Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka Ndịàmà Jehova Kweere?

Gịnị Ka Ndịàmà Jehova Kweere?

Anyị bụ́ Ndịàmà Jehova na-agbalị iso ụzọ Kraịst otú ahụ Jizọs kụziri nakwa otú ahụ ndịozi ya mere. Isiokwu a kọwara ihe ndị bụ́ isi anyị kweere.

  1. Chineke. Anyị na-efe naanị otu ezi Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Ọ bụ ya kere ihe niile. Aha ya bụ Jehova. (Abụ Ọma 83:18; Mkpughe 4:11) Ọ bụ Chineke Ebreham, Mozis, na Jizọs.Ọpụpụ 3:6; 32:11; Jọn 20:17.

  2. Baịbụl. Anyị kwetara na Baịbụl bụ Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ. (Jọn 17:17; 2 Timoti 3:16) Ihe niile anyị kweere si n’akwụkwọ iri isii na isii dị́ na Baịbụl, ma “Agba Ọhụrụ” ma “Agba Ochie.” Otu prọfesọ aha ya bụ Jason D. BeDuhn kwuru nnọọ eziokwu banyere Ndịàmà Jehova mgbe ọ sịrị na ihe niile ha kweere na ihe ha na-eme si na Baịbụl. O kwuru na ha anaghị ebu ụzọ jiri aka ha kpebie ihe Baịbụl kwesịrị ikwu. *

    N’agbanyeghị na anyị kwetara ihe niile Baịbụl kwuru, anyị ghọtara na ụfọdụ ihe ndị dị́ na Baịbụl nwere ihe ha pụtara. Anyị ghọtakwara na ebe ụfọdụ na Baịbụl bụ ihe atụ ma ọ bụ nwee ihe ndị ha nọchiri anya ya.Mkpughe 1:1.

  3. Jizọs. Anyị na-eme ihe ndị Jizọs kụziri na ihe ndị o mere. Anyị na-akwanyere ya ùgwù n’ihi na ọ bụ Onye Nzọpụta anyị nakwa Ọkpara Chineke. (Matiu 20:28; Ọrụ Ndịozi 5:31) N’ihi ya, anyị bụ Ndị Kraịst. (Ọrụ Ndịozi 11:26) Ma, anyị esila na Baịbụl mụta na Jizọs abụghị Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile nakwa na ozizi Atọ n’Ime Otu adịghị na Baịbụl.Jọn 14:28.

  4. Alaeze Chineke. Alaeze a bụ ọchịchị dị́ n’eluigwe, ọ bụghị ihe dị́ n’obi Ndị Kraịst. Ọ ga-ewepụ ọchịchị ụmụ mmadụ, meekwa ka ihe Chineke bu n’obi maka ụwa mezuo. (Daniel 2:44; Matiu 6:9, 10) Ọ ga-emezu ihe ndị a n’oge na-adịghị anya, n’ihi na amụma ndị e buru na Baịbụl na-egosi na anyị bi “n’oge ikpeazụ.”2 Timoti 3:1-5; Matiu 24:3-14.

    Jizọs bụ Eze Alaeze Chineke n’eluigwe. Ọ malitere ịchị n’afọ 1914.Mkpughe 11:15.

  5. Nzọpụta. Ọ bụ àjà mgbapụta Jizọs mere a ga-eji napụta ụmụ mmadụ n’aka mmehie na ọnwụ. (Matiu 20:28; Ọrụ Ndịozi 4:12) Onye ọ bụla chọrọ ka àjà ahụ baara ya uru kwesịrị inwe okwukwe na Jizọs ma gbanwee otú o si ebi ndụ, e meekwa ya baptizim. (Matiu 28:19, 20; Jọn 3:16; Ọrụ Ndịozi 3:19, 20) Otú mmadụ si akpa àgwà ga-egosi na onye ahụ nwere okwukwe siri ike. (Jems 2:24, 26) Ma, anyị agaghị arụtali nzọpụta n’ọrụ. Kama ọ bụ “obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ” ga-eme ka Chineke zọpụta anyị.Ndị Galeshia 2:16, 21.

