Jun 22-28

JEREMAYA 9-10

Jun 22-28

Abụ nke 5 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Gịnị Ka Ị Ga-eji Eme Ọnụ?

(Nkeji 10)

Ejila ihe ndị ị na-eme nke ọma na ha etu ọnụ ma ọ bụ na-achọ ka ndị ọzọ na-eto gị (Jere. 9:23; w20.07 6 ¶13-15)

Na-achọ ụzọ ndị ị ga-esi jiri Jehova na-eme ọnụ (Jere. 9:24; w25.05 30 ¶14)

Dịrị umeala n’obi ka Pọl onyeozi (1 Kọr. 2:1-5; it “Amamihe” ¶25-26)

Ihe ndị anyị ji eme ọnụ nwere ike ịkpa ndị ọzọ aka ọjọọ ma ọ bụ nyere ha aka

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Jere. 10:21​—Gịnị ka amaokwu a na-akụziri ndị okenye? (jr 133-134 ¶11-12)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. (lmd isi nke 3 nọmba nke 5)

5. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. (lmd isi nke 3 nọmba nke 4)

6. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. (lmd isi nke 7 nọmba nke 3)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 48

7. Ekwela Ka E Duhie Gị, Na-achọ Alaeze Chineke (Jere. 10:23)

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Kpọnye VIDIO. Jụzie ụmụnna, sị,

  • Gịnị na gịnị nwere ike ime ka anyị ghara ịna-ele Alaeze Chineke anya otú kwesịrị ekwesị? Olee ihe ga-enyere anyị aka ka a ghara ịghọgbu anyị?

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) lfb isi nke 96-97

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 58 na Ekpere