Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akara Watchtower Bụ Ihe E Ji Mara Bruklin Kemgbe

Akara Watchtower Bụ Ihe E Ji Mara Bruklin Kemgbe

Kemgbe ihe karịrị afọ iri anọ ugbu a, e nwere ihe pụrụ iche a rụrụ n’elu ụlọ isi ụlọ ọrụ anyị dị na Bruklin. Ogo ya dị ihe dị ka amaụkwụ iri na ise. Ihe ahụ na-acha ọbara ọbara. Ọ na-egosi ihe na-akụ kwa ụbọchị, nakwa otú ụbọchị na-ekporu ọkụ ma ọ bụ otú ọ na-ajụru n’oyi. Ọ na-egosi ihe ndị a mgbe ọ bụla. Ndị bi na Niu Yọk Siti ma ya nke ọma. Ọtụtụ n’ime ha na-eji ya ama ihe na-akụ na otú ihu ígwé dị.

Otu nwaanyị aha ya bụ Eboni na-esi n’ụlọ ya, nke dịkwa na Bruklin, ahụ ihe ahụ. O kwuru na obi na-adị ya ụtọ ma ya si na windo ya lepụ anya hụ ya, mata ihe na-akụ na otú ihu ígwé dị tupu ya agawa ọrụ. Ọ sị na ọ na-eme ka ya na-aga ọrụ n’oge, na-emekwa ka ya yiri uwe ya kwesịrị iyi maka oyi ma ọ bụ maka okpomọkụ.

Ihe a na-egosi oge na otú ụbọchị na-ekporu n’ọkụ ma ọ bụ otú ọ na-ajụru n’oyi ọ̀ ga-adịgịde ebe ahụ ruo afọ iri anọ ọzọ? O nwere ike ọ gaghị anọru ya. Ebe ọ bụ na Ndịàmà Jehova na-ebufe isi ụlọ ọrụ ha n’ebe ugwu Niu Yọk, ọ bụ ndị ga-azụrụ ụlọ ahụ ga-ekpebi ma hà ga-ahapụ ya ma ọ̀ bụkwanụ wepụ ya.

Ọ bụ ndị Ndịàmà Jehova zụtara ụlọ ahụ n’aka ha rụnyere ihe ahụ ihe karịrị afọ iri asaa gara aga. Ma, ọ bụ Ndịàmà Jehova rụzigharịrị nke dị ugbu a mgbe ha zụtara ụlọ ahụ n’afọ 1969.

A na-elezi ihe ahụ anya mgbe niile, ka o nwee ike ịna-arụ ọrụ nke ọma. Kemgbe e tinyere ya, ụmụ okorobịa ndị rụrụla ọrụ na ya akala nkụ. Ha na-agakwa arụzi ya n’oge ọ bụla a chọrọ ha.

Otu nwoke na-arụ ọrụ abalị n’isi ụlọ ọrụ anyị kwuru, sị: “N’otu mgbede, onyeisi otu ụlọ ọrụ mgbasa ozi na tiivi gwara anyị na oge akara anyị ahụ na-ekwu abụchaghị ihe oge na-ekwu. Ọ chọrọ ka anyị mezie ya n’ihi na ọ ga-ekwu okwu gbasara ya n’ihe omume tiivi ọ ga-eme n’abalị ahụ. Obere oge ọ gwara anyị ya, otu onye n’ime anyị na-ahụ maka ịrụzi ya agaa mezie ya.”

E nweela ọtụtụ ihe e mezirila n’ihe ahụ ka o nwee ike ịna-arụ ọrụ nke ọma ma na-ekwu ihe oge na-ekwu n’eziokwu. Na mbụ, ihe ahụ na-eji ihe ndị Bekee na-akpọ Fahrenheit egosi otú ụbọchị kporuru n’ọkụ ma ọ bụ otú ọ jụruru n’oyi. Ma, n’ihe dị ka afọ 1985, e mere ya ka o jirikwuo ihe ndị Bekee na-akpọ Celsius na-egosi ya.

N’afọ 2009, a gbanwere bọlb na-enwu n’ime akara ahụ, tinye ya bọlb ndị ka ya enwu. Bọlb ndị a na-anọte aka, o mekwara ka ego a na-emefu kwa afọ iji lekọta ihe ahụ belatatụ. Ugbu a, ọkụ ahụ na-acha ma akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ ma ọbara ọbara.