Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Bụ Ọmụmụ Baịbụl?

Gịnị Bụ Ọmụmụ Baịbụl?

Ndịàmà Jehova na-agwa ndị mmadụ ka ha na ha mụwa Baịbụl. Ha na ha mụwa Baịbụl, ha na-aza ha ajụjụ ndị dị ka:

  • Ònye bụ Chineke?

  • Ihe gbasara m ọ̀ na-emetụ Chineke n’obi?

  • Gịnị ka m ga-eme ka mụ na di m ma ọ bụ nwunye m na-ebi n’udo?

  • Olee ihe ga-eme ka obi na-atọ m ụtọ?

N’okpuru ebe a, a zara ụfọdụ ajụjụ a na-ajụkarị gbasara otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl.

Olee otú e si eme ya? Ọ na-abụ anyị welite otu isiokwu, anyị agụọ amaokwu Baịbụl ndị kwuru gbasara ya. Anyị na-abịazi leruo amaokwu ndị ahụ anya ka anyị mata ihe Baịbụl n’ozuzu ya kwuru n’okwu ahụ. Otú a anyị si eme ya na-eme ka ndị mmadụ hụ na ọ bụghị uche anyị ka anyị na-akọwa kama na ọ bụ ihe Baịbụl n’onwe ya kwuru.

E nwere akwụkwọ anyị na ndị mmadụ na-eji amụ Baịbụl. A na-akpọ ya Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Akwụkwọ a kọwara ihe Baịbụl kụziri gbasara Chineke, Jizọs, ihe Chineke ga-emere ụmụ mmadụ n’ọdịnihu nakwa ihe ndị ọzọ.

Ego ole ka mmadụ ga-akwụ maka ọmụmụ ihe a? Anyị anaghị ana mmadụ ego maka ya. O nweghịkwa ego ole a ga-agwa mmadụ kwụọ ka e nye ya akwụkwọ anyị na ya ga-eji na-amụ ihe.

Awa ole ka anyị na ndị mmadụ na-eji amụ ihe? Ụfọdụ ndị na-ewepụta otu awa n’izu ọ bụla ka anyị na ha mụọ Baịbụl. Ma, ọ bụghị iwu na ọ ga-abụrịrị otu awa. Nkeji ole ọ bụla ị gwara anyị ka anyị na gị were mụọ ihe, anyị ga-anabata ya.

M kweta ka a mụwara m Baịbụl, gịnị ga-eme? Ọ bụrụ na ị gwa anyị ka anyị na gị mụwa Baịbụl, anyị ga-agwa Onyeàmà Jehova ka ọ bịa na nke gị mgbe ọ bụla ị chọrọ. Ọ ga-eji nkeji ole na ole gosi gị otú ọmụmụ ihe ahụ na-adị. Ị chọzie ka ọ na-abịa na nke gị, gị agwa ya.

Ọ bụrụ na m kweta ka a mụwara m Baịbụl, ọ̀ pụtara na m ga-abụzi Onyeàmà Jehova? Mba. Ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl na-atọ Ndịàmà Jehova ụtọ. Ma anyị anaghị agwa mmadụ na ọ ga-abụrịrị Onyeàmà Jehova. Kama, anyị na-emeda obi kọwaara onye ahụ ihe Baịbụl kwuru, hapụzie ya ka o jiri aka ya kpebie ma ọ̀ ga-ekweta ihe anyị kụziiri ya ma ọ̀ bụ na ọ gaghị ekweta.—1 Pita 3:15.