Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

Ihe Ndị E Mere ná Nnọkọ A Na-enwe Kwa Afọ

‘Inye Nri n’Oge Kwesịrị Ekwesị’

Ihe Ndị E Mere ná Nnọkọ A Na-enwe Kwa Afọ

Ihe a bụ nnọkọ Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania na-enwe kwa afọ, nke otu narị na iri abụọ na asatọ ya. A kọọrọ ọtụtụ puku mmadụ gbakọtara maka nnọkọ a ihe ndị na-eme obi ụtọ gbasara otú ọrụ anyị si aga n’ụwa niile, kọwaakwara ha ihe dị na Matiu 24:45-47.

 

E nwere nnọkọ a n’abalị isii n’ọnwa Ọktoba afọ 2012, ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku mmadụ ise bịakwara ya. Ọ bụ n’Ụlọ Mgbakọ Ndịàmà Jehova dị na Jesi Siti, Niu Jesi, Amerịka ka a nọ nwee nnọkọ a. Ihe karịrị puku mmadụ iri nọkwa na-ele ya na vidio na Bruklin, Patasịn, na Wọkil, ndị dịcha na Niu Yọk, nakwa n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Kanada.

 

Ọ bụ Nwanna Anthony Morris, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova bụ onyeisi oche nnọkọ a. O kwuru ihe ndị e mere ná nnọkọ ndị hiri odo e nwere n’oge ndị gara aga. Ndị bịara maka nnọkọ a ma na nnọkọ nke afọ a ga-agba onye ọ bụla ume. Mana ha nọ na-eche ma ọ̀ ga-abụkwa ọ̀ pụrụ iche.’

 

E gosiri ndị bịaranụ vidio abụọ gbasara otú ọrụ anyị si aga n’ụwa niile.

 

Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze:

Vidio nke mbụ kwuru gbasara otú e si na-arụrụ ọgbakọ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ime afọ iri na atọ gara aga, ụmụnna ndị na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a arụọla Ụlọ Nzukọ Alaeze dị puku iri abụọ na ise, narị anọ na abụọ. Ná nkezi, e nwere ike ikwu na ụmụnna ndị a na-arụcha ihe karịrị Ụlọ Nzukọ Alaeze ise n’otu ụbọchị. Ebe e si nweta ego e ji rụọ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a bụ n’onyinye Ndịàmà Jehova nọ n’ụwa niile na-enye. E nwee ọdachi, ụmụnna ndị a na-agakwa arụziri ụmụnna anyị Ụlọ Nzukọ Alaeze ha ma ọ bụ ụlọ ha ndị mebiri emebi ma ọ bụkwanụ ha arụọrọ ha nke ọhụrụ.

 

Mgbakọ Ukwu Ndị Pụrụ Iche:

N’afọ 2012, Ndịàmà Jehova nwere mgbakọ ukwu n’ebe dị iche iche, ndị sịkwa mba dị iche iche bịara ya. Olee otú mgbakọ ukwu ndị a si dị iche ná ndị nke e nwere n’afọ ndị gara aga?

 

Vidio nke abụọ kwuru na ọ bụ alaka ụlọ ọrụ ndị dị ná mba ndị e nwere mgbakọ ndị a hụrụ maka ịchọta ebe ụmụnna ndị si esi bịa ga-ebi, nakwa nri ha ga-eri n’ehihie n’izu ahụ a nọ ná mgbakọ. Ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ụmụnna anyị dị otu puku na narị ise si mba ọzọ gaa mgbakọ nke ọ bụla.

 

Ndị a si mba ọzọ na ụmụnna ndị bi n’obodo ndị a nọ nwee mgbakọ ndị a ji ohere a mata ibe ha, ma mgbe ha nọ n’Ụlọ Mgbakọ, ma mgbe ha na-aga elegharị anya, ma mgbe ha na-erikọ nri, ma mgbe ha na-aga ọma n’ebe ndị dị nso n’ala mgbakọ. E kwuru na vidio ahụ na “ná mgbakọ ndị nke e nwerela, ihe kacha eme ka ụmụnna anyị dịrị n’otu bụ na ha hụrụ ibe ha n’anya.”

 

Obi tọrọ ndị niile gbakọtaranụ ezigbo ụtọ mgbe a gwara ha na bido ugbu a gawa, a ga na-ahọrọ mba ụfọdụ n’afọ ọ bụla ka Ndịàmà Jehova nọrọ na ha nwee mgbakọ ndị a pụrụ iche.

