Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ùnu Kweere na E Ji Ụbọchị Isii Nkịtị Kee Ihe Niile, Nakwa na E Kere Ha Puku Afọ Ole na Ole Gara Aga?

Ùnu Kweere na E Ji Ụbọchị Isii Nkịtị Kee Ihe Niile, Nakwa na E Kere Ha Puku Afọ Ole na Ole Gara Aga?

Mba. Ndịàmà Jehova kweere na Chineke kere ihe niile. Ma, anyị ekweghị na o ji abalị isii nkịtị kee ihe niile, nakwa na o kere ha puku afọ ole na ole gara aga. Gịnị mere anyị ekweghị? Ọ bụ n’ihi na ọ dabaghị n’ihe Baịbụl kwuru. Lee ihe abụọ gosiri na ọ dabaghị:

  1. Otú ụbọchị ndị e ji kee ihe haruru n’ogologo. Ụfọdụ n’ime ndị kweere na Chineke ji ụbọchị isii kee ihe na-ekwu na ụbọchị isii nke ọ bụla bụ awa iri abụọ na anọ. Ma, na Baịbụl, “ụbọchị” nwere ike ịpụta ogologo oge karịrị awa iri abụọ na anọ.Jenesis 2:4; Abụ Ọma 90:4.

  2. Afọ ole ụwa nọrọla. Ụfọdụ n’ime ndị a kweere na Chineke ji ụbọchị isii kee ihe na-ekwukwa na ọ bụ naanị puku afọ ole na ole ka ụwa a nọrọla. Ma, ihe e dere na Baịbụl gosiri na ụwa na eluigwe adịlarị tupu ụbọchị nke mbụ a malitere ike ihe. (Jenesis 1:1) N’ihi ya, Ndịàmà Jehova anaghị agbagha nchọpụta ọ bụla ndị sayensị mere nke gosiri na ụwa a anọọla ọtụtụ ijeri afọ.

Ndịàmà Jehova kweere na Chineke kere ihe niile, ma ọ pụtaghị na anyị ekweghị na sayensị. Anyị kweere na ihe ọ bụla ndị sayensị chọpụtara bụ́ eziokwu na-adaba n’ihe Baịbụl kwuru.

 

 

 

GỤKWUO GBASARA YA

Olee Otú Baịbụl Kwuru Chineke Si Kee Ihe?

Baịbụl kwuru na Chineke ji ụbọchị isii kee ihe. Ụbọchị ndị ahụ hà bụ ụbọchị isii nkịtị?