Nọvemba 3-9

ABỤ SOLOMỌN 1-2

Nọvemba 3-9

Abụ nke 132 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Akụkọ Nke Na-egosi Ezigbo Ịhụnanya

(Nkeji 10)

[Kpọnye VIDIO Bụ́ Ihe Akwụkwọ Abụ Sọlọmọn Na-ekwu.]

Solomọn toro nwa agbọghọ Shulem ma kwe ya nkwa na ya ga-enye ya akụnụba (Abụ Solo. 1:9-11)

Ezigbo ịhụnanya nwa agbọghọ Shulem hụrụ nwa okorobịa ya na ya dị ná mma, bụ́ onye na-azụ atụrụ, mere ka ọ ghara ịhapụ nwa okorobịa ahụ (Abụ Solo. 2:16, 17; w15 1/15 30 ¶9-10)

IHE GA-ENYERE GỊ AKA: Mgbe ị na-agụ akwụkwọ Abụ Solomọn na Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, jiri ebe a kpọrọ “Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ A” chọpụta onye kwuru nke o kwuru.

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Abụ Solo. 2:7​—Gịnị mere Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ji kwesị ịna-eme ka nwa agbọghọ Shulem? (w15 1/15 31 ¶11)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Kụziere mmadụ otu n’ime eziokwu ndị dị n’ihe ndị ọzọ a kọwara nke A na broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya. (lmd isi nke 1 nọmba nke 3)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Kụziere mmadụ otu n’ime eziokwu ndị dị n’ihe ndị ọzọ a kọwara nke A na broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya. (lmd isi nke 9 nọmba nke 3)

6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 46

7. “A Ga-agọzi Onye Na-emesapụ Aka”

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ bụ okenye ga-eme ya.

A na-agọzi anyị ma anyị jiri oge anyị, ume anyị, na ihe ndị ọzọ anyị nwere na-enyere ndị ọzọ aka. N’eziokwu, onye anyị nyeere aka na-ewere ihe anyị meere ya ka ngọzi. Ma, a na-agọzikwa anyịnwa maka na anyị na-emesapụ aka. (Ilu 22:9) Ọ bụghị naanị na anyị na-enwe obi ụtọ maka na anyị na-eme ka Onye kere anyị, kamakwa, anyị na Jehova ga-adịkwa ná mma.​—Ilu 19:17; Jems 1:17.

Kpọnye VIDIO Bụ́ Anyị Na-enwe Obi Ụtọ ma Anyị Na-emesapụ Aka. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Olee otú aka ụmụnna anyị n’ụwa niile na-emesapụ si mee ka ndị anyị lere na vidio a na-enwe obi ụtọ?

  • Olee otú hanwa sikwarala nwee obi ụtọ maka na ha na-emesapụrụ ndị ọzọ aka?

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) lfb isi nke 32-33

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 137 na Ekpere