Mee 18-24
AỊZAYA 62-64
Abụ nke 44 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Onye Na-akpụzi Anyị Hụrụ Anyị n’Anya, Na-emetekwara Anyị Ebere
(Nkeji 10)
Jehova na-emetere anyị ebere, ma mgbe anyị na-ata ahụhụ mmehie anyị mere (Aịza. 63:9; cl 253-254 ¶7-9)
Ọ bụ eziokwu na ọ naghị echebe anyị ka anyị ghara iji isi anyị buru ihe anyị metere, ọ na-enyere anyị aka (w23.08 28-29 ¶8-9)
Ọ bụrụ na anyị ekwe ka ọ na-akpụzi anyị, ọ ga na-eme ka anyị bụrụ ndị bara ezigbo uru n’anya ya (Aịza. 64:8; w13 9/15 20 ¶15-17)
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
-
Aịza. 63:10—Gịnị ka amaokwu a na-akụziri anyị gbasara ndidi Jehova? (it “Ebere” ¶11)
-
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Aịza. 64:4-12 (th ihe ọmụmụ nke 12)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Chọpụta isiokwu na-amasị onye ahụ, meekwa ndokwa otú ị ga-esi akpọtụrụ ya n’oge ọzọ. (lmd isi nke 1 nọmba nke 5)
5. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gosi onye ahụ otu vidio si n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe. (lmd isi nke 9 nọmba nke 4)
6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
(Nkeji 5) lff 254 igbe isiokwu ya bụ “M̀ Dịla Njikere Iso Ọgbakọ Na-ekwusa Ozi Ọma?” Gị na onye ị na-amụrụ Baịbụl kwurịta otú ọ ga-esi bụrụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim. (lmd isi nke 12 nọmba nke 3)
Abụ nke 115
7. Ịkwadebe Maka Ọdachi—Na-atụ Anya na Ihe A Na-atụghị Anya Ya Nwere Ike Ime
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ bụ okenye ga-eme ihe omume a. Gwakwa ụmụnna ihe alaka ụlọ ọrụ na ndị okenye kwuru gbasara ịkwadebe maka ọdachi, ma ọ bụrụ na e nwere ihe ha kwuru.
Ọdachi nwere ike ime n’ebe ọ bụla n’ụwa na mberede, ndị tigbuo zọgbuo nwekwara ike ịkpa mkpamkpa na mberede. (Ekli. 9:11) Ọ bụrụgodị na i bi n’ebe a na-anaghị enwekarị ọdachi ndị na-emere onwe ha, i kwesịrị ịtụ anya na ihe ndị a na-atụghị anya ha nwere ike ime. (Ilu 22:3) Olee otú ị ga-esi kwadebe akwadebe?
-
Ị nọrọ n’ebe ọhaneze na-anọkarị, kpachapụ anya ka ị na-ahụ ihe ndị na-eme gburugburu ebe ị nọ, leruokwa anya ka ị hụ ebe ndị e nwere ike isi gbapụ ma ihe gbata gbata mee, karịchaa, n’ebe na-ekwo ekwo.
-
Iji kwadebe maka ọdachi ndị na-emere onwe ha, nwee akpa ị ga-eji agbapụ a ma ihe gbata gbata mee, tinyekwa nri na ihe ndị ọzọ ga-adị gị mkpa n’ime ya. Kpebie otú ị ga-esi agbapụ ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka i mee otú ahụ, jidekwa nọmba ị ga-eji akpọtụrụ ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị.—g17.5 4
Kpọnye VIDIO Bụ́ Ịkwadebe Maka Ọdachi: Na-atụ Anya na Ihe A Na-atụghị Anya Ya Nwere Ike Ime. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:
-
Ná mmalite, gịnị ka ụmụnna a chere gbasara ịkwadebe akwadebe maka ọdachi?
-
Olee ihe ndị bara uru ha mere iji kwadebe?
-
Olee otú Jehova si gọzie mbọ ha gbara iji kwadebe maka ọdachị?
-
Gịnị ka ha mụtara n’ihe mere ha?
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Otú m si ele ihe gbasara ịkwadebe maka ọdachi anya ọ̀ na-egosi na m na-akwanyere Jehova ùgwù?’
IHE Ị GA-AGBA MBỌ MEE: N’izu a, ị gaa n’ebe ọhaneze na-anọkarị, jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ebe kacha nso m nwere ike isi gbapụ ma ihe gbata gbata mee?’
8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) lfb isi nke 86, okwu mmalite nkebi nke 13, na isi nke 87
Okwu Mmechi (Nkeji 3) | na Ekpere
a Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ì Wekọtala Ihe Ndị Ga-adị Gị Mkpa?” na Teta! Nke 5 2017, peeji nke 6.

