Jun 8-14
JEREMAYA 4-6
Abụ nke 56 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Ka Nnupụisi Ndị Juda Kụziere Gị Ihe
(Nkeji 10)
Ndị Juda bụ ndị isi ike, ha na-enupụkwa isi (Jere. 4:4, 14; w13 3/15 9-10 ¶8-9)
Ha achọghịdị ịma ihe Jehova na-agwa ha gbasara àgwà ha na-akpa (Jere. 5:31; jr 114 ¶2)
Ha tara ahụhụ maka na ha leghaara aka ná ntị Jehova dọrọ ha anya (Jere. 6:17-19)
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Gịnị ka m ga-eme ka m ghara inupụrụ Jehova isi?’
Ọ bụrụ na ọrịa ji gị aka ọjọọ, ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ka e lee gị ahụ́ nke ọma ka e nwee ike gwọọ gị ngwa ngwa? Ọ̀ bụkwa na ị gaghị achọ ime ihe ngwa ngwa ka gị na Jehova dịrị ná mma, ma ọ bụrụ na gị na ya adịghị ná mma?
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
-
Jere. 4:10—Olee otú o si bụrụ na Jehova ghọgburu ndị ya? (w07 3/15 9 ¶4)
-
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Jere. 5:1-11 (th ihe ọmụmụ nke 5)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 2) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. (lmd isi nke 2 nọmba nke 3)
5. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 2) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. (lmd isi nke 1 nọmba nke 3)
6. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Onye ahụ kwuru na ya ekwetaghị na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu. (lmd isi nke 3 nọmba nke 3)
7. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere
(Nkeji 3) Ihe Ngosi. ijwfq isiokwu nke 5—Isiokwu: Gịnị Mere Unu Ji Aza Ndịàmà Jehova? (th ihe ọmụmụ nke 7)
Abụ nke 60
8. Ekwela Ka E Jiri Akụkọ Ụgha Duhie Gị
(Nkeji 8) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
N’Izrel oge ochie, ndị amụma na ndị na-ahụ ọhụụ na-akọsa akụkọ na-abụghị eziokwu nke na-atọ ndị mmadụ ụtọ ná ntị. (Aịza. 30:10; Jere. 5:31) Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Ndị na-akọsa akụkọ na-abụghị eziokwu na-agbalịkarị ka ha kọọ ihe ga-atọ ndị mmadụ ụtọ ná ntị. Olee otú anyị ga-esi echebe onwe anyị?
Kpọnye VIDIO Bụ́ Ekwela Ka E Jiri Akụkọ Ụgha Duhie Gị. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a.
-
Gịnị mere akụkọ ụgha ji jọgbuo onwe ya?
-
Olee otú ụfọdụ ndị sizi eji kọmputa emepụta olu mmadụ, foto mmadụ, ma ọ bụ vidio mmadụ iji ghọgbuo ndị ọzọ? Gịnịkwa mere anyị ji kwesị ịma gbasara ya?
-
Olee otú anyị ga-esi achọpụta ma ihe a na-akọsa ọ̀ bụ eziokwu?—Job 12:11
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘M̀ na-ekwetakarị akụkọ a na-akọsa maka na ọ dabara n’ihe m chere? Ka m̀ na-ebu ụzọ jide n’aka na ọ bụ eziokwu tupu mụ ekwere ya?’
Akụkọ ndị anyị ga-ahụ n’Ịntanet ma ọ bụ ozi a ga-ezitere anyị n’ebe ndị mmadụ na ibe ha na-akparịta ụka n’Ịntanet na-adaberekarị n’ụdị ihe anyị chọrọla n’ebe ndị ahụ. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ihe bụ́ eziokwu n’Ịntanet, i kwesịrị ime ezigbo nchọnchọ.
9. Mkpa Ọgbakọ
(Nkeji 7)
10. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) lfb isi nke 92-93

