Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Olee Otú Unu Si Enweta Ego Unu Ji Arụ Ọrụ Unu?

Olee Otú Unu Si Enweta Ego Unu Ji Arụ Ọrụ Unu?

Ebe kachanụ anyị si enweta ego anyị ji arụ ọrụ anyị bụ n’onyinye ụmụnna anyị na-enye. Anyị anaghị ebugharị efere onyinye n’ọmụmụ ihe anyị, o nweghịkwa onye anyị na-asị weta otu ụzọ n’ụzọ iri. (Matiu 10:7, 8) Kama, anyị na-edowe igbe onyinye n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị na n’Ụlọ Mgbakọ anyị otú ọ ga-abụ onye chọọ inye onyinye, ya etinye onyinye ya ebe ahụ. A naghịkwa akpọ aha onye nyere nke o nyere.

Otu ihe mere ego anyị ji ezuru anyị bụ na anyị enweghị ndị pastọ anyị na-akwụ ụgwọ. Ihe ọzọ bụ na o nweghị Onyeàmà Jehova a na-akwụ ụgwọ maka ikwusa ozi ọma, ebe ndị anyị na-anọ amụ ihe anaghịkwa ebu oké ibu. A na-eji onyinye ọgbakọ anyị dị iche iche ziteere alaka ụlọ ọrụ anyị ewu ebe ndị anyị na-anọ efe Jehova, na-eji ya enyere ndị ọdachi dakwasịrị aka, na-ejikwa ya elekọta ndị anyị na-eziga ebe dị iche iche ka ha gaa kwusawa ozi ọma. A na-ejikwa ego ndị ahụ ebipụta Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl.

Onye ọ bụla na-eji aka ekpebi ma ọ̀ chọrọ inye onyinye maka ihe ndị a na-emefu n’ọgbakọ ọ nọ ka ọ̀ bụ maka ọrụ anyị na-arụ n’ụwa niile ka ọ̀ bụkwanụ maka ha abụọ. N’ọnwa ọ bụla, a na-akọrọ ndị nọ n’ọgbakọ ọ bụla otú ego ndị e nwetara n’ọgbakọ ha si na-aga.

GỤKWUO GBASARA YA

Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Otú Jehova Si Emesapụ Aka

Baịbụl mere ka anyị mata ihe anyị kwesịrị ibu n’obi mgbe anyị ji oge anyị, ike anyị, na akụ̀ anyị na-ejere Chineke ozi nakwa ihe anyị na-ekwesịghị ibu n’obi na-eme ya.

Vidio: Otú Ndịàmà Jehova Si Enweta Ego Ha Ji Arụ Ọrụ Ha

Chọpụta otú ndị mmadụ nọ ebe dị iche iche n’ụwa si enye onyinye ma na-akwado ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ.