Mee 25-31

AỊZAYA 65-66

Mee 25-31

Abụ nke 24 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Obi Dị Anyị Ụtọ na Anyị Nọ na Paradaịs Ihe Atụ

(Nkeji 10)

Ndị na-efe Chineke, bụ́ ndị nọ na paradaịs ihe atụ, nwejuru nri si n’Okwu Chineke enweju (Aịza. 65:13; cl 275 ¶12, 14)

Paradaịs ihe atụ anyị nọ na ya na-enyere anyị aka idi nsogbu, na-emekwa ka ahụ́ ruo anyị ala (Aịza. 65:14-17; w24.04 22 ¶9-10)

E nweghị ihe ụwa ga-enyeli anyị a ga-eji tụnyere otú anyị si dịrị n’udo, obi eruokwa anyị ala (Aịza. 65:25; w24.04 23 ¶13)


IHE Ọ PỤTARA: “Paradaịs ihe atụ” pụtara otú obi si ruo ndị na-efe Jehova ala. Na paradaịs a, anyị na Jehova na ụmụnna anyị dị n’udo.

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Aịza. 66:24​—Olee otú ihe e dere n’amaokwu a si enyere anyị aka ịghọta ihe Jizọs kwuru na Mak 9:47, 48 gbasara Gehena? (it “Gehena” ¶6-7)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Ka gị na mmadụ na-akparịta ụka, kwuo ihe ga-eme ka ọ mata na ị bụ Onyeàmà Jehova n’akpọrọghị ya okwu aha. (lmd isi nke 5 nọmba nke 3)

5. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 2) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Onye ahụ chọrọ ka gị na ya rụwa ụka. (lmd isi nke 4 nọmba nke 5)

6. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Jiri traktị malite mkparịta ụka. (lmd isi nke 1 nọmba nke 4)

7. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere

(Nkeji 3) Ihe Ngosi. ijwbq isiokwu nke 87​—Isiokwu: Ònye Bụ Onye Na-emegide Kraịst? (th ihe ọmụmụ nke 17)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 80

8. Ì Chere na E Nwere Ihe Ga-efunahụ Gị?

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Ị̀ na-eche echiche ma ị̀ ga-ebido ozi oge niile? È nwere mgbe ọ na-adị gị ka ihe ụfọdụ hà ga-efunahụ gị ma i bido ya? Ka ì chetụla, sị: ‘Gịnị mere m ga-eji na-emekwu ọtụtụ ihe n’ozi Jehova ebe ọ bụ na ndị niile na-efe Jehova ga-enweta ndụ ebighị ebi?’ Ọ bụrụ otú ahụ, cheta na Jehova “agaghị ajụ inye” ndị tụkwasịrị ya obi “ihe ọ bụla dị mma.” (Ọma 84:11, 12) Naanị mgbe a ga-enwe ihe ga-efunahụ anyị bụ ma ọ bụrụ na anyị ajụ inye Jehova ihe kacha mma anyị nwere.

Ọ bụghị naanị n’ọdịnihu ka Jehova ga-agọzi ndị ya. Kpọnye VIDIO Bụ́ Gịnị Ka Ị Ga-eme “n’Ihi Ozi Ọma”? Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Olee otú Jehova si gọzie ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa ndị a maka na ha kpebiri ịrụkwu ọrụ n’ozi Jehova?

Ma, ọ̀ bụrụkwanụ na ị gaghị ebidoli ozi oge niile ugbu a? Cheta na Jehova na-agọzi ndị na-enye ya ihe kacha mma ha nwere. N’ihi ya, na-enye ya ihe kacha mma i nwere ebe ị ma na ‘ọ ga-awụsa gị ngọzi ruo mgbe ihe ọ bụla na-agaghị akọ gị.’​—Mal. 3:10.

9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) lfb isi nke 88-89

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 55 na Ekpere