Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ùnu Nwere Ndị Pastọ?

Ùnu Nwere Ndị Pastọ?

Ndịàmà Jehova na-eme otú Ndị Kraịst e nwere n’oge ndịozi Jizọs mere. Anyị enweghị ndị pastọ. Onye ọ bụla e mere baptizim n’ọgbakọ anyị bụ onye Chineke họpụtara ijere ya ozi, anyị niile na-ekwusakwa ozi ọma. Anyị nwere ọgbakọ dị iche iche, ihe dị ka otu narị mmadụ nọkwa n’ọgbakọ nke ọ bụla. Ndị ikom ma nke a na-akọ na-ahazi otú ihe si aga n’ọgbakọ ọ bụla. A na-akpọ ha “ndị okenye.” (Taịtọs 1:5) A naghị akwụ ha ụgwọ maka ọrụ ha na-arụ.

 

GỤKWUO GBASARA YA

Olee Otú Ndịàmà Jehova Si Enweta Ego Ha Ji Arụ Ọrụ Ha?

Chọpụta otú ọrụ ikwusa ozi ọma Ndịàmà Jehova si na-aga nke ọma n’ụwa niile n’agbanyeghị na ha anaghị ana ụtụ ma ọ bụ otu ụzọ n’ụzọ iri.

Olee Ọrụ Ndị Okenye Na-arụ n’Ọgbakọ Anyị?

Ndị okenye na Chineke dị n’ezigbo mma. Ha jikwa obi ha dum elekọta atụrụ Chineke. Olee otú ha si enyere anyị aka?