 

Lee ihe ndị ọzọ e mere ná nnọkọ a:

 

Ajụjụ Ọnụ:

Ụmụnna atọ so na Kọmitii Alaka na ndị nwunye ha kọrọ otú Jehova Chineke sirila zụọ ha ka ha nwee ike ịrụ ụdị ọrụ ọ bụla e nyere ha. A gbakọta afọ ole ha nọrọla n’ozi oge niile, ọ dị narị afọ atọ na iri anọ na abụọ.

 

Nwanna Richard Kelsey, onye so na Kọmitii Alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Jamanị sịrị na Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Kọmitii Alaka na Nwunye Ha kụziiri ya “ịna-eme ihe Jehova kwuru mgbe niile.” Jehova bụ Nna anyị hụrụ anyị n’anya, ọ chọkwara ka ihe gaziere anyị.” Nwanna Kelsey kwukwara na Jehova “chọrọ ka anyị dịrị ndụ ebighị ebi. Ọ na-emekwa ihe niile o kwesịrị ime iji lekọta anyị.” Ụlọ akwụkwọ ahụ kụziiri Ndị Kọmitii Alaka ka ha na-eṅomi Jehova.

 

E nwere otú nwanna nwaanyị a na-akpọ Linda Johansson. N’afọ 1958, bụ́ afọ abụọ na ọkara o mechara baptizim, na otu afọ ọ lụchara di, a kpọrọ ya ka ọ gaa Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Nwanna nwaanyị Johansson kwuru, sị: ‘Ndị mụ na ha nọ na klas bụ ndị ma nke a na-akọ n’ọgbakọ na ndị jirila ọtụtụ afọ jeere Jehova ozi. O mere ya adị m ka mụ erughị eru ịnọ ebe ahụ.’

 

Ma, nwanna nwaanyị Johansson jisiri ike na-agụ akwụkwọ ya. Mgbe ọ gụchara akwụkwọ, a họpụtara ya na di ya ka ha gaa kwusawa ozi ọma na Malawi. Mgbe mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ a na-akpagbu Ndịàmà Jehova ná mba ahụ kwụsịrị, ọ mụụrụ otu onye ọrụ gọọmenti so kpagbuo Ndịàmà Jehova Baịbụl. Taa, nwunye nwoke ahụ, nwa ya nwoke, na nwa ya nwaanyị, emeela baptizim.

 

Ikwusa Ozi Ọma n’Ebe Ndị Na-ekwo Ekwo:

Mmadụ anọ gụcharala akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Lụrụ Di na Nwunye na onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na-eje ozi na Niu Yọk kọrọ ahụmahụ ndị ha nwere mgbe ha na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ebe ndị na-ekwo ekwo.

 

N’ebe ndị mepere emepe, Ndịàmà Jehova na-edowe akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl na tebụl nakwa n’ihe ndị a na-akwagharị akwagharị. Ndị na-agafe agafe nwere ike iwere nke ọ bụla ha chọrọ, ha nwekwara ike ịjụ ajụjụ ndị ha chọrọ ịjụ gbasara Baịbụl, ma ọ bụkwanụ kwuo ka a bịa na-amụrụ ha Baịbụl.

 

Ndịàmà Jehova nọ n’ebe ndị ọzọ na Niu Yọk Siti, nakwa ndị nke nọ na Chikago na Lọs Anjelis na-emekwa otu ihe ahụ. Naanị otu afọ ha mere ya, ihe dị ka puku mmadụ abụọ na narị mmadụ asaa, ndị bịara n’ebe ndị ha dowere akwụkwọ anyị, kwuru ka a bịa na-amụrụ ha Baịbụl n’anaghị ha ego.

 

Abụ Ụmụaka:

Ọ fọrọ obere ka anya mmiri gbawa mmadụ niile mgbe ụmụaka iri na asaa bụrụ abụ isiokwu ya bụ “Gee Ntị, Rube isi, Ka A Gọzie Gị,” nke si n’akwụkwọ abụ anyị bụ́ Bụkuo Jehova Abụ (Abụ nke 120).

 

Mgbe ha bụchara abụ, e nwere okwu mmadụ isii kwuru. Ndị kwuru ya bụ ndị so n’Òtù Na-achị Isi. Ha bụ Nwanna Jackson, Nwanna Lösch, Nwanna Pierce, Nwanna Herd, Nwanna Lett, na Nwanna Splane. Ha kọwara ihe Jizọs kwuru na Matiu 24:45-47. Ọ sịrị:

“Ònye n’ezie bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, nke nna ya ukwu mere onye na-elekọta ezinụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri ha n’oge kwesịrị ekwesị? Obi ụtọ na-adịrị ohu ahụ ma ọ bụrụ na nna ya ukwu abịarute wee hụ ya ka ọ na-eme otú ahụ! N’ezie, ana m asị unu, Ọ ga-eme ya onye na-elekọta ihe niile o nwere.”

