Olee Otú E Si Azụ Ndịàmà Jehova Maka Ozi Ọma Ha Na-ekwusa?
A na-akụziri Ndịàmà Jehova ihe mgbe niile gbasara otú ha ga-esi na-ebi ndụ Ndị Kraịst, nke ikwusa ozi ọma so na ya. Ikwusa ozi ọma bụ ọrụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha na-arụ, ya bụ, ịna-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke na ịna-akụziri ndị mmadụ banyere ya. (Matiu 24:14; 28:19, 20) A na-akụziri anyị ihe ndị a n’ọmụmụ ihe anyị na-aga kwa izu, ná mgbakọ ukwu anyị na-enwe kwa afọ, nakwa ná mgbakọ sekit ndị anyị na-aga. A na-azụkwa Ndịàmà Jehova ndị e nyere ọrụ ụfọdụ ná nzukọ anyị n’ụlọ akwụkwọ ndị e ji akụzikwuru ha ihe dị na Baịbụl.
Ihe ndị e kwuru n’isiokwu a
Olee ihe a na-akụziri Ndịàmà Jehova?
Ọmụmụ ihe ọgbakọ. Kwa izu, anyị na-aga ọmụmụ ihe abụọ n’ebe anyị na-anọ efe Chineke. Anyị na-akpọ ebe ahụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Otu ọmụmụ ihe ahụ na-abụkarị n’etiti izu; nke ọzọ na-abụ ná ngwụcha izu. Onye ọ bụla nwere ike ịbịa ha, a naghịkwa ana onye ọ bụla ego.
Ọmụmụ ihe etiti izu. A na-akụziri anyị otú e si agụ ihe, otú e si akparịta ụka, otú e si ekwu okwu n’ihu ọha, otú e si ezi ozi ọma, nakwa otú e si akụzi ihe. Iji kụziere anyị ihe ndị a, a na-ekwu okwu dị iche iche, mee ihe omume onye ọ bụla nwere ike itinye ọnụ, mee ihe ngosi, gosikwa vidio. Ihe ndị a a na-akụziri anyị na-enyere anyị aka ịna-ekwusara ndị ọzọ ozi ọma nke ọma ma na-akụziri ndị nwere mmasị Baịbụl nke ọma. Ndị niile na-abịa ọmụmụ ihe ndị a na-erite uru n’ihe a na-akụzi. Ma karịchaa, ọmụmụ ihe anyị na-eme ka okwukwe anyị nwere na Chineke sikwuo ike, na-emekwa ka anyị na-ahụkwu Chineke na ndị anyị na ha na-efekọ ya ọnụ n’anya.
Ọmụmụ ihe ngwụcha izu. Ihe mbụ a na-eme n’ọmụmụ ihe a bụ ikwu okwu si na Baịbụl, nke ndị a kacha ebu n’obi ekwu ya bụ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova. Ihe nke abụọ a na-eme bụ ihe omume ajụjụ na azịza nke na-esi n’isiokwu dị n’Ụlọ Nche a a na-amụ amụ. Ihe isiokwu ndị a na-eleba anya ma na-akọwa bụ ihe si na Baịbụl nakwa ihe ndị Baịbụl kwuru na-enyere anyị aka ma n’ikwusa ozi ọma ma ná ndụ anyị.
Mgbakọ sekit na mgbakọ ukwu. Kwa afọ, anyị na-aga mgbakọ atọ dị iche iche, ndị sikwa n’ọtụtụ ọgbakọ na-abịa ha. Mgbakọ ndị a na-atọ ezigbo ụtọ, isiokwu ha na-esikwa na Baịbụl. A na-ekwu okwu dị iche iche, mee ihe ngosi, gbaa ndị mmadụ ajụjụ ọnụ, gosikwa vidio dị iche iche. Ọ bụ otú ọ na-adị n’ọmụmụ ihe anyị ka ọ na-adịkwa ná mgbakọ ndị a, ha na-eme ka anyị mụtakwuo ihe na Baịbụl, na-enyekwara anyị aka ịna-ezikwu ozi ọma nke ọma. Onye ọ bụla nwekwara ike ịbịa, a naghịkwa ana ego.
Ụlọ akwụkwọ ndị e ji akụzikwuru Ndịàmà Jehova Baịbụl
A na-akpọ ụfọdụ Ndịàmà Jehova ka ha bịa ụlọ akwụkwọ dị iche iche iji kụzikwuoro ha ihe. Olee ụlọ akwụkwọ ndị dị ihe a? Gịnị mere e ji hazie ha, oleekwa ụbọchị ma ọ bụ ọnwa ole ha na-ewe? Olee ndị na-aga ụlọ akwụkwọ ndị a?
Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ
Ihe mere e ji hazie ya: Ọ bụ iji zụọ ndị na-ekwusa ozi ọma oge niile, ndị a na-akpọ ndị ọsụ ụzọ, b ka ha na-ekwusakwu ozi ọma ma na-akụzikwu ihe nke ọma. N’ụlọ akwụkwọ ahụ, ụmụ akwụwọ na ibe ha na-akparịta ụka, mee ihe ngosi, meekwa ihe omume ndị ọzọ.
Oge ọ na-ewe: Ụbọchị isii.
Ndị na-aga ya: A na-akpọ ndị ọsụ ụzọ jirila otu afọ jee ozi ka ha bịa ụlọ akwụkwọ a. Ndị ọzọ na-aga ya bụ ndị bụ ọsụ ụzọ oge niile kemgbe ọtụtụ afọ ma ha agabeghị ụlọ akwụkwọ a ruo afọ ise.
Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze
Ihe mere e ji hazie ya: Ọ bụ iji kụzikwuoro ụfọdụ ndị na-ekwusa ozi ọma oge niile ihe. Ndị na-aga ụlọ akwụkwọ a na-amụtakwu ikwusa ozi ọma na izi ihe nke ọma, na-amụkwu gbasara isiokwu dị iche iche si na Baịbụl. A na-eziga ọtụtụ ndị gụrụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ a n’ebe ndị a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma.
Oge ọ na-ewe: Ọnwa abụọ.
Ndị na-aga ya: E nwere ụfọdụ ihe a chọrọ n’aka ndị chọrọ ịga ụlọ akwụkwọ a. Ndị ọsụ ụzọ nwere ike itinye akwụkwọ na ha chọrọ ịga ya ma ọ bụrụ na ha ruru eru, ya abụrụkwa na ha ga-agali ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa.
Ụlọ Akwụkwọ Ndị Okenye Ọgbakọ
Ihe mere e ji hazie ya: Ọ bụ iji nyere ndị okenye c aka ịrụ ọrụ ha na-arụ n’ọgbakọ nke ọma, dị ka izi ihe na ilekọta ụmụnna ha. Ụlọ akwụkwọ a na-emekwa ka ha hụkwuo Chineke na ụmụnna ha n’anya.—1 Pita 5:2, 3.
Oge ọ na-ewe: Ụbọchị ise.
Ndị na-aga ya: Ndị na-aga ya bụ ndị okenye a họpụtara ọhụrụ nakwa ndị nke bụ́ okenye kemgbe ma ha agabeghị ụlọ akwụkwọ a ruo afọ ise.
Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Nlekọta Sekit na Nwunye Ha
Ihe mere e ji hazie ya: Ọ bụ iji zụọ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, bụ́ ndị a na-akpọ ndị nlekọta sekit, d ka ha na-arụkwu ọrụ ha nke ọma. (1 Timoti 5:17) Ihe ndị a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ a na-enyekwara Ndị Kraịst ndị a bụ́ ndị okenye na ndị nwunye ha aka ịghọtakwu ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ.
Oge ọ na-ewe: Otu ọnwa.
Ndị na-aga ya: A na-akpọ ndị nlekọta sekit a họpụtara ọhụrụ na ndị nwunye ha ka ha bịa ụlọ akwụkwọ a otu afọ ha malitechara ọrụ ha. Ha gachaa nke mbụ ahụ, a ga-akpọzi ha ọzọ ma ihe dị ka afọ ise gafee.
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze
Ihe mere e ji hazie ya: Ọ bụ iji nyere ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi e aka ịna-arụ ọrụ ha nke ọma n’ọgbakọ n’ihi otú ihe si dịrị n’ọgbakọ dị iche iche, ihe ndị na-eme na ha, nakwa mkpa ndị e nwere na ha. (2 Timoti 3:1) A na-enwe ụlọ akwụkwọ a afọ abụọ ma ọ bụ atọ ọ bụla.
Oge ọ na-ewe: Ọ na-adịtụ iche iche, ma ọ na-abụkarị otu ụbọchị.
Ndị na-aga ya: Ndị nlekọta sekit, ndị okenye, na ndị ohu na-eje ozi.
Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-eje Ozi na Betel
Ihe mere e ji hazie ya: Ọ bụ iji nyere ndị na-arụ ọrụ na Betel f aka ịrụ ọrụ ha nke ọma nakwa ime ka ha hụkwuo Chineke na ndị ọzọ n’anya.
Oge ọ na-ewe: Ụbọchị ise na ọkara.
Ndị na-aga ya: Ndị malitere ije ozi ọhụrụ na Betel. E nwekwara ike ịkpọ ndị na-eje ozi na Betel kemgbe ọtụtụ afọ, bụ́ ndị na-agabeghị ụlọ akwụkwọ a ruo afọ ise, ka ha bịa ụlọ akwụkwọ a.
