Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

E Belatala Peeji Ole Ụlọ Nche na Teta! Na-adị, ma Ha Adịkwuola n’Ọtụtụ Asụsụ

E Belatala Peeji Ole Ụlọ Nche na Teta! Na-adị, ma Ha Adịkwuola n’Ọtụtụ Asụsụ

Malite na Jenụwarị 2013, Teta! na Ụlọ Nche nke anyị na-enye ọhaneze ga na-adịzi peeji iri na isii kama ịdị peeji iri atọ na abụọ.

Ndị nsụgharị ga-enwezi ike ịsụgharị ha n’ọtụtụ asụsụ n’ihi na e belatala peeji ole ha na-adị. Dị ka ihe atụ, a sụgharịrị Teta! Disemba afọ 2012 n’asụsụ iri asatọ na anọ, sụgharịakwa Ụlọ Nche Disemba afọ 2012 n’asụsụ otu narị na iri itoolu na ise. Ma, a sụgharịrị Teta! Jenụwarị afọ 2013 n’asụsụ iri itoolu na asatọ, sụgharịakwa Ụlọ Nche Jenụwarị afọ 2013 n’asụsụ narị abụọ na anọ.

Ụlọ Nche nke Ndịàmà Jehova na-eji amụ ihe n’ọgbakọ ha ka ga na-adị peeji iri atọ na abụọ.

Ọ Ga-eme Ka A Na-enwekwu Isiokwu Ndị Ga Na-agba n’Ịntanet

N’ihi mbelata a e belatara peeji ole akwụkwọ ndị a na-adị, o nwere ihe abụọ anyị ga-eme n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.jw.org/ig.

  1. Isiokwu ụfọdụ na-agbabu n’Ụlọ Nche na Teta! ga na-­agbazi naanị na jw.org ebe a. Ụfọdụ n’ime ha bụ, “Ihe E Ji Akụziri M Baịbụl,” “Maka Ndị Na-eto Eto,” na akụkọ gbasara ndị gụcharala akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Gilied. Ha na-agbabu n’Ụlọ Nche nke ọhaneze. Isiokwu ndị ọzọ ga na-adịkwa ebe ahụ bụ isiokwu ndị na-agbabu na Teta! Ha bụ: “Ihe Ezinụlọ Ga-atụle,” na “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị.”

  2. Anyị ga na-etinyezi Ụlọ Nche na Teta! na jw.org/ig ma mee ha otú mmadụ ga-enwe ike ịnọ ebe ahụ gụọ ha. Kemgbe ọtụtụ afọ, anyị na-etinye Ụlọ Nche na Teta! na jw.org naanị n’ụdị PDF, ya bụ, nke e nwere ike ịdanlodu adanlodu. Ma ugbu a, anyị ga na-etinyekwa ha n’ụdị HTML, ya bụ, nke mmadụ nwere ike ịnọ n’Ịntanet gụọ. Ọ ga-emezi ka ọ dịrị ndị mmadụ mfe iji kọmputa ha ma ọ bụ ekwentị ha na-agụ ha n’Ịntanet. Anyị ga-emekwa ka ọ dịrị mmadụ niile mfe ịnọ n’Ịntanet na-agụ akwụkwọ anyị ndị ọzọ. Akwụkwọ anyị ndị a dị n’ihe dị ka narị asụsụ anọ.