Jun 1-7
JEREMAYA 1-3
Abụ nke 84 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
Ebe Jeremaya na-agwa ndị na-ekpe okpukpe ụgha nọ na Jeruselem ihe Jehova kpebiri ime ha
1. ‘Atụla Ụjọ, n’Ihi na Anọnyeere M Gị’
(Nkeji 10)
[Kpọnye VIDIO Bụ́ Ihe Akwụkwọ Jeremaya Na-ekwu.]
Otú ọ dị Jeremaya ka ọ dị ụfọdụ ndị taa. Ụjọ na-atụ ha ikwusa ozi ọma, ma ọ bụkwanụ ha ana-eche na ha erughị eru (Jere. 1:6)
Jehova na-eme ka anyị ruo eruo ime uche ya, ọ na-emekwa ka obi sie anyị ike ime ya (Jere. 1:8, 9; w10 1/15 9 ¶7-8)
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
-
Jere. 2:28—Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe Jehova gwara ndị bi na Juda nupụụrụ ya isi? (jr 43 ¶3)
-
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Jere. 3:14-25 (th ihe ọmụmụ nke 12)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Jiri okwu a kpụ n’ọnụ malite izi onye nwe ụlọ ozi ọma, gị esizie na Baịbụl gwa ya ihe ga-aka abara ya uru. (lmd isi nke 2 nọmba nke 5)
5. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gwa ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 8 nọmba nke 3)
6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
(Nkeji 5) Gị na onye ị na-amụrụ Baịbụl nke na-anaghị eme nke ọma kparịta ụka. (lmd isi nke 12 nọmba nke 5)
Abụ nke 76
7. Ka Obi Sie Gị Ike Ka Jeremaya
(Nkeji 6) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Kpọnye VIDIO Bụ́ Mụta Ihe n’Aka Ndị Enyi Jehova—Jeremaya. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:
-
Olee otú Jeremaya si bụrụ enyi Jehova?—Jere. 1:6-8
-
Ònye ka ị ga-achọ ịkọrọ gbasara Jehova?
-
Gịnị ka ị ga-ekwu iji nyere onye ahụ aka ka ọ bụrụ enyi Jehova?
8. ‘Meda Obi Ma Ị Zawa Mmadụ Ajụjụ, Kwanyekwara Ya Ezigbo Ùgwù’
(Nkeji 9) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Anyị kwesịrị iji obi ike na-ekwusa ozi ọma ma na-agwa ndị mmadụ ụdị ndụ Jehova chọrọ ka ha na-ebi. Ma, ka anyị ji obi ike na-agwa ha okwu, e nwekwara àgwà ndị ọzọ anyị kwesịrị ịna-akpa.
Gụọ 1 Pita 3:15. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:
-
Olee àgwà ndị ọzọ anyị kwesịrị ịkpa mgbe anyị na-akọwara ndị mmadụ ihe anyị kweere?
-
Gịnị mere àgwà ndị a ji dị ezigbo mkpa?
Kpọnye VIDIO Bụ́ “Ezi Omume A Ga Na-eme Ga-eme Ka Udo Dị.” Jụzie ụmụnna ajụjụ a:
-
Gịnị ka ị mụtara na vidio a ga-enyere gị aka iji akọ kọwaa ihe i kweere gbasara nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ?
CHETA na mgbe ị na-agwa ndị mmadụ ihe ndị Jehova na-achọghị ka anyị na-eme, etinyela ọnụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.—Jọn 18:36.
9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) lfb isi nke 90-91

