Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

“Ọ Dị Ka Ụwa Ò Zuuru M”

“Ọ Dị Ka Ụwa Ò Zuuru M”
  • AFỌ A MỤRỤ M: 1962

  • EBE M SI: Kanada

  • NDỤ M BIRI: Ebiri m ndụ rụrụ arụ

NDỤ M BIRI NA MBỤ

A mụrụ m na Mọntriọl, bụ́ obodo kacha buo ibu na Kwebek dị na Kanada. Nne na nna anyị zụlitere mụ na ụmụnne m atọ n’ọmarịcha obodo a na-akpọ Rozmọnt. Ha hụrụ anyị n’anya. Anyị niile biri n’udo n’ezinụlọ anyị.

Mgbe m bụ nwata, ihe gbasara Baịbụl na-atọ m ụtọ. M chetara mgbe m dị afọ iri na abụọ, m gụrụ Agba Ọhụrụ nke Baịbụl ebe kọrọ otú Jizọs si bie ndụ n’ụwa. Ihe m gụrụ tọrọ m ezigbo ụtọ. Otú Jizọs si hụ ndị mmadụ n’anya na otú ihe banyere ha si emetụ ya n’obi metụrụ m n’ahụ́, mụ achọọkwa ịdị ka ya. Ma, ka m nọ na-etolite, mụ na ndị na-akpa àgwà ọjọọ malitere ịkpa, mmasị m nwere ịna-eme ka Jizọs ejiri nwayọọ nyụọ ka ọkụ.

Papa m na-afụ ngwá egwú a na-akpọ saxophone. O nyere m ngwá egwú a, meekwa ka ịkụ egwú na-atọ m ụtọ, mụ ejiri ya mere aka ọrụ. Egwú na-atọ m ezigbo ụtọ nke na o gbughị oge mụ amụta ịkpọ ụbọ. Ka oge na-aga, m kpọọrọ ụfọdụ ndị enyi m bido òtù egwú na-akụ egwú rọk, anyị gakwara ọtụtụ ebe kụọ egwú. Ụfọdụ ụlọ ọrụ a ma ama na-emepụta egwú hụrụ otú m si akụ egwú ma gwa m ka ha mee ka egwú m na-ewu ewu. Mụ na otu ụlọ ọrụ ma nke a na-akọ n’imepụta egwú kwekọrịtara ka ha mepụtawara m egwú. Egwú m bịara malite iwu ewu, a na-akpọkwa ya na redio mgbe niile na Kwebek.

Ọ dị ka ụwa ò zuuru m. M bụ nwa okorọbịa aha ya na-ede ude. Egwú m na-akụ na-atọ m ụtọ, na-enyekwa m ezigbo ego. Chi bọọ, m na-aga megaa ahụ́, a na-agba m ajụjụ ọnụ, ndị mmadụ na-ewete ihe ha dị iche iche ka m bịanyere ha aka na ya, m na-agbakwa na tiivi. N’abalị, m na-akụ egwú m, na-agakwa oriri na nkwari. Ka m nwee ike ịna-akụ egwu n’ihu ìgwè mmadụ n’atụghị ụjọ, m bidoro ṅụwa mmanya mgbe m ka na-eto eto, mechaakwa ṅụwa ọgwụ ike. M na-eme otú ọ bụla o si masị m, na-ebikwa ndụ rụrụ arụ.

Ụfọdụ ndị chọwara ịna-eme ka m n’ihi na m yiri onye na-enwe obi ụtọ. Ma, n’ime obi m, ama m na anaghị m enwe obi ụtọ, karịchaa ma naanị m nọrọ. Ike ụwa na-adị agwụ m, mụ ana-echegbukwa onwe m. Ma n’oge ahụ ihe nọ na-agaziri m, ọrịa obiri n’ájá ọcha gburu mmadụ abụọ n’ime ndị na-emepụtara m egwú. O riri m ọnụ. Ọ bụ eziokwu na ịkụ egwú na-atọ m ụtọ, mana ụdị ndụ ya na ya so aga malitere ịsọ m oyi.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M

N’agbanyeghị na ihe nọ na-agara m nke ọma, ama m na ihe anatụdịghị aga otú o kwesịrị n’ụwa. Gịnị mere mmegbu ji ju ebe niile? M nọ na-eche ihe mere na e nwebeghị ihe Chineke mere banyere ihe na-eme n’ụwa. Ọtụtụ oge, m kpedịrị ekpere rịọ Chineke ka o mee ka m ghọta ihe mere mmegbu ji ju n’ụwa na ihe mere na o nwebeghị ihe o mere maka ya. N’otu oge m kwụsịtụrụ ka m zuru ike n’ebe m gara ilegharị anya, m maliteghachiri ịgụ Baịbụl. Ọ bụ eziokwu na aghọtaghị m ọtụtụ n’ime ihe ndị m gụrụ, ma ihe m gụtara mere ka o doo m anya na ọgwụgwụ ụwa adịla nso.