 

Ha zara ajụjụ ndị a n’okwu ndị ahụ ha kwuru:

 

Olee Mgbe Jizọs Mere “Ohu Ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi, Onye Nwekwara Uche” Onye Na-elekọta Ezinụlọ Ya?

Tụlee ihe Jizọs na-ekwu okwu ya na Matiu isi 24. Ihe ndị e kwuru n’amaokwu niile a e depụtasịrị ebe a ga-emezu n’oge ọnụnọ Kraịst, ya bụ, ‘n’ọgwụgwụ usoro ihe a.’​—Amaokwu nke 3.

 

  • “Mkpagbu nke ụbọchị ndị ahụ.”​—Amaokwu nke 29.

  • “Ọgbọ a.”​—Amaokwu nke 34.

  • “Ụbọchị ahụ na oge awa ahụ.”​—Amaokwu nke 36.

  • “Ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.”​—Amaokwu nke 42.

  • “N’oge awa unu na-echeghị na ọ ga-abụ ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.”​—Amaokwu nke 44.

 

N’ihi ya, ọ dabara adaba ma anyị kwuo na e nwere “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi” mgbe ọnụnọ Kraịst malitechara n’afọ 1914.

 

Ihe ọzọ bụ na Jizọs kwuru na a ga-enwe ‘ohu a’ n’oge ndị mmadụ ga na-ajụ, sị: “Ònye n’ezie bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche?” Ebe ọ bụ na ndị mmadụ hụrụ ọrụ ebube mmụọ nsọ mere ka ndịozi Jizọs rụọ, o nweghị otú ha ga-esi jụwa onye ohu ahụ bụ n’oge ndịozi Jizọs. (1 Ndị Kọrịnt 14:12, 24, 25) Ọ bụ eziokwu na e ji mmụọ nsọ tee ndịozi Jizọs na Ndị Kraịst ndị ọzọ e nwere n’oge ahụ mmanụ, ha abụghị “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” Jizọs kwuru okwu ya.

 

Ọ dabara adaba ikwu na Jizọs mere “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ka ọ bụrụ “onye na-elekọta ezinụlọ ya” n’oge ọnụnọ ya, ya bụ n’oge “ọgwụgwụ usoro ihe a.”

 

“Ònye n’Ezie Bụ Ohu Ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi, Onye Nwekwara Uche?”

Ọ bụghị otu onye ka Jizọs na-ekwu okwu ya. Ọ bụ mmadụ ole na ole na-arụkọ ọrụ ọnụ bụ “ohu” ahụ. Jizọs kwuru na (1) a ga-enye ohu ahụ ọrụ ilekọta ‘ezinụlọ nna ya ukwu’ na (2) inye ndị ezinụlọ nna ya ukwu nri ime mmụọ “n’oge kwesịrị ekwesị.”

 

Malite n’afọ 1919 gawa, e nwere mmadụ ole na ole e tere mmanụ nọ n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova. Ha na-elekọta ọrụ ikwusa ozi ọma n’ụwa niile, ọ bụkwa ha na-akwadebe nri ime mmụọ a na-enye ndị Chineke ma na-enye ha ya. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, anyị matara na ohu a bụ Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova.

 

Ihe ndị mere eme na-egosi na ọ bụ n’afọ 1919 ka e mere “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” onye na-elekọta ezinụlọ Jizọs. Ọ bụ mmadụ ole na ole e tere mmanụ na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ anyị, ndị ọrụ ha bụ ịkwadebe nri ime mmụọ a na-enye ndị Chineke, bụ ohu ahụ. Ọ bụ mgbe ha bịakọtara ọnụ bụrụ Òtù Na-achị Isi ka ha na-abụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche.”

 

Olee Ndị Bụ “Ezinụlọ” Ahụ?

Jizọs kwuru na a ga na-enye “ezinụlọ ya” nri “n’oge kwesịrị ekwesị.” Ọ bụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-enye ndị niile bụ́ ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst nri ime mmụọ. N’ihi ya, ndị niile na-eso ụzọ Kraịst, ma ndị sọ ná ndị e tere mmanụ ma ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ ahụ socha ‘n’ezinụlọ ya.’​—Jọn 10:16.

