’agbanyeghị na ọ bụ nwoke kacha akpa ike n’ụwa mgbe ahụ. Gịnị nyeere ha aka inwe ụdị obi ike a? Baịbụl kwuru banyere Mozis, sị: “Ọ bụ okwukwe ka o ji hapụ Ijipt, ma ọ tụghị iwe eze egwu, n’ihi na o guzosiri ike dị ka à ga-asị na ọ na-ahụ onye ahụ anya bụ́ Onye a na-apụghị ịhụ anya.” (Hib. 11:27) Mozis na Erọn nwere okwukwe siri ike n’ebe Jehova nọ, ha tụkwasịkwara ya obi.
Olee ọnọdụ ndị ga-achọ ka i jiri obi ike gwa onye nọ n’ọkwá dị elu ihe i kweere?