  6. Eluigwe. Jehova Chineke, Jizọs Kraịst, na ndị mmụọ ozi bi n’eluigwe. * (Abụ Ọma 103:19-21; Ọrụ Ndịozi 7:55) E nwekwara mmadụ ole na ole a ga-akpọlite n’ọnwụ ha agaa eluigwe soro Jizọs chịa n’Alaeze ahụ. Ha ga-adị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ.Daniel 7:27; 2 Timoti 2:12; Mkpughe 5:9, 10; 14:1, 3.

  7. Ụwa. Chineke kere ụwa ka ụmụ mmadụ biri na ya ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 104:5; 115:16; Ekliziastis 1:4) Chineke ga-agọzi ụmụ mmadụ, mee ka ahụ́ sie ha ike, meekwa ka ha dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-abụ paradaịs.Abụ Ọma 37:11, 34.

  8. Ihe ọjọọ na ahụhụ. Ihe ọjọọ na ahụhụ malitere mgbe otu mmụọ ozi Chineke nupụụrụ ya isi. (Jọn 8:44) Mgbe mmụọ ozi ahụ nupụchaara Chineke isi, a kpọwara ya “Ekwensu” na “Setan.” O mere ka Adam na Iv nupụrụ Chineke isi. Isi ahụ nwoke mbụ na nwaanyị mbụ ahụ nupụụrụ Chineke tinyere ụmụ ha niile ná nnukwu nsogbu. (Jenesis 3:1-6; Ndị Rom 5:12) Chineke gbachiri nkịtị ka ihe ọjọọ na ahụhụ dịrị ka o nwee ike ido onye ọ bụla anya na ọchịchị Setan abaghị uru. Ma, ọ ga-eme ka ihe ọjọọ na ahụhụ kwụsị n’oge na-adịghị anya.

  9. Ọnwụ. Ndị nwụrụ anwụ enweghị ebe ọzọ ha gara dịwa ndụ. (Abụ Ọma 146:4; Ekliziastis 9:5, 10) Ha anaghị ata ahụhụ n’ọkụ mmụọ.

    Chineke ga-esi n’ọnwụ kpọlite ọtụtụ ijeri ndị nwụrụ anwụ. (Ọrụ Ndịozi 24:15) Ma a kpọlitechaa ndị mmadụ n’ọnwụ, a ga-ebibi ndị na-agaghị ekwe ịmụta banyere Chineke. A gaghịkwa akpọlite ha ọzọ.Mkpughe 20:14, 15.

  10. Ezinụlọ. Anyị na-erube isi n’otú Chineke si hazie alụmdi na nwunye ná mmalite, nke bụ́ otu nwoke na otu nwaanyị. Ihe nwere ike ime ka di na nwunye gbaa alụkwaghịm bụ naanị ịkwa iko. (Matiu 19:4-9) O doro anyị anya na ndụmọdụ ndị dị́ na Baịbụl na-enyere ezinụlọ aka ịna-enwe obi ụtọ.Ndị Efesọs 5:22–6:1.

  11. Otú anyị si efe Chineke. Anyị anaghị eji obe ma ọ bụ ihe ọ bụla a kpụrụ akpụ efe Chineke. (Diuterọnọmi 4:15-19; 1 Jọn 5:21) Ihe ndị bụ́ isi anyị na-eme iji fee Chineke bụ:

  12. Nzukọ anyị. A haziri anyị n’ọgbakọ n’ọgbakọ. Ọgbakọ nke ọ bụla nwere ndị okenye na-elekọta ya. Ma, ndị okenye ndị a anaghị eme ka ndị isi chọọchị, anaghịkwa akwụ ha ụgwọ. (Matiu 10:8; 23:8) Anyị anaghị ana otu ụzọ n’ụzọ iri, anyị anaghịkwa asị ndị mmadụ tụọ ụtụ n’ọmụmụ ihe anyị. (2 Ndị Kọrịnt 9:7) Ọ bụ onyinye ndị mmadụ na-enye ka e ji akwado ọrụ anyị. Anyị anaghịkwa akpọpụta aha ndị nyere onyinye.

    Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova bụ Ndị Kraịst ole na ole na-elekọta ọrụ Ndịàmà Jehova n’ụwa niile. Ebe ha nọ arụ ọrụ bụ n’isi ụlọ ọrụ anyị.Matiu 24:45.