 

Mgbe onye na-ekwu okwu a kwuru ihe a, ndị na-ege ntị kụgidere aka ike agwụ. Ọtụtụ ndị bịara nnọkọ a mechara kwuo na obi tọgburu ha atọgbu na Jizọs weere ha ka ndị sọ ‘n’ezinụlọ’ ya.

 

Olee Mgbe Jizọs Mere Ohu Ahụ Onye Na-elekọta “Ihe Niile O Nwere”?

Jizọs kwuru na mgbe ‘nna ukwu ahụ ga-abịarute,’ ọ ga-eme ohu ahụ onye na-elekọta “ihe niile o nwere.” Olee mgbe Nna Ukwu ahụ, bụ́ Jizọs, ga-abịarute?

 

E si n’okwu Grik bụ́ erʹkho·mai sụgharịta okwu ahụ bụ́ “abịarute.” Otú e si sụgharịa okwu Grik dị ka ya na Matiu isi 24 amaokwu 42 na 44 bụ “ga-abịa.” Ọbịbịa Jizọs na-ekwu okwu ya n’amaokwu ndị a, bụ ọbịbịa ọ na-abịa ikpe ndị mmadụ ikpe n’oge oké mkpagbu ahụ.​—Matiu 24:30; 25:31, 32.

 

Ebe ọ dị otú ahụ, ọ ga-abụkwa n’ọdịnihu ka Jizọs ga-eme “ohu ahụ” onye na-elekọta ‘ihe ndị o nwere.’ Ọ ga-eme ya onye na-elekọta ihe ndị o nwere n’oge oké mkpagbu.

 

Olee ‘Ihe Ndị Jizọs Nwere’?

Jizọs sịrị: “E nyewo m ikike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.” (Matiu 28:18) N’ihi ya, ‘ihe ndị Jizọs nwere’ abụghị naanị ihe ndị dị n’ụwa. Alaeze Mesaya so na ihe ndị ahụ.​—Ndị Filipaị 2:9-11.

 

Ihe Jizọs ga-eji akwụ ndị so ‘n’ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi’ ụgwọ bụ ịkpọlite ha n’ọnwụ, ha agaa eluigwe, ya enyekwa ha ikike ịchị ihe niile o nwere ma n’eluigwe, ma n’ụwa. Ọ bụkwa otu ụgwọ ọrụ a ka a ga-akwụ Ndị Kraịst niile kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ.​—Luk 22:28-30; Mkpughe 20:6.

 

A mara ọkwa pụrụ iche n’okwu ikpeazụ n’okwu a ndị so n’Òtù Na-achị Isi kwuru. Mgbe Nwanna Splane gụchara ihe na-agba ume Jizọs kwuru na Matiu 28:20, ọ sịrị na “e nwere ihe ọzọ mere anyị ga-eji nwee obi ike. Ihe ahụ dị n’isiokwu afọ 2013. O si na Jọshụa 1:9: Ebe ahụ sịrị: ‘Nwee obi ike, dịkwa ike. . . . Jehova bụ́ Chineke gị nọnyeere gị.’”

 

Mgbe Nwanna Morris na-ekwu okwu mmechi nnọkọ a, ọ jụrụ, sị: “Oleekwanụ maka nnọkọ nke afọ ọzọ?” “A ga-enwe ya n’abalị ise n’ọnwa Ọktoba afọ 2013. A ga-emekwa ka ndị nọ n’Ụlọ Mgbakọ ụfọdụ dị n’Amerịka na ndị nọ ná mba ndị ọzọ na-asụ Bekee na-ahụ ihe a na-eme ná nnọkọ a.”

Ọ bụ naanị asụsụ Bekee ka a ga-eji kwuo ihe niile a ga-ekwu ná nnọkọ ahụ. O nweghị nke a ga-asụgharị n’asụsụ ọzọ.

 

Ná mmechi nnọkọ a pụrụ iche, ndị niile bịaranụ so bụọ abụ nke 116 n’akwụkwọ abụ anyị bụ́ Bụkuo Jehova Abụ. Isiokwu ya bụ “Ìhè Na-enwusikwu Ike.” Ihe ụfọdụ dị n’abụ ahụ bụ:

 

“Jizọs nyer’anyị ohu ya nwer’uche,

Nke n’eny’anyị nri n’oge ya.

Ìhè nk’eziokwu n’enwusikwu ike taa,

N’eru n’obi, mee k’e che’echiche.”