Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

ADALA MBÀ

nke Ndịàmà Jehova nke Afọ 2017

Mgbakọ Ukwu

Anyị ji obi ụtọ na-akpọ gị ka ị bịa mgbakọ Ndịàmà Jehova ga-enwe n’afọ a. Ọ ga-ewe abalị atọ.

IHE ỤFỌDỤ A GA-EME NÁ MGBAKỌ A

  • Okwu na Ajụjụ Ọnụ: Ị ga-ahụ otú Chineke si enyere ụdị mmadụ niile aka ‘ịtachi obi,’ ma n’oge anyị a.​—⁠Ndị Rom 15:⁠5.

  • Ihe Ndị A Na-egere Egere na Vidio Ndị A Ga-egosi: Ị ga-ahụ otú Baịbụl na ihe ndị e kere eke si akụziri anyị otú anyị ga-esi na-atachi obi.

  • Fim Ndị A Ga-egosi: N’ehihie ọ bụla, a ga-egosi fim kọrọ gbasara otu ezinụlọ nke bịara ghọta ihe mere Jizọs ji kwuo, sị: “Chetanụ nwunye Lọt.”​—⁠Luk 17:⁠32.

  • Okwu Ihu Ọha: Ị ga-amụta ezigbo ihe n’okwu ihu ọha na-agba ume a ga-ekwu n’ụtụtụ Sọnde nke isiokwu ya bụ “Akwụsịkwala Inwe Olileanya.”

ÒNYE NWERE IKE ỊBỊA MGBAKỌ A?

Ma onye ukwu ma onye nta. Ị gaghị akwụ ụgwọ tupu gị abata, o nweghịkwa onye a ga-abịa nawa ego.

Gụọ akwụkwọ e dere ihe niile a ga-eme, leekwa vidio gbasara mgbakọ anyị.

Chọta nke Dị Gị Nso

Leekwa Ihe Ndị Ọzọ

Usoro Ihe Omume Mgbakọ Ukwu nke Afọ 2017

GỤKWUO GBASARA YA

MGBAKỌ

Vidio: Mgbakọ Ndịàmà Jehova Na-enwe Kwa Afọ

Chọpụta ihe mere ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa niile ji aga mgbakọ a.

OLE NDỊ NA-EME UCHE JEHOVA TAA?

Gịnị Mere Anyị Ji Aga Mgbakọ?

Kwa afọ, anyị na-aga mgbakọ ugboro atọ. Olee uru anyị na-erite ma anyị gaa mgbakọ ndị a?