Disemba 15-21

AỊZAYA 9-10

Disemba 15-21

Abụ nke 77 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. E Buru Amụma na A Ga-ahụ “Ezigbo Ìhè”

(Nkeji 10)

A ga-ahụ “ezigbo ìhè” na Galili (Aịza. 9:1, 2; Mat. 4:12-16; ip-1 125-126 ¶16-17)

A ga-eme ka mba nabatara ezigbo ìhè ahụ mụbaa nke ukwuu, ndị bi na ya ga-aṅụrịkwa ọṅụ (Aịza. 9:3; ip-1 126-128 ¶18-19)

Uru ezigbo ìhè ahụ ga-abara ndị mmadụ ga-adịgide adịgide (Aịza. 9:4, 5; ip-1 128-129 ¶20-21)

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Aịza. 9:6​—Olee otú Jizọs ga-esi abụ “Onye Ndụmọdụ Dị Ebube”? (ip-1 130 ¶23-24)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Onye ahụ na-ekpe okpukpe na-ekweghị na Kraịst. (lmd isi nke 1 nọmba nke 4)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gị na onye i nyere traktị n’oge gara aga kwurịtakwuo ihe dị na ya. (lmd isi nke 9 nọmba nke 3)

6. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere

(Nkeji 5) Ihe Ngosi. ijwfq isiokwu nke 35​—Isiokwu: Ndịàmà Jehova Hà Agbanweela Ihe E Dere na Baịbụl Ka Ọ Daba n’Ihe Ha Kweere? (th ihe ọmụmụ nke 12)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 95

7. Ìhè Na-enwusikwu Ike

(Nkeji 5) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Ihe na-akakwu mma ná nzukọ Jehova. Ị̀ na-aghọta ihe ndị mere o ji akakwu mma? Ka anyị leba anya n’ụzọ atọ nzukọ Jehova si na-aga n’ihu n’ihu nakwa uru ha na-abara anyị.

  • Dee otu eziokwu dị na Baịbụl anyị ghọtakwurula nakwa uru ọ baarala anyị.​—Ilu 4:18

  • Dee otu ihe gosiri na otú anyị si ekwusa ozi ọma na-akakwu mma ma ọ bụ na ozi anyị na-agbasakwu agbasa, deekwa otú ihe a sirila nyere anyị aka ịrụ ọrụ Jizọs nyere anyị.​—Mat. 28:19, 20

  • Dee otu ihe a gbanwerela n’otú e si hazie ihe ná nzukọ Jehova nakwa uru ọ baarala anyị.​—Aịza. 60:17

8. Ihe Nzukọ Jehova Na-eme nke Ọnwa Disemba

(Nkeji 10) Kpọnye VIDIO.

9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 92 na Ekpere