Gaa n'Isiokwu

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Ji Gbanwee Ihe Ụfọdụ Ha Kweere?

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Ji Gbanwee Ihe Ụfọdụ Ha Kweere?

 Kemgbe ụwa, ihe ọ bụla anyị kweere na-esi na Baịbụl. N’ihi ya, anyị na-agbanwe ihe anyị kweere ma anyị ghọtakwuo ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru nke ọma. a

 Ihe a dabara n’ihe e kwuru na Baịbụl n’Ilu 4:18. Ebe ahụ sịrị: “Ụzọ ndị ezi omume yiri ìhè na-enwu mgbe chi bọrọ, nke na-enwusikwu ike ruo mgbe chi bọchara.” Otú ahụ ìhè anyanwụ si eme ka a na-ahụkwu ihe nke ọma mgbe anyanwụ na-awa, ka Chineke si eme ka a na-aghọtakwu eziokwu ndị dị n’Okwu ya nke ọma mgbe oge ya ruru. (1 Pita 1:10-12) Dị ka e buru n’amụma na Baịbụl, Jehova na-eme ka a na-aghọtakwu eziokwu ndị a n’ike n’ike “n’oge ọgwụgwụ.”—Daniel 12:4.

 Ihe ndị a a na-agbanwe n’ihe anyị kweere ekwesịghị iju anyị anya ma ọ bụ nyewe anyị nsogbu n’obi. Ndị fere Chineke n’oge ochie nwekwara oge ndị ha na-aghọtachaghị ihe ụfọdụ nke ọma, ya adịkwa mkpa ka ha gbanwetụ otú ha si ele ihe anya.

 Chineke mechara nyere ndị a niile aka ịghọta ihe ndị ha ghọtahiere. Ekpere anyị bụkwa ka Chineke nọgide na-emere anyị otu ihe ahụ.—Jems 1:5.

a Anyị anaghị agba mbọ ka anyị zochie ihe ndị anyị kweere anyị mechara gbanwee. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị na-ede ha niile ede, na-emekwa ka ọhaneze hụ ha. Dị ka ihe atụ, i denye “Ime Ka Ihe Anyị Kweere Dokwuo Anya” n’ebe a na-achọ ihe n’Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET, ị ga-ahụ ha.