Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Eme Ememme Ncheta Ụbọchị Ọmụmụ?

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Eme Ememme Ncheta Ụbọchị Ọmụmụ?

Ndịàmà Jehova anaghị eme ememme ncheta ụbọchị ọmụmụ n’ihi na ha ma na Chineke kpọrọ ya asị. Ọ bụ eziokwu na Baịbụl ekwughị hoo haa na icheta ụbọchị ọmụmụ dị njọ, ma o kwuru ihe ndị ga-enyere anyị aka ịma ma Chineke ọ̀ nabatara ihe ndị a na-eme na ya. Ka anyị leba anya na anọ n’ime ihe ndị ahụ na ihe Baịbụl kwuru gbasara ha.

  1. Ọ bụ ndị ọgọ mmụọ bidoro ememme ncheta ụbọchị ọmụmụ. Otu akwụkwọ a na-akpọ Standard Dictionary of Folklore, Mythology, and Legend, nke Funk & Wagnalls bipụtara kwuru na ememme ncheta ụbọchị ọmụmụ malitere n’ihi nkwenkwe bụ́ na o ruo n’oge a mụrụ mmadụ n’afọ, “ndị mmụọ ọjọọ na-abịa ka ha merụọ onye ahụ ahụ́,” ma na “ọ bụrụ na ndị enyi onye ahụ anọrọ ya nso, na-agọkwara ya ọfọ ọma, ọ ga-eme ka ndị mmụọ ọjọọ ahụ ghara ime ya ihe ọ bụla.” Akwụkwọ bụ́ The Lore of Birthdays kwuru na n’oge ochie, ihe e dere banyere ụbọchị a mụrụ mmadụ “dị mkpa maka iji ya achọpụta otú ọdịnihu onye ahụ ga-adị.” Ọ bụ “anwansị ndị na-agụ kpakpando” ka ha ji eme ya. Akwụkwọ ahụ kwukwara na “ndị oge ochie kwetara na kandụl a na-amụnye n’ụbọchị ncheta ọmụmụ mmadụ nwere ikike pụrụ iche ga-eme ka ọfọ ọma a gọọrọ mmadụ ree.”

    Ma, Baịbụl kagburu ime anwansi, ịgba afa, na ime mgbaasị, ma ọ bụ “ihe ndị dị otú ahụ.” (Diuterọnọmi 18:14; Ndị Galeshia 5:19-21) O doro anya na otu ihe mere Chineke ji maa ndị bi na Babịlọn oge ochie ikpe bụ n’ihi na ha na-eji kpakpando akọ ọdịnihu, nke bụ́ ịgba afa. (Aịzaya 47:11-15) Ọrụ Ndịàmà Jehova abụghị ịchọpụta otú omenala na ememme ọ bụla si malite. Ma ọ bụrụ na Akwụkwọ Nsọ ekwuo ihe gosiri na otu omenala ma ọ bụ ememme adịghị mma, anyị anaghị eleghara ihe ahụ o kwuru anya.

  2. Ndị Kraịst oge mbụ emeghị ememme ncheta ụbọchị ọmụmụ. Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia kwuru na Ndị Kraịst oge mbụ “lere ime ememe ụbọchị ọmụmụ mmadụ anya dị ka omenala ndị ọgọ mmụọ.” Ihe Baịbụl kwuru gosiri na Ndị Kraịst niile kwesịrị ịna-eṅomi ndịozi Jizọs na ndị ọzọ Jizọs kụziiri ihe.2 Ndị Tesalonaịka 3:6.

  3. Ihe a gwara Ndị Kraịst ka ha na-echeta bụ ọnwụ Jizọs, ọ bụghị ọmụmụ ya. (Luk 22:17-20) Ihe a ekwesighị ịjụ anyị anya n’ihi na Baịbụl kwuru na ‘ụbọchị ọnwụ mmadụ dị mma karịa ụbọchị a mụrụ ya.’ (Ekliziastis 7:1) Mgbe Jizọs jechara ozi ya n’ụwa, o doro anya na o meere onwe ya ezi aha n’ebe Chineke nọ. Ọ bụ ya mere ụbọchị ọnwụ ya ji dị mkpa karịa ụbọchị a mụrụ ya.Ndị Hibru 1:4.

  4. O nweghị onye na-efe Chineke Baịbụl kwuru na o mere ememme ncheta ụbọchị ọmụmụ. Ọ bụghị na ndị dere Baịbụl chefuru ide ya n’ihi na ha dere gbasara mmadụ abụọ na-anaghị efe Chineke mere ememme ncheta ụbọchị ọmụmụ ha. Ma, Baịbụl akọghị akụkọ ọma banyere ememme ahụ ha mere.Jenesis 40:20-22; Mak 6:21-29.

Ọ̀ na-ewute ụmụ Ndịàmà Jehova na a naghị emere ha ememme ncheta ụbọchị ọmụmụ?

Ndịàmà Jehova na-emere ụmụ ha ihe ezigbo nne na nna ọ bụla na-emere ụmụ ya. Ha na-elekọta ụmụ ha nke ọma, na-enyekwa ha onyinye mgbe ọ bụla n’afọ. Ha na ụmụ ha na-anọrịkwa nwee obi ụtọ. Ha na-eṅomi Chineke, onye na-emere ụmụ ya ihe ọma. (Matiu 7:11) Lee ihe ụfoḍụ ụmụ Ndịàmà Jehova kwuru gosiri na ọ naghị ewute ha na a naghị emere ha ememme ncheta ụbọchị ọmụmụ:

  • “Ọ na-akacha atọ m ụtọ ma mmadụ nye m ihe mgbe m na-atụghị anya ya.”—Tammy. Ọ dị afọ 12.

  • “Ọ bụ eziokwu na mama m na papa m anaghị azụtara m ihe n’ụbọchị ọmụmụ m, ma ha na-azụtara m ihe n’oge ndị ọzọ. Ọ na-aka atọ m ụtọ n’ihi na anaghị m atụ anya ya.”—Gregory. Ọ dị afọ  11.

  • “Ì chere na ọ bụ nkeji iri, keeki ole na ole na egwú na-eme ka oriri tọọ ụtọ? Bịa n’ụlọ anyị ka ị hụ otú oriri na-adị.”—Eric. Ọ dị afọ 6.

GỤKWUO GBASARA YA

Olee Otú Iwu Chineke Si Abara Anyị Uru?

Jizọs kọwara ihe mere o ji dị mma ka Chineke na-eduzi anyị, kwuokwa banyere iwu abụọ kacha mkpa.