Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Mere Unu Anaghị Ekwe Ka A Mịnye Unu Ọbara?

Gịnị Mere Unu Anaghị Ekwe Ka A Mịnye Unu Ọbara?

Ihe na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwukarị

Ihe ndị mmadụ na-ekwu: Ndịàmà Jehova anaghị aṅụ ọgwụ, ha anaghịkwa aga ụlọ ọgwụ.

Nke bụ́ eziokwu: Anyị na-achọ ka e si otú kacha mma e si agwọ ọrịa gwọọ anyị na ndị ezinụlọ anyị. Anyị rịawa ọrịa, anyị na-agakwuru ndị dọkịta ma nke a na-akọ n’ịgwọ ọrịa na n’ịwa ahụ́ n’ejighị ọbara. Obi dị anyị ụtọ na e nwekwuola ụzọ ndị ka mma e si agwọ ọrịa. E sizi otú e si agwọ Ndịàmà Jehova ọrịa n’ejighị ọbara agwọ ndị ọzọ. N’ọtụtụ mba, mmadụ nweziri ike ikpebi ka a ghara ịmịnye ya ọbara ka ọ ghara ibute ọrịa si n’ọbara onye ọzọ, ka ọbara ahụ ghara inyewe ya nsogbu n’ahụ́, nakwa ka a ghara imejọ ihe ma a mịnyewe ya ọbara.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu: Ndịàmà Jehova kweere na ọ bụ mmadụ inwe okwukwe ga-eme ka ọrịa ya laa.

Nke bụ́ eziokwu: Anyị ekwetaghị na ọ bụ okwukwe ga-eme ka ọrịa mmadụ laa.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu: Mmadụ ga-emefu ezigbo ego ma ọ bụrụ na o kweghị ka a mịnye ya ọbara.

Nke bụ́ eziokwu: Ịgwọ mmadụ ọrịa n’amịnyeghị ya ọbara anaghị efu nnukwu ego. *

Ihe ndị mmadụ na-ekwu: Ọtụtụ Ndịàmà Jehova na ụmụ ha na-anwụ kwa afọ n’ihi na ha ekweghị ka a mịnye ha ọbara.

Nke bụ́ eziokwu: E nweghị ihe gosiri na ihe a ndị mmadụ na-ekwu bụ eziokwu. Ọtụtụ oge, ndị dọkịta na-awa ndị mmadụ obi, na-awa ha ọkpụkpụ, na-etinyekwa ha akụkụ ahụ́ ndị ọzọ n’amịnyeghị ha ọbara. N’agbanyeghị na ụdị ịwa ahụ́ ndị a siri ike, ha na-awa ha n’ejighị ọbara. * Ndị toro eto na ụmụaka a na-amịnyeghị ọbara na-agbakekwa ka ndị nke a mịnyere ọbara ma ọ bụdị buru ha ụzọ gbakee. * Otu ihe doro anya bụ na e nweghị onye ga-ekwu hoo haa na mmadụ ga-anwụ ma ọ bụrụ na a mịnyeghị ya ọbara ma ọ bụkwanụ na onye a mịnyere ọbara ga-adị ndụ.

Gịnị mere Ndịàmà Jehova anaghị ekwe ka a mịnye ha ọbara?

Ọ bụ n’ihi ihe Baịbụl kwuru, ọ bụghị n’ihi ihe ndị ahụ́ ike kwuru. Ma Agba Ochie ma Agba Ọhụrụ kwuru hoo haa ka anyị zere ọbara. (Jenesis 9:4; Levitikọs 17:10; Diuterọnọmi 12:23; Ọrụ Ndịozi 15:28, 29) Chineke wekwaara ọbara ka ihe na-anọchi anya ndụ mmadụ. (Levitikọs 17:14) N’ihi ya, ihe mere anyị ji ezere ọbara abụghị naanị na anyị chọrọ ime ihe Chineke kwuru, kama, anyị na-akwanyekwara ya ùgwù n’ihi na ọ bụ ya na-enye ndụ.

Ndị mmadụ agbanwewala ihe ha cheburu

N’eziokwu, e nwere ike ịwa mmadụ ahụ́ tara akpụ n’amịnyeghị ya ọbara

O nwere mgbe ndị ọrụ ahụ́ ike chere na mmadụ ikwu ka a gwọọ ya n’ejighị ọbara bụ ikwu ihe a na-anaghị eme eme, nakwa na onye kwuru otú ahụ na-achọ ihe ga-egbu ya. Ma, kemgbe afọ ole na ole ugbu a, ọ bụghịzi otú ahụ ka ndị mmadụ si were ya. Dị ka ihe atụ, n’afọ 2004, otu isiokwu gbara n’otu akwụkwọ ahụ́ ike kwuru na “ọtụtụ ụzọ e wepụtara isi na-agwọ Ndịàmà Jehova ọrịa ga-emecha bụrụ otú a ga na-esi agwọ mmadụ niile n’ọdịnihu.” * N’afọ 2010, isiokwu gbara n’akwụkwọ bụ́ Heart, Lung and Circulation kwuru na ‘ọ bụghị naanị Ndịàmà Jehova ka e kwesịrị “ịna-awa ahụ́ n’ejighị ọbara,” kama na e kwesịkwara isi otú ahụ na-awa mmadụ niile ahụ́.’

Ọtụtụ puku ndị dọkịta nọ n’ụwa niile anaghịzi amịnye ndị ha na-awa ahụ́ ọbara, kama, ha na-awa ha ahụ́ otú ọbara ga-agba ha na-agaghị ebu ibu. Ndị dọkịta nọ ná mba ndị ka na-emepe emepe na-esikwa otú a awa ndị mmadụ ahụ́ kama ịmịnye ha ọbara. Ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova na-ekwukwa ka e si otú ahụ waa ha ahụ́.

^ para. 8 Lee akwụkwọ bụ́ Transfusion and Apheresis Science, Volume 33, No. 3, p. 349.

^ para. 10 Lee akwụkwọ ndị a: The Journal of Thoracic and Cardiovascular Surgery, Volume 134, No. 2, pp. 287-288; Texas Heart Institute Journal, Volume 38, No. 5, p. 563; Basics of Blood Management, p. 2; na Continuing Education in Anaesthesia, Critical Care & Pain, Volume 4, No. 2, p. 39.

^ para. 10 Lee akwụkwọ bụ́ The Journal of Thoracic and Cardiovascular Surgery, Volume 89, No. 6, p. 918; na Heart, Lung and Circulation, Volume 19, p. 658.

^ para. 14 Continuing Education in Anaesthesia, Critical Care & Pain, Volume 4, No. 2, peeji nke 39.

 

 

 

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Ịmịnye Mmadụ Ọbara n’Ahụ́?

Baịbụl kwuru na Chineke nyere anyị iwu ka anyị ‘zere ọbara.’ Olee otú iwu a si gbasa anyị taa?