Ụlọ Akwụkwọ Gilied
Ihe mere e ji hazie ya: Ọ bụ iji nyere ndị na-aga ya aka ka ha jirikwuo Okwu Chineke bụ́ Baịbụl kpọrọ ihe ma ghọtakwuo ya, nakwa iji nyere ha aka ime ihe ha mụtara. (1 Ndị Tesalonaịka 2:13) Ndị Kraịst ndị a, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị, ndị gara ụlọ akwụkwọ Gilied, na-abakwuru nzukọ Jehova uru, na-enyekwa aka n’ọrụ ịkụzi Baịbụl anyị na-arụ n’ụwa niile. E nwere ike iziga ndị gụchara akwukwọ n’ụlọ akwụkwọ a n’obodo ha si bịa ma ọ bụ n’obodo ọzọ ka ha gaa rụwa n’alaka ụlọ ọrụ ma ọ bụ n’ebe ọzọ.
Oge ọ na-ewe: Ọnwa ise.
Ndị na-aga ya: Alaka ụlọ ọrụ dị iche iche na-ahọrọ ụfọdụ ndị ozi oge niile ka ha tinye akwụkwọ ịga ya. Ụlọ akwụkwọ a dị n’Ogige Ụlọ Akwụkwọ Watchtower dị na Patasin, na Niu Yọk dị n’Amerịka.
Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Kọmitii Alaka na Nwunye Ha
Ihe mere e ji hazie ya: Ọ bụ iji zụọ ndị so na Kọmitii Alaka g n’otú ha ga-esi na-elekọta ọrụ a na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ ha nọ na ya nakwa ihe ndị ọzọ Ndịàmà Jehova na-eme ná mba ha na-elekọta ma ọ bụ mba ndị alaka ụlọ ha nọ na ya na-elekọta.
Oge ọ na-ewe: Ọnwa abụọ.
Ndị na-aga ya: Ọ bụ Isi Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova na-akpọ ndị so na Kọmitii Alaka ha họọrọ na ndị nwunye ha ka ha bịa ụlọ akwụkwọ, bụ́ nke a na-enwe n’Ogige Ụlọ Akwụkwọ Watchtower dị na Patasin dị na Niu Yọk.
Olee ebe e si enweta ihe a na-akụziri Ndịàmà Jehova?
Akwụkwọ bụ́ isi a na-eji akụziri Ndịàmà Jehova ihe bụ Baịbụl. Anyị kweere na Baịbụl si n’ike mmụọ nsọ Chineke nakwa na ihe dị na ya bụ ntụziaka ka mma maka ihe ọ bụla Onye Kraịst na-eme ná ndụ.—2 Timoti 3:16, 17.
Ndịàmà Jehova hà na-akwụ ụgwọ maka ihe ndị a na-akụziri ha?
Mba. Ha anaghị akwụ ụgwọ. Ọ bụ onyinye si ndị mmadụ n’obi ka e ji akwado ọrụ niile Ndịàmà Jehova na-arụ.—2 Ndị Kọrịnt 9:7.
a Baịbụl na ihe dị iche iche e ji amụ Baịbụl, ma vidio, dị n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet bụ́ jw.org.
b Ọsụ ụzọ bụ Onyeàmà Jehova e mere baptizim, onye na-eji awa ole a kapịrị ọnụ ekwusara ndị ọzọ ozi ọma si na Baịbụl kwa ọnwa. O nwere ike ịbụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, bụrụkwa onye e ji ama atụ.
c Ndị okenye bụ ụmụ nwoke bụ́ Ndị Kraịst, ndị na-eji Akwụkwọ Nsọ akụzi ihe. Ha na-enyere ndị Jehova aka, na-agbakwa ha ume, si otú ahụ na-elekọta ha. Anaghị akwụ ha ụgwọ maka ọru a ha na-arụ.
d Onye nlekọta sekit bụ onye ozi oge niile na-aga kwa izu na-eleta ọgbakọ dị iche iche dị na sekit ọ na-elekọta. Ọ na-ekwu okwu ndị si na Baịbụl, sorokwa ụmụnna nọ n’ọgbakọ ọ gara ileta gaa ozi ọma iji gbaa ha ume.
e Ndị ohu na-eje ozi na-arụ ọrụ dị iche iche iji nyere ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ha aka. Ihe a ha na-eme na-eme ka ndị okenye nwekwuo oge ha ga-eji na-ezi ihe ma na-elekọta ụmụnna ha.
f Ọ bụ alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ka a na-akpọ Betel. Ndị ozi oge niile, ndị na-arụ ebe ahụ na-akwado ọrụ dị iche iche Ndịàmà Jehova na-arụ ná mba alaka ụlọ ọrụ ahụ na-elekọta.
g Ọ bụ ụmụ nwoke atọ ma ọ bụ karịa, ndị ụkwụ siri ike n’ọgbakọ, na-anọ na Kọmitii Alaka.