Ka m na-agụ Baịbụl, m gụtara na o nwere oge Jizọs buru ọnụ abalị iri anọ n’ala ịkpa. (Matiu 4:1, 2) M gwara onwe m na ọ bụrụ na mụ ebuo ọnụ ka Jizọs, Chineke nwekwara ike ime ka m mata onye ọ bụ. N’ihi ya, m kpebiri ụbọchị m ga-ebido. Mgbe ọ fọrọ izu abụọ ka m bido, Ndịàmà Jehova abụọ bịara kụọ aka n’ụlọ m. M gwara ha batawa ka à ga-asị na m na-atụ anya ha kemgbe. Aha otu n’ime ha bụ Jacques. M legidere ya anya ná mkpụrụ anya ma jụọ ya, sị: “Olee otú anyị ga-esi mara ma oge a anyị bi ọ̀ bụ oge ikpeazụ?” O mepere Baịbụl ya ma gụọrọ m 2 Timoti 3:1-5. M jụwaziri ha abụọ ọtụtụ ajụjụ, m jụpụ, mụ ajụchie. Otú ha si jiri Baịbụl zaa m ha otú doro m anya, tọrọ m ezigbo ụtọ. Mgbe mụ na ha kwurịtara ugboro ole na ole ọzọ, m ghọtara na ọ baghịzi uru mụ ibuwe ọnụ ahụ m chọburu ibu.

Mụ na Ndịàmà Jehova malitere ịmụchi Baịbụl anya. M mechara kpụọ isi m n’ihi na ọ dị ogologo, malitekwa ịga ọmụmụ ihe niile ha na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị m nso. Otú ha si anabata m nke ọma ma m gaa ọmụmụ ihe mere ka obi sie m ike na ọ bụ ha na-akụzi eziokwu.

O doro m anya na ọ bụrụ na m chọrọ ịna-eme ihe m na-amụta, m kwesịrị ịgbanwe ụfọdụ ihe ná ndụ m. Ama m na m kwesịrị ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ, kwụsịkwa ndụ rụrụ arụ m na-ebi. M kwesịkwara ịkwụsị iche naanị gbasara onwe m, na-echekwa gbasara ndị ọzọ. Ebe ọ bụ naanị m na-azụ ụmụ m abụọ, m kwesịrị ịna-elekọta ha, na-enyekwara ha aka ka ha na Jehova dịrị ná mma. Ọ bụ ihe ndị a mere m ji kwụsị ịkụ egwú, malitezie ịrụ ọrụ a na-anaghị akwụ m ezigbo ụgwọ n’otu ụlọ ọrụ.

Ọ dịghịrị m mfe ime mgbanwe ndị a niile. M gbara mbọ ka m kwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ. Mgbe ụfọdụ, ahụ́ na-enye m nsogbu n’ihi ọgwụ ọjọọ ahụ m kwụsịrị ịṅụ, e nwekwara oge ndị m ṅụrụ ya ọzọ. (Ndị Rom 7:19, 21-24) Ihe kacha siere m ike ịkwụsị bụ omume rụrụ arụ. Ọrụ m na-arụ ugbu a na-agwụ m ezigbo ike, ego adịghịkwa ya. Ọ na-ewe m ọnwa atọ iji nweta ego m na-enweta naanị n’awa abụọ m kụrụ egwú.

Ekpere nyeere m aka ime mgbanwe ndị a siiri m ike. Ihe ọzọ nyeere m aka bụ ịgụchi Baịbụl anya. E nwere ụfọdụ amaokwu Baịbụl nyeere m ezigbo aka. Otu n’ime ha bụ 2 Ndị Kọrịnt 7:1. Ebe ahụ gwara Ndị Kraịst ka ha “sachapụ onwe [ha] mmerụ niile nke anụ ahụ́ na nke mmụọ.” Ndị Filipaị 4:13 mekwara ka obi sie m ike na m ga-akwụsili àgwà ọjọọ ndị m na-akpa. Ebe ahụ sịrị: “N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.” Jehova Chineke zara ekpere m ma nyere m aka mụ emechaa ghọta ihe Baịbụl na-ekwu ma na-eme ya eme. Nke a mere ka m nyefee Jehova onwe m. (1 Pita 4:1, 2) N’afọ 1997, e mere m baptizim, mụ aghọọ Onyeàmà Jehova.

URU NDỊ M RITERELA

O doro m anya na m gaarala anwụ ma a sị na m ka na-ebi ụdị ndụ ahụ m na-ebi na mbụ. Ma ugbu a, ndụ m na-atọ m ezigbo ụtọ. Jehova ji ọmarịcha nwunye m bụ Elvie gọzie m. Mụ na ya ji oge anyị niile na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl. Ozi anyị na-eje na-eme m ezigbo obi ụtọ. Ekele dịrị Jehova na ọ dọtara m n’ebe ọ nọ.—Jọn 6:44.