Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ememme Ngụcha Akwụkwọ Gilied nke Klas 133

Satọdee Septemba 8, 2012

Ememme Ngụcha Akwụkwọ Gilied nke Klas 133

Mgbe ụmụ akwụkwọ Gilied dị mmadụ iri anọ na asatọ gụchara akwụkwọ ọnwa ise n’Ogige Ụlọ Akwụkwọ Ndịàmà Jehova dị na Patasịn, na Niu Yọk, e meere ha ememme ngụcha akwụkwọ. Ndị enyi ha, ndị ikwu na ibe ha, na ndị ọzọ bịaranụ ka ha gbaa ha ume dị puku mmadụ itoolu, narị isii na iri itoolu na anọ.

Kemgbe afọ 1943, a zụọla ihe karịrị mmadụ puku asatọ ka ha gaa kwusawa ozi ọma ná mba ọzọ. Akwụkwọ bụ́ isi a na-eji akụziri ha ihe bụ Baịbụl. Ihe ndị a na-akụziri ha bụ ihe ndị ga-eme ka okwukwe ha sikwuo ike na ihe ndị ga-enyere ha aka idi nsogbu ndị nwere ike ịbịara ha n’ebe e zigara ha.

“Na-echebaranụ Ihe Ndị Na-Akpali Ịhụnanya Echiche.” Anthony Morris, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, onye bụ́kwa onyeisi oche ememme ngụcha akwụkwọ ahụ, si n’ihe dị ná Ndị Filipaị 4:8 kwuo okwu mbụ e kwuru n’ememme ahụ. Ebe ahụ sịrị: “Ihe ọ bụla nke na-akpali ịhụnanya, . . . na-echebaranụ ihe ndị a echiche.”

Nwanna Morris kwuru na ichebara ihe ndị na-akpali ịhụnanya echiche ga-eme ka obi na-adị anyị mma n’ụwa ọjọọ a. Ọ gwara ụmụ akwụkwọ ahụ, sị: “Ka anya unu dị n’ihe ndị na-akpali ịhụnanya, gbalịakwanụ bụrụ ndị ndị ọzọ ga-ahụli n’anya.”

Dị ka ihe atụ, Nna anyị nke eluigwe nwere ihe ọ na-eme nke anyị niile kwesịrị ịmụta. Ihe ahụ bụ na ọ naghị atụcha anyị ka ọ hụ ebe ndị anyị na-emejọ. (Abụ Ọma 130:3) Nwanna Morris gwaziri ha, sị: “Unu anala elekwasị anya n’ebe ụmụnna unu na-adịghị eme nke ọma. Na-emekwanụ ihe ndị ọzọ ga-eji na-ahụ unu n’anya.”

“Mara Ihe, Ma Abụla Onye Oké Amamihe.” Nwanna Harold Corkern, onye so na Kọmitii Alaka n’Amerịka ji ihe dị n’Ekliziastis 7:16 kwuo okwu. Ọ sịrị na Chineke chọrọ ka anyị jiri ihe ndị anyị ma mee ihe bara uru, ọ bụghị ikwe ka amamihe anyị baa anyị n’isi.

Nwanna Corkern kwuru na anyị kwesịrị iji obi ọma na-enye ndị ọzọ ndụmọdụ ma ọ bụ na-agwa ha banyere ihe ha mejọrọ. Anyị ekwesịghị ịna-atụ anya ka ndị ọzọ na-emetacha ihe niile n’ihi na Chineke anaghị eme otú ahụ. Nwanna Corkern kwukwara, sị: “I jiri amamihe gị na nghọta gị na-eme ihe ọma, ụmụnna ga na-akpa gị nso.”

“Echefula Ihe Ndị Chineke Mere.” (Abụ Ọma 78:7) Nwanna Guy Pierce, onye so n’Òtù Na-achị Isi kwuru ná mmalite okwu ya na àgwà nwatakịrị na-akpa nwere ike ime ka ndị mụrụ ya nwee aha ọma ma ọ bụ aha ọjọọ. (Ilu 20:11) Otú ahụ kwa ka ọ dị anyịnwa, àgwà anyị nwere ike ime ka e too Nna anyị nke eluigwe ma ọ bụ kọchaa ya. Baịbụl sịrị: “Ụmụ Chineke na ụmụ Ekwensu pụtara ìhè site n’ihe a: Onye ọ bụla nke na-adịghị eme ezi omume esiteghị na Chineke.”—1 Jọn 3:10.

