Jun 1-7

JEREMAYA 1-3

Jun 1-7

Abụ nke 84 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Ebe Jeremaya na-agwa ndị na-ekpe okpukpe ụgha nọ na Jeruselem ihe Jehova kpebiri ime ha

1. ‘Atụla Ụjọ, n’Ihi na Anọnyeere M Gị’

(Nkeji 10)

[Kpọnye VIDIO Bụ́ Ihe Akwụkwọ Jeremaya Na-ekwu.]

Otú ọ dị Jeremaya ka ọ dị ụfọdụ ndị taa. Ụjọ na-atụ ha ikwusa ozi ọma, ma ọ bụkwanụ ha ana-eche na ha erughị eru (Jere. 1:6)

Jehova na-eme ka anyị ruo eruo ime uche ya, ọ na-emekwa ka obi sie anyị ike ime ya (Jere. 1:8, 9; w10 1/15 9 ¶7-8)

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Jere. 2:28​—Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe Jehova gwara ndị bi na Juda nupụụrụ ya isi? (jr 43 ¶3)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Jiri okwu a kpụ n’ọnụ malite izi onye nwe ụlọ ozi ọma, gị esizie na Baịbụl gwa ya ihe ga-aka abara ya uru. (lmd isi nke 2 nọmba nke 5)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gwa ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 8 nọmba nke 3)

6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

(Nkeji 5) Gị na onye ị na-amụrụ Baịbụl nke na-anaghị eme nke ọma kparịta ụka. (lmd isi nke 12 nọmba nke 5)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 76

7. Ka Obi Sie Gị Ike Ka Jeremaya

(Nkeji 6) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Kpọnye VIDIO Bụ́ Mụta Ihe n’Aka Ndị Enyi Jehova​—Jeremaya. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Olee otú Jeremaya si bụrụ enyi Jehova?​—Jere. 1:6-8

  • Ònye ka ị ga-achọ ịkọrọ gbasara Jehova?

  • Gịnị ka ị ga-ekwu iji nyere onye ahụ aka ka ọ bụrụ enyi Jehova?

8. ‘Meda Obi Ma Ị Zawa Mmadụ Ajụjụ, Kwanyekwara Ya Ezigbo Ùgwù’

(Nkeji 9) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Anyị kwesịrị iji obi ike na-ekwusa ozi ọma ma na-agwa ndị mmadụ ụdị ndụ Jehova chọrọ ka ha na-ebi. Ma, ka anyị ji obi ike na-agwa ha okwu, e nwekwara àgwà ndị ọzọ anyị kwesịrị ịna-akpa.

Gụọ 1 Pita 3:15. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Olee àgwà ndị ọzọ anyị kwesịrị ịkpa mgbe anyị na-akọwara ndị mmadụ ihe anyị kweere?

  • Gịnị mere àgwà ndị a ji dị ezigbo mkpa?

Kpọnye VIDIO Bụ́ “Ezi Omume A Ga Na-eme Ga-eme Ka Udo Dị.” Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Gịnị ka ị mụtara na vidio a ga-enyere gị aka iji akọ kọwaa ihe i kweere gbasara nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ?

CHETA na mgbe ị na-agwa ndị mmadụ ihe ndị Jehova na-achọghị ka anyị na-eme, etinyela ọnụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.​—Jọn 18:36.

9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) lfb isi nke 90-91

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 18 na Ekpere