Nọvemba 24-30

AỊZAYA 1-2

Nọvemba 24-30

Abụ nke 44 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. “Ndị Mmehie Na-anyịgbu” Nwere Olileanya

(Nkeji 10)

[Kpọnye VIDIO Bụ́ Ihe Akwụkwọ Aịzaya Na-ekwu.]

‘Mmehie nọ na-anyịgbu’ ndị Chineke (Aịza. 1:4-6; ip-1 14 ¶8)

Jehova dị njikere ịgbaghara ha kpamkpam ma ha chegharịa (Aịza. 1:18; ip-1 28-29 ¶15-17)

AJỤJỤ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Jehova gwara ndị Izrel na ya ga-agbaghara ha ma ha chegharịa. Olee otú ihe a ọ gwara ha ga-esi emesi anyị obi ike ma anyị chee na Jehova agaghị agbaghara anyị maka na mmehie anyị jọgburu onwe ya?

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Aịza. 2:2​—Gịnị ka “ugwu nke ụlọ Jehova dị n’elu ya” nọchiri anya ya? (ip-1 39 ¶9)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Kụziere mmadụ otu n’ime eziokwu ndị dị n’ihe ndị ọzọ a kọwara nke A na broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya. (lmd isi nke 3 nọmba nke 3)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Onye ahụ chọrọ ka gị na ya kwurịta ihe dị iche n’ihe ị kwadebere ịgwa ya. (lmd isi nke 7 nọmba nke 4)

6. Okwu

(Nkeji 5) ijwbq isiokwu nke 96​—Isiokwu: Gịnị Bụ Mmehie? (th ihe ọmụmụ nke 20)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 38

7. Bụrụ Enyi Jehova​—Jehova Na-agbaghara Mmehie

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Kpọnye VIDIO. I nwere ike ịgwa ụmụaka ị họọrọ ka ha gbagote n’elu ikpo okwu ka ị gbaa ha ajụjụ ọnụ gbasara vidio a na ihe ndị ha mụtara na ya.

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 89 na Ekpere