Ihe A Na-eme n’Ụlọ Ọrụ Anyị na Oge E Ji Aga Elegharị Anya Ebe Ahụ
Obi ga-adị anyị ụtọ ma ị gaa legharịa anya n’ụlọ ọrụ anyị dị iche iche nakwa n’ebe ndị anyị na-ebi akwụkwọ. Ebe a ka ị ga-anọ achọpụta ebe ụlọ ọrụ anyị dị na oge ndị ọbịa ji aga elegharị anya ebe ahụ.
Slovenia
Groharjeva ulica 22
SI-1241 KAMNIK
SLOVENIA
+386 1-83-03-600
Oge E Ji Akpọgharị Ndị Ọbịa
Mọnde ruo Fraịdee
8:00 ụtụtụ ruo 11:00 ụtụtụ na 1:00 ehihie ruo 4:00 mgbede
Ọ na-ewe otu awa
Ihe A Na-eme
A na-asụgharị akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ Slovenian. A na-emepụtakwa ihe ndị a na-egere egere n’asụsụ Slovenian.