Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

Okpukpe Unu Ọ̀ Bụ Okpukpe Ndị Amerịka?

Okpukpe Unu Ọ̀ Bụ Okpukpe Ndị Amerịka?

Isi ụlọ ọrụ anyị dị n’Amerịka. Ma, ọ pụtaghị na okpukpe anyị bụ okpukpe ndị Amerịka. Lee ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ:

  • O nweghị chọọchị okpukpe Ndịàmà Jehova si na ya pụta. Kama Ndịàmà Jehova bidoghachiri otú Ndị Kraịst si efe Chineke n’oge ndịozi Jizọs.

  • Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma ná mba karịrị narị abụọ na iri atọ. N’agbanyeghị mba anyị bi, mkpa anyị bụ irubere Jehova Chineke na Jizọs Kraịst isi, ọ bụghị ọchịchị mba Amerịka ma ọ bụkwanụ ọchịchị mba ọ bụla ọzọ.—Jọn 15:19; 17:15, 16.

  • Ihe niile anyị na-akụzi si na Baịbụl, ọ bụghị ihe nwoke onye Amerịka dere.1 Ndị Tesalonaịka 2:13.

  • O nweghị mmadụ ọ bụla bụ onye isi anyị. Ọ bụ Jizọs Kraịst bụ onye isi anyị.Matiu 23:8-10.

GỤKWUO GBASARA YA

ỤLỌ NCHE

Betel Brooklyn Agbaala Otu Narị Afọ

Mata ihe mere Ndịàmà Jehova ji bufee isi ụlọ ọrụ ha na New York, nakwa ihe mere ha ji akpọ ya Betel.