Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Isi n’Etiti Osimiri Tara Ata Gaa Kwusaa Ozi Ọma

Isi n’Etiti Osimiri Tara Ata Gaa Kwusaa Ozi Ọma

E nwere ụmụ obere agwaetiti ndị dị nso n’ebe ọdịda anyanwụ steeti ndị Jamanị a na-akpọ Skleswig-Holstin. A na-akpọ agwaetiti ndị ahụ Haligin. Ihe dị ka narị mmadụ atọ bi na ha. Ha dịkwa n’oké osimiri. Olee otú Ndịàmà Jehova na-esi aga ezi ndị bi n’ebe ndị ahụ ozi ọma?Matiu 24:14.

Ndịàmà Jehova na-eji ụgbọ mmiri aga n’ụfọdụ n’ime ha. Ma, ụfọdụ n’ime ha chọọ izi ndị bi n’agwaetiti ndị ọzọ ozi ọma, ha na-esi n’ụzọ ọzọ aga n’ebe ndị ahụ. Ha na-eji ụkwụ aga ihe dị ka kilomita ise n’etiti osimiri tara ata. Olee otú ha si eme ya?

Ha Na-aga n’Oge Osimiri Tara

Otú ha si eme ya bụ ịmata oge osimiri ji eto na oge o ji ata. N’ihe dị ka awa isi ọ bụla, osimiri dị na Haligin na-ata ihe dị ka mita atọ, n’awa isii ọzọ, ya etookwa. N’oge ọ tara, ụmụnna anyị na-eji ụkwụ si na ya gaa n’agwaetiti atọ n’ime agwaetiti ndị dị ebe ahụ.

Olee ihe ndị ọ na-ewe iji ruo ebe ndị ahụ? Otu nwanna aha ya bụ Ulrich bụ́ aka ochie n’ịkpọ ndị mmadụ aga ebe ahụ kwuru, sị: “Ọ na-ewe ihe dị ka awa abụọ tupu mmadụ eruo n’otu n’ime agwaetiti ndị dị na Haligin. Anyị na-agbakarị ụkwụ ọtọ aga. Ọ bụ ụzọ kacha mma e si esi n’etiti osimiri tara ata aga ekwusa ozi ọma n’agwaetiti ndị ahụ. N’oge oyi, anyị na-eyi buutu.”

Ọ dị ka ihe na-eme ná nrọ. Nwanna Ulrich kwuru, sị: “Mgbe anyị na-aga, ọ na-adị anyị ka ànyị nọ n’ụwa ọzọ. Ebe ụfọdụ n’osimiri ahụ bụ apịtị apịtị, ebe ụfọdụ abụrụ okwute okwute. E nwekwara ebe ndị ahịhịa juru na ya. Ị na-aga, gị ana-ahụ nnụnụ dị iche iche, nshịkọ, na anụmanụ ndị ọzọ.” Mgbe ụfọdụ, ụmụnna anyị na-agafe obere mmiri dị́ n’etiti osimiri ahụ. Ihe a na-akpọ ya n’asụsụ Jaman bụ Priele.

E nwere nsogbu ụmụnna anyị na-enwe ma ha na-aga n’ebe ndị ahụ. Nwanna Ulrich kwuru, sị: “Mmadụ nwedịrị ike ifu ụzọ ma ọ na-aga, nke ka nke, ma alụlụ kpuchie ebe niile. N’ihi ya, anyị na-eji ihe na-enyere mmadụ aka ịma ebe ọ na-aga, aga. Anyị na-agba mbọ gafee n’oge tupu osimiri ahụ etojuo.”

Ebe Ndịàmà Jehova na-ezi ozi ọma n’otu n’ime obere agwaetiti e nwere na Haligin

Mbọ niile a ụmụnna anyị gbara, ọ̀ baara uru? Nwanna Ulrich kọrọ ihe otu nwoke karịrị afọ iri itoolu mere. Nwoke a na-agụkarị Ụlọ Nche anyị na Teta! Nwanna Ulrich kọrọ, sị: “E nwere otu ụbọchị anyị na-enwechaghị ohere ịga na nke nwoke a. Ma, tupu anyị alawa, ọ gbaara ígwè ya bịakwute anyị ma sị, ‘Ùnu agaghị enye m Ụlọ Nche taa?’ Ihe a o kwuru mere ka obi tọọ anyị ụtọ, n’ihi ya, anyị nyere ya Ụlọ Nche.”

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Ji Ezi Ndị Mmadụ Ozi Ọma?

Gụọ ihe a ka ị mata ihe atọ gbara ọkpụrụkpụ mere anyị ji ezi ozi ọma n’ụwa niile.

Olee Otú E Si Hazie Ozi Ọma Anyị Na-ekwusa?

Anyị na-eme ihe Jizọs mere mgbe ọ nọ n’ụwa. Olee otú anyị si ekwusa ozi ọma?