Mee 18-24

AỊZAYA 62-64

Mee 18-24

Abụ nke 44 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Onye Na-akpụzi Anyị Hụrụ Anyị n’Anya, Na-emetekwara Anyị Ebere

(Nkeji 10)

Jehova na-emetere anyị ebere, ma mgbe anyị na-ata ahụhụ mmehie anyị mere (Aịza. 63:9; cl 253-254 ¶7-9)

Ọ bụ eziokwu na ọ naghị echebe anyị ka anyị ghara iji isi anyị buru ihe anyị metere, ọ na-enyere anyị aka (w23.08 28-29 ¶8-9)

Ọ bụrụ na anyị ekwe ka ọ na-akpụzi anyị, ọ ga na-eme ka anyị bụrụ ndị bara ezigbo uru n’anya ya (Aịza. 64:8; w13 9/15 20 ¶15-17)

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Aịza. 63:10​—Gịnị ka amaokwu a na-akụziri anyị gbasara ndidi Jehova? (it “Ebere” ¶11)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Chọpụta isiokwu na-amasị onye ahụ, meekwa ndokwa otú ị ga-esi akpọtụrụ ya n’oge ọzọ. (lmd isi nke 1 nọmba nke 5)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gosi onye ahụ otu vidio si n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe. (lmd isi nke 9 nọmba nke 4)

6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

(Nkeji 5) lff 254 igbe isiokwu ya bụ “M̀ Dịla Njikere Iso Ọgbakọ Na-ekwusa Ozi Ọma?” Gị na onye ị na-amụrụ Baịbụl kwurịta otú ọ ga-esi bụrụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim. (lmd isi nke 12 nọmba nke 3)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 115

7. Ịkwadebe Maka Ọdachi​—Na-atụ Anya na Ihe A Na-atụghị Anya Ya Nwere Ike Ime

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ bụ okenye ga-eme ihe omume a. Gwakwa ụmụnna ihe alaka ụlọ ọrụ na ndị okenye kwuru gbasara ịkwadebe maka ọdachi, ma ọ bụrụ na e nwere ihe ha kwuru.

Ọdachi nwere ike ime n’ebe ọ bụla n’ụwa na mberede, ndị tigbuo zọgbuo nwekwara ike ịkpa mkpamkpa na mberede. (Ekli. 9:11) Ọ bụrụgodị na i bi n’ebe a na-anaghị enwekarị ọdachi ndị na-emere onwe ha, i kwesịrị ịtụ anya na ihe ndị a na-atụghị anya ha nwere ike ime. (Ilu 22:3) Olee otú ị ga-esi kwadebe akwadebe?

  • Ị nọrọ n’ebe ọhaneze na-anọkarị, kpachapụ anya ka ị na-ahụ ihe ndị na-eme gburugburu ebe ị nọ, leruokwa anya ka ị hụ ebe ndị e nwere ike isi gbapụ ma ihe gbata gbata mee, karịchaa, n’ebe na-ekwo ekwo.

  • Iji kwadebe maka ọdachi ndị na-emere onwe ha, nwee akpa ị ga-eji agbapụ a ma ihe gbata gbata mee, tinyekwa nri na ihe ndị ọzọ ga-adị gị mkpa n’ime ya. Kpebie otú ị ga-esi agbapụ ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka i mee otú ahụ, jidekwa nọmba ị ga-eji akpọtụrụ ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị.​—g17.5 4

Kpọnye VIDIO Bụ́ Ịkwadebe Maka Ọdachi: Na-atụ Anya na Ihe A Na-atụghị Anya Ya Nwere Ike Ime. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Ná mmalite, gịnị ka ụmụnna a chere gbasara ịkwadebe akwadebe maka ọdachi?

  • Olee ihe ndị bara uru ha mere iji kwadebe?

  • Olee otú Jehova si gọzie mbọ ha gbara iji kwadebe maka ọdachị?

  • Gịnị ka ha mụtara n’ihe mere ha?

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Otú m si ele ihe gbasara ịkwadebe maka ọdachi anya ọ̀ na-egosi na m na-akwanyere Jehova ùgwù?’

IHE Ị GA-AGBA MBỌ MEE: N’izu a, ị gaa n’ebe ọhaneze na-anọkarị, jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ebe kacha nso m nwere ike isi gbapụ ma ihe gbata gbata mee?’

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 151 na Ekpere

a Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ì Wekọtala Ihe Ndị Ga-adị Gị Mkpa?” na Teta! Nke 5 2017, peeji nke 6.