Gaa n'Isiokwu

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

“Ihere Onwe M Anaghịzi Eme M”

“Ihere Onwe M Anaghịzi Eme M”
  • A mụrụ m n’afọ: 1963

  • Abụ m onye: Meksiko

  • Ndụ m biri: Adara m ogbenye, na-ehi n’okporo ámá, na-echekwa na abaghị m uru

NDỤ M BIRI NA MBỤ

A mụrụ m na Siudad Obregọn dị n’ebe ugwu Meksiko. Abụ m nwa nke ise n’ime ụmụ itoolu ndị mụrụ m mụrụ. Anyị bi n’ime obodo ebe papa m nwere ugbo ọ na-azụ anụmanụ, na-akọkwa ihe ụfọdụ. Ebe ahụ mara ezigbo mma. Ezinụlọ anyị dịkwa n’otu ma na-enwe obi ụtọ. Ma, mgbe m dị naanị afọ ise, ajọ ifufe bịara mebisịa ihe niile anyị nwere, anyị akwagazie obodo ọzọ.

Papa m malitekwara nwetawa ego. Ma, ọ ghọkwara onye aṅụrụma. Ihe a kpara ezinụlọ anyị aka ọjọọ. Mụ na umunne m ndị nwoke abụọ tọrọ m malitere izuru siga papa anyị ma na-ese ya. Otu ụbọchị mgbe m dị afọ isii, aṅụgidere m mmanya, ya egbuwe m. Obere oge ihe a mechara, papa m na mama m kewara, mama m apụọrọ ya n’ụlọ, àgwà ọjọọ m akakwuo njọ.

Mama m mechara kpọrọ mụ na ụmụnne m gaa ya na nwoke ọzọ ebiri. Nwoke ahụ anaghị enye ya ego, ego mama m na-akpata anaghịkwa ezuru anyị. N’ihi ya, mụ na ụmụnne malitere ịrụ ọrụ ọ bụla anyị hụrụ, ma ihe anyị na-akpata anaghịdị ezuru anyị ịzụta ihe ndị dị anyị mkpa. M na-ehichara ndị mmadụ akpụkpọ ụkwụ, na-ere bred, akwụkwọ akụkọ, chịngọm nakwa ihe ndị ọzọ. M na-agagharịkwa na-ele ma m̀ ga-ahụ nri n’ihe ndị bara aba ji ekpofu unyi.

Mgbe m dị afọ iri, otu nwoke gwara m ka m bịa soro ya rụwa ọrụ ebe a na-ekpofu unyi n’obodo anyị. M kwetara ma kwụsị ịga ụlọ akwụkwọ. Ọ na-akwụ m ihe na-eruchaghị narị naịra abụọ n’ụbọchị, na-enyekwa m nri anyị wetara n’ebe ahụ. Eji m ihe ndị m tụtara n’ebe ahụ a na-ekpofu unyi rụta mkpakara ụlọ m na-ehi. Ndị bi ebe ahụ na-ekwu okwu rụrụ arụ, na-ebikwa ndụ rụrụ arụ. Ọtụtụ n’ime ha na-aṅụ ọgwụ ọjọọ, bụrụkwa ndị aṅụrụma. Oge ahụ bụ oge kacha njọ ná ndụ m. M na-ebe ákwá abalị ọ bụla, oké ụjọ ana-atụkwa m. N’ihi ogbenye m dara nakwa akwụkwọ m na-agụchaghị, ihere onwe m na-eme m. M biri n’ebe ahụ a na-ekpofu unyi ruo afọ atọ tupu mụ akwaga n’ebe ọzọ na Meksiko. M bidoro ịrụ n’ugbo ebe a na-aghọ okooko osisi na ogho. Anyị na-egbu okpete, na-egwukwa poteto.

Ebiri m afọ atọ n’ebe a na-ekpofu unyi, dị ka nke a ị na-ahụ ebe a

Mgbe afọ anọ gara, m laghachiri Siudad Obregọn. Adanne mpa m, bụ́ onye dibịa afa, nyere m otu ọnụ ụlọ n’ụlọ ya ka m biri. M bidoro ịna-arọ nrọ ọjọọ, na-adakwa mbà n’obi nke na m chewara echiche igbu onwe m. Otu abalị, m kpere ekpere gwa Chineke, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ị dị adị, achọrọ m ịmata gị, m ga-efekwa gị ruo mgbe ebighi ebi. Ọ bụrụ na e nwere ezigbo ụzọ e si efe gị, mee ka m mata ya.”

