Gaa n'Isiokwu

Ime Ka Ụlọ Nche Bekee Dị Mfe Nghọta

Ime Ka Ụlọ Nche Bekee Dị Mfe Nghọta

Malite n’Ụlọ Nche Bekee nke Julaị 2011, e bidoro ibipụta Ụlọ Nche Bekee e ji Bekee dị mfe nghọta dee. A sịrị na a ga-eme ya otu afọ ka a mara otú ọ ga-adị. Ugbu a, otu afọ ahụ a gaala, e kpebiekwala na a ga na-ebipụta ya na-aga.

Malite n’ọnwa Jenụwarị afọ 2013, a ga-enwekwa ụdị Ụlọ Nche a n’asụsụ French, Pọchugiiz, na Spanish.

E mere Ụlọ Nche a iji nyere ndị na-eji asụsụ Bekee amụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova aka, ma ya abụrụ na Bekee abụghị asụsụ ha.

Kemgbe e bipụtara nke mbụ ya, e nwetala ọtụtụ akwụkwọ ozi ndị mmadụ ji kelee anyị maka ibipụta ya. Otu n’ime akwụkwọ ozi ndị ahụ bụ nke otu nwaanyị Laịberịa aha ya bụ Rebecca dere. Nwaanyị a dị afọ iri isii na anọ, ọ gaghịkwa akwụkwọ. O dere, sị: “Ana m amụ otú e si agụ ihe. Mgbe ụfọdụ, m gụọ Ụlọ Nche, anaghị m aghọta ya. Ụlọ Nche nke a e mere ka ọ dị mfe nghọta na-atọ m ezigbo ụtọ. Ana m aghọta ihe e dere na ya.”

Ọtụtụ ndị nne na nna na-eji Ụlọ Nche nke a dị mfe nghọta enyere ụmụ ha aka ịkwado Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche bụ otu n’ime ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova na-enwe.

E nwere otu nwaanyị aha ya bụ Rosemary. Ya na ụmụ ụmụ ya ndị nwaanyị atọ bi. Nwaanyị a kwuru, sị: “Ọ na-esiri mụ na ụmụ ụmụ m ndị nwaanyị ike ịmụ Ụlọ Nche. Anyị na-eji akwụkwọ ọkọwa okwu amata ihe ọtụtụ okwu e dere n’Ụlọ Nche pụtara. Ọ na-ewe anyị oge ịmata ihe okwu ndị ahụ pụtara, nke na ọtụtụ mgbe, ụmụ ụmụ m na-echefu isi ihe anyị na-amụ. Anyị na-ejizi oge anyị ugbu a amata ihe amaokwu Baịbụl ndị e dere n’ihe anyị na-amụ kwuru na otú ha si gbasa ihe anyị na-amụ.”