Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ùnu Na-agbara Ndị Na-abụghịzi Ndị Òtù Unu Ọsọ?

Ùnu Na-agbara Ndị Na-abụghịzi Ndị Òtù Unu Ọsọ?

E nwere ndị bụ́bu Ndịàmà Jehova e mere baptizim, ma ha emechaa kwụsị ikwusa ozi ọma. O nwekwara ndị nke na-akwụsị ịbịa ọmụmụ ihe anyị. Ma, anyị anaghị agbara ndị ahụ ọsọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị na-agbalị inyere ha aka ka ha maliteghachi ife Jehova.

Ọ bụrụ na mmadụ emee mmehie dị ezigbote njọ, anyị anaghị achụpụ ya ozugbo. Ma, ọ bụrụ na e ji imebi iwu Chineke mara Onyeàmà Jehova e mere baptizim, onye ahụ ajụkwa ichegharị, a ga-achụpụ ya n’ọgbakọ anyị. Baịbụl kwuru, sị: “Wepụnụ onye ọjọọ ahụ n’etiti unu.”—1 Ndị Kọrịnt 5:13.

Ọ bụrụkwanụ na a chụpụrụ mmadụ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova, ma nwunye ya na ụmụ ya ka bụ Ndịàmà Jehova, gịnị ka ha ga-eme? Ha agaghịzi na-eso onye ahụ a chụrụ achụ eme ihe ọ bụla gbasara ofufe Jehova. Ma, ha ga na-emeso ya ihe ka onye ezinụlọ ha. Nwoke ahụ na nwunye ya ka ga-abụkwa di na nwunye.

Ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ anyị ka nwere ike ịna-abịa ọmụmụ ihe anyị. Ha nwekwara ike ịgwa ndị okenye ọgbakọ anyị ka ha jiri Baịbụl nyere ha aka. Anyị chọrọ ka ha chegharịa ma ghọọkwa Ndịàmà Jehova. Ọ bụrụ na ha akwụsị ihe ọjọọ ha na-eme ma gosi na ha chọrọ ịna-eme ihe Baịbụl kwuru, a na-anabataghachi ha n’ọgbakọ anyị.