  13. Otú anyị si dịrị n’otu. Anyị na ụmụnna anyị nọ́ n’ụwa niile kweere otu ihe. (1 Ndị Kọrịnt 1:10) Anyị anaghị ekwe ka obodo ma ọ bụ agbụrụ mee ka anyị kpọọ ibe anyị asị, anyị enweghịkwa ndị isi na ndị nkịtị. (Ọrụ Ndịozi 10:34, 35; Jems 2:4) Ọ bụ eziokwu na anyị dị n’otu, ma ọ pụtaghị na anyị agaghị eji aka anyị kpebie ihe anyị ga-eme. Onyeàmà Jehova ọ bụla na-eji aka ya ekpebi ihe na-agaghị enye akọnuche ya e ji Baịbụl zụọ nsogbu.Ndị Rom 14:1-4; Ndị Hibru 5:14.

  14. Otú anyị si akpa àgwà. Anyị na-agbasi mbọ ike ime ihe otú ga-egosi na anyị hụrụ ibe anyị n’anya. (Jọn 13:34, 35) Anyị na-ezere ihe ọ bụla megidere iwu Chineke, dị ka ikwe ka a mịnye anyị ọbara. (Ọrụ Ndịozi 15:28, 29; Ndị Galeshia 5:19-21) Anyị bụ ndị udo, anyị anaghịkwa eso alụ agha. (Matiu 5:9; Aịzaya 2:4) Anyị na-akwanyere ndị ọchịchị obodo ebe anyị bi ùgwù, na-erubekwa isi n’iwu ha nyere, ọ bụrụhaala na ha asịghị anyị mee ihe Chineke na-achọghị.Matiu 22:21; Ọrụ Ndịozi 5:29.

  15. Otú anyị na ndị ọzọ si emekọ ihe. Jizọs nyere iwu, sị: “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” O kwukwara na Ndị Kraịst “abụghị nke ụwa.” (Matiu 22:39; Jọn 17:16) N’ihi ya, anyị na-agbalị ịna-emere mmadụ niile ihe ọma. Ma, anyị anaghị anwa anwa etinye aka n’ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, e nweghịkwa ihe jikọrọ anyị na okpukpe ndị ọzọ. (Ndị Galeshia 6:10; 2 Ndị Kọrịnt 6:14) Ma, anyị anaghị akatọ ihe ndị ọzọ kpebiri ime n’ụdị ihe ahụ.Ndị Rom 14:12.

Ọ bụrụ na e nwere ihe ndị ọzọ ị ga-achọ ịmata banyere ihe Ndịàmà Jehova kweere, i nwere ike ịgụkwu banyere anyị n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, ma ọ bụ gaa n’alaka ụlọ ọrụ anyị ọ bụla, ma ọ bụ bịa ọmụmụ ihe anyị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ọ bụla dị́ gị nso, ma ọ bụkwanụ gị ajụọ Onyeàmà Jehova ọ bụla bí gị nso.

^ para. 4 Gụọ peeji nke 165 n’akwụkwọ bụ́ Truth in Translation.

^ para. 10 A chụpụla ndị mmụọ ọjọọ n’eluigwe, ma ha bi n’ebe ndị mmadụ na-anaghị ahụ ha anya.Mkpughe 12:7-9.

GỤKWUO GBASARA YA

Ònye Malitere Ọgbakọ Ndịàmà Jehova?

Chọpụta ihe mere ọ bụghị Charles Taze Russell malitere ọgbakọ Ndịàmà Jehova.

Ndịàmà Jehova Hà Nwere Baịbụl nke Ha?

Ọ bụrụ na i jiri Baịbụl dị iche iche na-amụ ihe, ọ ga-abara gị ezigbo uru. O nwere ihe atọ dị mkpa mere Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ kwesịrị iji soro na Baịbụl ndị i ji amụ ihe.

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Eme Ememme Ncheta Ụbọchị Ọmụmụ?

Lee ihe anọ mere Chineke anaghị anabata ememme ụbọchị ọmụmụ.

Ndịàmà Jehova Hà Kweere na Jizọs?

Chọpụta ihe mere o ji dị mkpa ka ezigbo Ndị Kraịst nwee okwukwe na Jizọs.

Olee Ụdị Ndị Anyị Bụ?

Ndịàmà Jehova ole ka ị ma? Gịnị na gịnị ka ị ma banyere anyị?