Gaa n'Isiokwu

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Gayana

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Gayana

“E nweghị okwu a ga-eji kọwaa obi ụtọ mmadụ na-enwe ma o jee ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma!” Ọ bụ ihe a ka Joshua kwuru. O bi na Amerịka, ma o nwere mgbe ọ gara nye aka kwusaa ozi ọma na Gayana. E nwere ọtụtụ ndị chọrọ ịnụ ozi ọma ná mba a dị na Kọntinent Saụt Amerịka. Ọtụtụ Ndịàmà Jehova ndị ọzọ ndị garala nye aka kwusaa ozi ọma ná mba ahụ nwekwara ụdị obi ụtọ a Joshua nwere. * Olee ihe ndị bara uru anyị ga-amụta n’aka ndị a gara ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma? Oleekwa otú ihe ndị ị mụtara nwere ike isi nyere gị aka ịkwadebe ịga ozi ọma ná mba ọzọ ma ọ bụrụ na ọ na-agụ gị agụụ ime otú ahụ?

Gịnị Mere Ha Ji Gawa Ebe Ahụ?

Linel

Tupu otu nwanna nwoke aha ya bụ Linel akwaga Gayana, ọ na-eso ụmụnna ndị ọzọ aga ozi ọma n’ebe a na-adịghị ezikarị ozi ọma ná mba ya bụ́ Amerịka. Ọ sịrị: “Anyị dị iri mmadụ abụọ e zigara otu ime obodo na-emepeghị emepe dị na West Vejinia. Ozi ọma ahụ m so gaa kwusaa ebe ahụ na mkpakọrịta mụ na ụmụnna ndị ọzọ nwere n’izu abụọ anyị nọrọ ebe ahụ gbanwere ndụ m! O mere ka m kpebisikwuo ike iji ike m niile jeere Jehova ozi.”

Erica na Garth

Otu di na nwunye aha ha bụ Garth na Erica chesiwere echiche ike ịga kwusaa ozi ọma ná mba ọzọ, ha kpebikwara ịga Gayana. Gịnị mere ha ji họrọ ebe ahụ? Erica sịrị: “Mụ na di m ma otu di na nwunye kwagara ebe ahụ. Otú ha si akọ akụkọ otú ozi ha si aga nke ọma na otú ozi ha si atọ ha ụtọ mere ka ọ gụwakwuo anyịnwa agụụ ịkwaga ebe ahụ.” Erica na Garth jere ozi tọrọ ha ụtọ n’ebe ahụ ruo afọ atọ. Ha kwuru na ha anaghị echefu ozi ha jere ebe ahụ echefu. Garth sịrị: “Anyị ji nke ahụ hụ otú ịga ozi oge niile ná mba ọzọ si atọ, anyị hụkwara na ọ dị ụtọ.” Ya na nwunye ya mechara gaa Ụlọ Akwụkwọ Gilied, ugbu a kwa ha na-eje ozi na Bolivia.

Ndị na-eje ozi ná mba ọzọ na-enwetakarị ọtụtụ ndị ha na ha na-enwe mkparịta ụka dị mma na Baịbụl

Olee Otú Ha Si Kwadebe?

Baịbụl gbara anyị ume ka ihe anyị nwere na-eju anyị afọ. (Ndị Hibru 13:5) A gbakwara anyị ume ka anyị buru ụzọ gbakọọ ihe otu nnukwu ihe anyị chọrọ ime ga-efu anyị tupu anyị emewe ya. (Luk 14:​26-33) O doro anya na ikpebi ịkwaga mba ọzọ so na ya! Garth sịrị: “Tupu mụ na Erica akwaga Gayana, anyị kwụsịrị ime ihe ndị na-ewekọrọ oge anyị. Nke a mere ka anyị ree ihe anyị ji akpata ego, ree ụlọ anyị, na ụmụ ihe ndị na-adịghị mkpa anyị kwakọbara n’ụlọ anyị. Ime ihe ndị a were anyị afọ ole na ole. Ma otu ihe anyị mere ka anyị ghara ichefu na anyị chọrọ ịkwaga Gayana bụ ịna-aga ebe ahụ kwa afọ ka anyị nwee ike ịna-echeta ihe ahụ anyị kpebirila ime.”

