Gaa n'Isiokwu

Ihe A Na-eme n’Ụlọ Ọrụ Anyị na Oge E Ji Aga Elegharị Anya Ebe Ahụ

Obi ga-adị anyị ụtọ ma ị gaa legharịa anya n’ụlọ ọrụ anyị dị iche iche nakwa n’ebe ndị anyị na-ebi akwụkwọ. Ebe a ka ị ga-anọ achọpụta ebe ụlọ ọrụ anyị dị na oge ndị ọbịa ji aga elegharị anya ebe ahụ.

Ihe Banyere Koronavaịrọs: N'ọtụtụ mba, anyị anaghịzi ekwe ka ndị mmadụ bịa ilegharị anya n'alaka ụlọ ọrụ anyị. Biko kpọọ alaka ụlọ ọrụ ị chọrọ ịga ka ha kọwakwuoro gị.

Filipinz

Maka Ịgwa Anyị Oge Ị Ga-achọ Ịbịa Legharịa Anya

Mmadụ ò kwesịrị ịgwa anyị mgbe ọ ga-achọ ịbịa legharịa anya? Ee. Iji hụ na ndị bịara ilegharị anya n’otu oge akarịghị akarị, anyị ga-achọ ka ndị ọ bụla ga-abịa ilegharị anya gwa anyị agwa tupu ha abịa n’agbanyeghị ole ha ga-adị. Ya bụrụ n’oge ezumike ka unu ga-achọ ịbịa, biko gwanụ anyị ọ dịkarịala otu ọnwa tupu oge unu ga-abịa eruo.

Ọ bụrụ na ị gwaghị anyị agwa tupu gị abịa, ị̀ ka nwere ike ịga legharịa anya? O nwere ike anyị agaghị ekwe ka ị gaa legharịa anya. Anyị enweghị ebe ga-aba ọtụtụ mmadụ, n’ihi ya, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ka anyị nwere ike ịkpọgharị n’ụbọchị.

Olee oge i kwesịrị irute n’ụbọchị ị chọrọ ịbịa legharịa anya? Iji hụ na ndị bịara ilegharị anya n’otu oge akarịghị akarị, biko abịala ihe karịrị otu awa tupu oge ị chọrọ iji malite ilegharị anya eruo.

Olee otú ị ga-esi agwa anyị na ị chọrọ ịbịa legharịa anya? Pịa ebe e dere “Kwuo Oge Ị Ga-achọ Ịbịa Legharịa Anya.”

Ì nwere ike ịkagbu oge ị chọrọ ịbịa legharịa anya ma ọ bụ gbanwee ya? “Lee Oge I Tinyere ma ọ bụ Gbanwee Ya.”

Ọ bụrụkwanụ na mmadụ ole anyị chọrọ ịkpọgharị n’ụbọchị ị chọrọ ịbịa legharịa anya ezuola? Nọgide na-ele n’adres Ịntanet anyị n’ihi na anyị nwere ike ikwe ka ị bịa legharịa anya n’ụbọchị ahụ ma ọ bụrụ na ndị tinyeburu ụbọchị ahụ akagbuo ma ọ bụ yigharịa ya.

Adres Ya

186 Roosevelt Ave

San Francisco del Monte

1105 QUEZON CITY

PHILIPPINES

+63 2-3224-4444

Ihe A Na-eme

Alaka ụlọ ọrụ a na-asụgharị Ụlọ Nche n’asụsụ iri a ma ama na Filipinz. Na-emepụtakwa vidio na ihe ndị a na-egere egere n’asụsụ iri abụọ. Ha na-ebugara ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị 3,472 na Filipinz akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl.Danloduo Akwụkwọ Ga-akọkwuru Gị Ihe Ndị Ọzọ