Nwanna Pierce kwuru na ihe mere e ji kpọọ ụmụ akwụkwọ ahụ ka ha bịa Ụlọ Akwụkwọ Gilied bụ maka àgwà ọma ha na ịdị umeala n’obi ha. Ọ gwara ha nọgide na-adị umeala n’obi. Ihe ndị a kụziiri ha emeghị ka ha kara ndị ọzọ. Kama nke ahụ, o meela ka ha nwekwuo ike iso mee ka ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile dịrị n’otu meekwa ka ha bụrụ ndị a ga-eji ama atụ n’ịdị umeala n’obi. (Abụ Ọma 133:1) Nwanna Pierce kwukwara, sị: “Ihe ndị unu mụtara n’ụlọ akwụkwọ a emeela ka unu marakwuo Baịbụl. Ha ga-enyekwara unu aka ịna-amụtakwu ihe ndị ọzọ banyere Jehova.”

“Ihe Anyị Mere Bụ Ihe Anyị Kwesịrị Ime.” Nwanna William Samuelson, onye nlekọta Ngalaba Na-ahụ Maka Ụlọ Akwụkwọ Ndị E Nwere ná Nzukọ Jehova jụrụ ụmụ akwụkwọ ahụ, sị: “Olee ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ọrụ e nyere anyị abụghị nke anyị chọrọ ka e nye anyị?” Anyị nwere ike ịmụta ihe n’ihe e kwuru na Luk 17:7-10. Ebe ahụ sịrị: “Unu onwe unu, mgbe unu mere ihe niile e kenyere unu, sịnụ, ‘Anyị bụ ndị ohu na-abaghị uru ọ bụla. Ihe anyị mere bụ ihe anyị kwesịrị ime.’” E jiri anyị tụnyere Nna anyị ukwu Jehova, anyị ‘abaghị uru ọ bụla.’

Ụmụ akwụkwọ ahụ ji ọtụtụ izu mụọ ihe na klas. A ga-enwe ụfọdụ n’ime ha o siiri ike. Ma, Nwanna Samuelson gwara ha, sị: “Unu mere ihe unu kwesịrị ime. Unu ahụkwala uru ọ baara unu ugbu a n’ihi na o meela ka unu nwekwuo okwukwe.” Nwanna Samuelson gwaziri ha, sị: “Ebe unu bụ ndị na-elekọta ụlọ a tụkwasịrị obi, jirinụ ihe ùgwù unu nwere ijere Onyenwe eluigwe na ala ozi kpọrọ ihe.”

“Na-echetanụ Nkwa Jehova Ma Ọnwụnwa Bịara Unu.” Nwanna Sam Roberson, osote onye nlekọta nke Ngalaba Na-ahụ Maka Ụlọ Akwụkwọ Ndị E Nwere ná Nzukọ Jehova, gwara ụmụ akwụkwọ ahụ na mgbe ụfọdụ, obi nwere ike ịda ha mbà. N’ihi ya, ọ gwara ụmụ akwụkwọ ahụ ka ha na-echeta ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl Chineke mesiri obi ike. Dị ka ihe atụ, Mozis gwara Jọshụa, sị: ‘Jehova agaghị agbahapụ gị, ọ gaghịkwa ahapụ gị ma ọlị.’ (Diuterọnọmi 31:8) Mgbe Jọshụa na-aga ịnwụ, ọ sịrị: “Ọ dịghị otu ihe n’ime ihe ọma niile Jehova bụ́ Chineke unu gwara unu nke na-emezughị.”—Jọshụa 23:14.

Jehova Chineke kwere ndị na-efe ya nkwa, sị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.” (Ndị Hibru 13:5) Ọ na-ekwe anyị nkwa na ya ga-emezu ihe aha ya bụ́ Jehova pụtara (“Ọ Na-eme Ka Ọ Bụrụ”), nakwa na ya ga-abụ ihe ọ bụla dị mkpa iji gbooro ndị na-efe ya mkpa ha. Nwanna Roberson gbara ha ume, sị: “Unu ekwekwala ka ihe ọ bụla mee ka ike ife Jehova gwụ unu. Chetanụ na Jehova emekataghị gharịpụ unu.”

“Ụda Ha Gazuru Ụwa Dum.” (Ndị Rom 10:18) Nwanna Mark Noumair, onye nkụzi n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied, kpọpụtara ụmụ akwụkwọ ndị ahụ si n’obodo dị iche iche ka ha kọọ ahụmahụ ndị ha nwetara mgbe ha na-ekwusa ozi ọma na Patasịn na n’ebe ndị dị nso na Patasịn, ma ọ bụkwanụ jiri ha mee ihe ngosi. Dị ka ihe atụ, obi dị otu di na nwunye si Saụt Afrịka ụtọ ịhụ ụmụ nwaanyị atọ si Saụt Afrịka. Ha jikwa asụsụ Zulu na Kosa zie ha ozi ọma. Otu di na nwunye si Siri Lanka hụrụ nwoke onye India nwunye ya na nwa ya nwaanyị bi na Siri Lanka. Nwoke ahụ ahụtụbeghị Baịbụl mbụ, n’ihi ya, di na nwunye ahụ ji obi ụtọ nye ya otu n’ime Baịbụl ha.