Sinead na Paul

Ihe ọzọ i kwesịrị ichebara echiche bụ ihe ị ga-eji na-akpata ego. Ná mba ụfọdụ, ndị gara inye aka n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma na-enwe ike inweta ọrụ n’ebe ahụ ma ọ bụrụ na iwu obodo ahụ kwadoro ya. Ụfọdụ na-eji kọmputa nọrọ ná mba ahụ na-arụ ọrụ ha na-arụbu ná mba ha. Ndị ọzọ na-ekpebi ịna-aga obodo ha, nọrọ ebe ahụ rụtụ ọrụ tupu ha alaghachikwa n’ebe ha nọ. Otu di na nwunye bụ́ Paul na Sinead na-alaghachi obodo ha bụ́ Ayaland otu ugboro n’afọ rụọ ọrụ. Otú a ka ha si mee ma nwee ike ịga ozi na Gayana ruo afọ iri na asatọ. Ha medịrị ya ruo afọ asaa ka a mụchara nwa ha nwaanyị.

Christopher na Lorissa

Abụ Ọma 37:5 sịrị: “Kwe ka Jehova na-edu gị. Tụkwasị ya obi. Ọ ga-enyere gị aka.” Christopher na Lorissa bi na Amerịka. Ha kpere ekpere ọtụtụ mgbe ka Jehova nyere ha aka ka ha nwee ike imezu ebumnobi ha, nke bụ́ ịkwaga mba ọzọ gaa zie ozi ọma. Ọ na-abụkwa ha nwewe ofufe ezinụlọ, ha na-eleba anya n’ihe ndị ha nwere ike ime ka ha nwee ike ịkwaga obodo ọzọ, ha na-agbakọ ihe ndị nwere ike ịbụrụ ha nsogbu na uru ndị ha ga-enweta ma ha mee ya. Ebe ọ bụ na ha achọghị ịga ebe ha ga-ebido ịmụ asụsụ ọhụrụ, ha họọrọ ịkwaga Gayana, n’ihi na asụsụ Bekee bụ asụsụ bụ́ isi a na-asụ ná mba ahụ.

Ihe ọzọ ha mere bụ ime ihe e kwuru n’Ilu 15:22: “Atụmatụ na-aghasasị ma ọ bụrụ na a gbaghị izu, ma a na-arụpụta ezigbo ihe ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ.” Ha degaara alaka ụlọ ọrụ na-elekọta ọrụ a na-arụ na Gayana akwụkwọ ozi, * kọwaara ha gbasara onwe ha nakwa na ha dị njikere inye aka. Ha jụkwara ha gbasara otú ụlọ ọgwụ obodo ahụ dị, otú mmiri ozuzo na okpomọkụ ebe ahụ na-adị nakwa omenala ndị ebe ahụ. Alaka ụlọ ọrụ ahụ zara ha ajụjụ ndị ahụ ma gwazie ha otú ha ga-esi kpọtụrụ ndị okenye ebe ahụ ha bu n’obi ịkwaga.

Linel, onye anyị kwuburu okwu ya na mbụ, bụzi onye nlekọta sekit ugbu a na Gayana. Tupu ya akwaga ebe ahụ, o mere ihe ahụ e dere n’Ilu 15:22. Linel sịrị: “E wezụga idowe ego m ga-eji akwaga ebe ahụ, mụ na ndị gatụrụla ozi ná mba ndị ọzọ kwurịtara okwu. Mụ na ndị ezinụlọ m, ndị okenye ọgbakọ m, nakwa onye nlekọta sekit anyị kwurịtara ya. Agụkwara m ihe niile m nwere ike ịgụ gbasara ịga n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma n’akwụkwọ anyị dị iche iche.”

Joseph na Christina

Ọtụtụ ndị chọrọ ije ozi ná mba ọzọ na-ekpebi ibu ụzọ gaa obodo ahụ. Joseph na Christina, bụ́ di na nwunye, sịrị: “Mgbe mbụ anyị gara Gayana, anyị nọrọ ọnwa atọ. Ọnwa atọ ahụ zukwaara anyị ịma ihe ịkwaga n’obodo ọzọ dị ka ya. Anyị laghachiziri obodo anyị, mee ndokwa ndị fọrọnụ, ma kwagazie ebe ahụ.”

Olee Otú Ha Si Mee Ka Ebe Ahụ Mara Ha Ahụ́?

