Mee 11-17
AỊZAYA 60-61
Abụ nke 146 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. “Jeruselem, Bilie, Mee Ka Ìhè Gị Nwuo”
(Nkeji 10)
N’Aịzaya 60:1, ihe a kpọrọ Jeruselem oge ochie n’asụsụ Hibru bụ “Nwaanyị” (Aịza. 60:1, 2; w24.07 30 ¶1-2)
Amụma ndị e buru n’Aịzaya isi 60 gbasara ịmaliteghachi ife Jehova ezigbo ofufe mezutụrụ n’isi Jeruselem oge ochie (w24.07 30 ¶3-4)
Amụma ndị a na-emezu n’ụzọ ka ukwuu n’isi “Jeruselem nke dị n’elu” (Gal. 4:26; w24.07 30 ¶5–31 ¶2)
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Aịza. 61:1—Olee otú Jizọs si mezuo amụma a? (Luk 4:18-21; w19.12 11 ¶10-11)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Aịza. 61:1-9 (th ihe ọmụmụ nke 11)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Kụziere onye ahụ aha Chineke. (lmd isi nke 4 nọmba nke 3)
5. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. N’oge gara aga unu kwurịtara, o kwuru na ọ dịbeghị anya mmadụ nwụnahụrụ ya. (lmd isi nke 4 nọmba nke 4)
6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
(Nkeji 5) lff isi nke 19 nọmba nke 5 (lmd isi nke 11 nọmba nke 4)
Abụ nke 156
7. Mkpa Ọgbakọ
(Nkeji 15)
8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) lfb isi nke 84-85