“Ndị A Kwadebere Ịrụ Ezi Ọrụ Niile.” Otu nwanna aha ya bụ Gene Smalley, onye na-enyere Kọmitii Ide Ihe aka gbara ndị di na nwunye abụọ so ná ndị na-agụcha akwụkwọ ajụjụ ọnụ. Ha si Siera Lion. Ha kwuru na ebe ọ bụ na ha e nweghị mmiri pọmpụ n’ụlọ ha, ha na-aga eseta mmiri kwa ụbọchị. Ma, e nweghị ihe nke ahụ bụ ma e jiri ya tụnyere ọṅụ ha na-enwe maka na ha na-amụrụ mmadụ iri ise Baịbụl. Ndị di na nwunye abụọ a kwuru na obi dị ha ụtọ maka otú ihe a kụziiri ha n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied sirila nyere ha aka ha abụrụ ndị a kwadebere ịrụ ezi ọrụ niile n’ebe ọ bụla a ga-asị ha jewe ozi.—2 Timoti 3:16, 17.

“Tachie Obi Ruo Ọgwụgwụ, Ma Ka Na-atachi Obi.” Nwanna Gerrit Lösch, onye so n’Òtù Na-achị isi, kwuru ná mmalite okwu bụ́ isi n’ememme ngụcha akwụkwọ ahụ na ndị na-agba ọsọ aga ebe dị anya na-ama otú ha ga-esi na-agba ka ha nwee ike inwe ume ha ga-eji gbaruo n’isi. N’egwuregwu ịgba ọsọ, ọ bụ naanị otu onye na-emeri. Ma, n’ọsọ Ndị Kraịst na-agba, ndị niile tachiri obi ruo ọgwụgwụ na-emeri.

Ịtachi obi pụtara ịna-efe Chineke n’akwụsịghị akwụsị, n’akwụsịghị inwe olileanya mgbe ihe na-esiri anyị ike, mgbe a na-akpagbu anyị, mgbe ọnwụnwa bịaara anyị, ma ọ bụ mgbe ihe anyị tụrụ anya ya na-emeghị. Jizọs sịrị: “Ọ bụ onye tachiri obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta” (Matiu 24:13) Obi na-esi anyị ike ma anyị cheta na Jehova na Jizọs na-ahụ na anyị na-atachi obi. Nwanna Lösch kwuru ihe ndị ga-enyere anyị aka ịtachi obi n’agbanyeghị nsogbu ndị na-abịara anyị. Lee ihe ụfọdụ o kwuru:

  • Na-ekpegara Chineke ekpere. Ọ bụ Chineke “na-enye ntachi obi,” ọ bụkwa ya “na-eburu anyị ibu anyị kwa ụbọchị.”—Ndị Rom 15:5; Abụ Ọma 68:19.

  • Kpebisie ike na ị gaghị akwụsị ife Jehova ebe ọ bụ na ị ma na ‘Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa gị gabiga ihe ị pụrụ idi, kama mgbe ọnwụnwa bịara, ọ ga-emere gị ụzọ mgbapụ, ka i wee nwee ike idi ya.’—1 Ndị Kọrịnt 10:13.

  • Na-echeta ụgwọ ọrụ Jehova ga-akwụ anyị. “N’ihi ọṅụ e debere n’ihu [Jizọs], o diri osisi ịta ahụhụ.”—Ndị Hibru 12:2.

Nwanna Lösch kwusiri okwu ike na ugbu a ụwa ochie a na-agwụ agwụ abụghị oge anyị ga-ada mbà. ‘Ka anyị jiri ntachi obi na-agba ọsọ ahụ e debere n’ihu anyị.’—Ndị Hibru 12:1.

Ná mmechi ememme a, otú n’ime ụmụ akwụkwọ ahụ gụrụ akwụkwọ ozi ndị klas ha dere iji gosi na obi dị ha ụtọ maka ihe ndị a kụziiri ha. Akwụkwọ ozi ahụ kwuru na otú e si kụziere ha Baịbụl nke ọma, nakwa otú ha si mụọ ya n’usoro ihe dị na ya si mee, mere ka ha ghọtakwuo ihe ndị Chineke zubere, meekwa ka okwukwe ha sikwuo ike. Ha dere n’akwụkwọ ozi ahụ, sị: “Anyị ekpebisiela ike ime ihe anyị mụtara.”