Joshua

Onye wepụtara onwe ya ijere Chineke ozi ná mba ọzọ, nke chọrọ ka ihe gaziere ya, ga-ahapụ ihe ụfọdụ dị ya mkpa ma dị njikere ịgba mbọ ka ebe ahụ na omenala ha mara ya ahụ́. Dị ka ihe atụ, ndị si mba na-ajụkarị oyi kwaga mba na-ekpokarị ọkụ na-achọpụta na ụmụ ahụhụ dị iche iche na-ejupụta n’ụlọ ha. Joshua, onye anyị kwuburu okwu ya na mbụ, sịrị: “Ahụtụbeghị m ụmụ ahụhụ hiri nne otú a. O yikwara ka ndị nke m na-ahụ na Gayana ebe a hà buchara nnọọ ibu karịa ndị m hụtụrụla mbụ! Ma ka oge na-aga, ịhụ ha maara m ahụ́. Abịakwara m chọpụta na ị chọọ ka ụmụ ahụhụ ghara iju n’ụlọ gị, debe ebe niile ọcha. Hụ na ị na-asa efere ọ bụla i ji rie nri ozugbo, na ị naghị ahapụ ihe ndị i kwesịrị ikpofu ekpofu, nakwa na ị na-edebe ụlọ gị ọcha mgbe niile.”

Ka ibi ná mba ọzọ nwee ike ịmara mmadụ ahụ́, onye ahụ ga-amụta iri nri ndị ọ na-amabughị, mụtakwa otú e si esi ha. Joshua sịrị: “Mụ na onye mụ na ya bi gwara ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ndị ebe ahụ ka ha kụziere anyị otú e si eji ihe ndị e nwere ebe ahụ esi nri. E nwee nri anyị mụtara isi, anyị esie ya, kpọọ ndị ọgbakọ anyị ụfọdụ ka ha bịa soro anyị rie ya. Ihe a bụ nnọọ otu ụzọ magburu onwe ya anyị na ụmụnna anyị si ghọọ ezigbo enyi.”

Paul na Kathleen

A bịa n’ihe gbasara omenala ndị ebe ahụ, Paul na Kathleen sịrị: “Ọ bụ mgbe anyị bịara ebe a ka ọ bịara dị mkpa ka anyị mụwa ụdị omume na-agaghị ewe ndị ebe a iwe nakwa ụdị uwe anyị kwesịrị ịna-eyi n’ebe a na-ekpo ọkụ. O nwetụbeghị mgbe ime ihe ndị a siiri anyị ike. N’ihi ya, anyị weturu onwe anyị ala ma mee mgbanwe ụfọdụ, ọ bụrụhaala na o megideghị ihe Baịbụl kwuru. Otú ahụ anyị si nabata omenala ndị ebe ahụ mere ka anyị na ndị ọgbakọ anyị dịkwuo ná mma, meekwa ka ndị obodo na-ege anyị ntị n’ozi ọma.”

Olee Uru Ndị Ha Riterela?

Joseph na Christina kwuchiteere ọtụtụ ndị ọzọ ọnụ, ha sịrị: “Ngọzi ya karịrị nnọọ nsogbu na ihe isi ike ndị ị ga-enwe. Ịhapụ ihe ndị anyị na-emebu ma mewe ihe ọhụrụ a nyeere anyị aka ilebagharị anya n’ihe ndị kacha anyị mkpa ná ndụ. Ihe ndị anyị na-ewerebu ka ihe ndị kacha mkpa bịara ghọzie ihe ndị na-adịchaghị mkpa n’anya anyị. Ihe ọma ọ bụla meere anyị na-eme ka anyị kpebisikwuo ike na anyị ga na-eme ike anyị niile n’ozi Jehova. Ihe ndị anyị nwere bịara ju anyị afọ, obi eruokwa anyị ala.”

Erica, onye anyị kwuburu okwu ya na mbụ, sịrị: “Ịga ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma mere ka mụ na di m ghọtakwuo ihe ịtụkwasị Jehova obi pụtara. Anyị ahụla otú o si na-enyere anyị aka otú anyị na-ahụtụbeghị ya mbụ. Ka mụ na di m na-ahụ ihe ọma ndị a na-emere anyị, o mere ka mụ na ya na-ebikwu n’udo.”

^ par. 1 Ị ga-ahụ ebe a kọrọ akụkọ otú ozi ọma si ruo Gayana n’Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke afọ 2005, nke Bekee.

^ par. 7 Ọ bụ alaka ụlọ ọrụ dị na Trinidad na Tobego na-ahụ maka ọrụ a na-arụ ná mba a.