Nọvemba 10-16
ABỤ SOLOMỌN 3-5
Abụ nke 31 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Àgwà Ọma Bara Uru
(Nkeji 10)
Otú nwa agbọghọ Shulem si agwa ndị ọzọ okwu gosiri na o nwere àgwà ọma (Abụ Solo. 4:3, 11; w15 1/15 30 ¶8)
E ji nwa agbọghọ a tụnyere ubi a gbara ogige maka na o merụghị onwe ya emerụ (Abụ Solo. 4:12; w00 11/1 11 ¶17)
Àgwà ọma bara uru karịa mma elu ahụ́. Anyị niile nwekwara ike ịna-akpa àgwà ọma (g05 1/8 21 ¶2-5)
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee àgwà ọma ndị ọzọ na-akpa kacha amasị m?’
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
-
Abụ Solo. 3:5—Gịnị mere nwa agbọghọ Shulem ji jiri “ele na nne mgbada bi n’ọhịa” na-arịọ “ụmụ nwaanyị Jeruselem” ka ha ṅụọrọ ya iyi? (w06 11/15 18 ¶4)
-
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Abụ Solo. 4:1-16 (th ihe ọmụmụ nke 2)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gwa onye ị hụrụ n’ozi ụlọ n’ụlọ otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 6 nọmba nke 4)
5. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Gosi onye ahụ otú e si achọta ihe na jw.org n’asụsụ ya. (lmd isi nke 4 nọmba nke 3)
6. Okwu
(Nkeji 5) ijwbq isiokwu nke 131—Isiokwu: Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ite Ntecha na Iyi Ọla? (th ihe ọmụmụ nke 1)
Abụ nke 36
7. Lụọ Naanị Onye Na-eso Ụzọ Onyenwe Anyị (Jen. 28:2)
(Nkeji 8)
8. Ị̀ Ga-abụ Ezigbo Di Ma Ọ Bụ Ezigbo Nwunye?
(Nkeji 7) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Ị̀ na-achọ nwoke ma ọ bụ nwaanyị ị ga-alụ? Ọ bụrụ na ụmụnna ndị na-achọ di ma ọ bụ nwaanyị eleruo gị anya, ihe ha na-ahụ ọ̀ bụ nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị nwere ezigbo àgwà? Mmadụ nwere ike na-akpatụ àgwà ka ezigbo Onye Kraịst, ma ka oge na-aga, ọ na-egosi ụdị onye ọ bụ n’eziokwu.
Dee otu amaokwu Baịbụl dabara na nke ọ bụla n’ime àgwà ndị a ezigbo Onye Kraịst na-akpa.
-
Ịhụ Jehova n’anya na inwe okwukwe na ya
-
Ịbụ ezigbo onyeisi ezinụlọ ma ọ bụ ịbụ nwaanyị na-erubere di ya isi
-
Ịchọ ihe ga-abara ndị ọzọ uru na inwe ezigbo ịhụnanya
-
Ichezi echiche echezi, imeru ihe n’ókè, na ile ihe anya otú kwesịrị ekwesị
-
Ịrụsi ọrụ ike na ịgba mbọ
9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) lfb isi nke 34-35