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M

Kemgbe ụwa, ọ na-agụ m agụụ ịmụta banyere Chineke. Mgbe m dị obere, m gara chọọchị dị iche iche, ma ike ha niile mechara gwụ m. O nweghị nke n’ime ha kụziiri m ọtụtụ ihe banyere Baịbụl ma ọ bụ nyere m aka ịmata Chineke m na-achọ ịmata. Mkpa ụfọdụ n’ime ha bụ ego, ebe nsogbu ndị nke ọzọ bụ na ndị chọọchị ha na-ebi ndụ rụrụ arụ.

Mgbe m dị afọ iri na itoolu, otu ọgọ m nwoke gwara m na Ndịàmà Jehova gwara ya ihe Baịbụl kwuru gbasara iji ihe oyiyi efe Chineke. Ọ gụụrụ m Ọpụpụ 20:​4, 5. Ebe ahụ kwuru na anyị ekwesịghị ime oyiyi a pịrị apị. Amaokwu nke 5 kwuru, sị: “Akpọrọla ha isiala, ekwekwala ka a rata gị ife ha ofufe, n’ihi na mụ onwe m bụ́ Jehova Chineke gị bụ Chineke nke chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa.” Ọgọ m nwoke jụziri m, sị: Ọ bụrụ na Chineke na-eji ihe oyiyi arụ ọrụ ebube ma ọ bụ chọọ ka anyị jiri ya na-efe ya, gịnịzi mere o ji sị ka a ghara ime ya ma ọ bụ kpọọrọ ya isiala?” Ihe a mere ka m chee echiche. Obere oge, mụ na ọgọ m tụlere ọtụtụ ihe Baịbụl kwuru. Mgbe ọ bụla mụ na ya na-ekwurịta banyere Baịbụl, obi na-atọ m ezigbo ụtọ nke na anaghị m ama mgbe oge ji gaa.

O mechara kpọrọ m gaa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Ihe m hụrụ na ihe m nụrụ ebe ahụ tọrọ m ezigbo ụtọ. Ụmụaka na-etinyedị ọnụ n’ihe a na-amụ, na-ekwukwa okwu nke ọma n’elu ikpo okwu. M gwara onwe m sị: ‘Ihe a na-akụzi ebe a amaka.’ N’agbanyeghị na m dị nkịrịka n’anya, isi erujuokwa m ọnụ, Ndịàmà Jehova ji obi ụtọ nabata m. E nwedịrị otu ezinụlọ sịrị m bịa soro ha rie nri n’abalị ahụ mgbe a gbasara ọmụmụ ihe.

Mgbe mụ na Ndịàmà Jehova mụwara Baịbụl, m mụtara na Jehova Chineke bụ Nna hụrụ anyị n’anya ma jiri anyị kpọrọ ihe, n’agbanyeghị otú anyị nweruru ego, ọkwá anyị, agbụrụ anyị, ma ọ bụ ebe anyị gụruru akwụkwọ. Ọ naghị ele mmadụ anya n’ihu. (Ọrụ Ndịozi 10:​34, 35) Emechaala m matawa Chineke m na-achọ ịmata. Ọ naghịzi adịcha m ka ò nwere ihe na-efunahụ m ná ndụ.

URU NDỊ M RITERELA

Ndụ m bidoro ịka mma. M kwụsịrị ịṅụ sịga, ịṅụbigba mmanya ókè nakwa ikwu okwu rụrụ arụ. Ma obi na-ajọ m njọ kemgbe m bụ nwatakịrị ma nrọ ọjọọ ndị ahụ m na-arọ ji nwayọọ nwayọọ kwụsị. M na-echebu na abaghị m uru n’ihi ihe ndị mere m n’oge m bụ nwata nakwa n’ihi na agụchaghị m akwụkwọ. Ma emechara m kwụsị iche otú ahụ.

A lụrụ m ezigbo nwaanyị hụrụ Jehova n’anya, ọ na-enyekwara m aka nke ukwuu. Abụ m onye nlekọta sekit nke Ndịàmà Jehova ugbu a. M na-aga eleta ọgbakọ dị iche iche, na-agba ụmụnna m ume, ma na-akụziri ha ihe. Otú Baịbụl si mee ka m gbanwee ndụ m, nakwa ihe ndị magburu onwe ha Chineke na-akụziri anyị, emeela ka ihere onwe m ghara ịna-eme m.

Ọ na-atọ mụ na nwunye m ụtọ ikụziri ndị mmadụ ihe otú ahụ a kụziiri m