Mee 19-25

ILU 14

Mee 19-25

Abụ nke 89 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Chebara Ihe Ọ Bụla Ị Chọrọ Ime Echiche Ma E Nwee Ọdachi

(Nkeji 10)

Kpachara anya ka ị ghara ikwere “ihe niile” ị nụrụ (Ilu 14:15; w23.02 23 ¶10-12)

Ekpebila ihe ị ga-eme naanị n’ihi otú obi dị gị ma ọ bụ n’ihi ihe mere gị n’oge gara aga (Ilu 14:12)

Egela ndị na-ajụ ntụziaka nzukọ Jehova na-enye ntị (Ilu 14:7)

AJỤJỤ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Ndị okenye, ùnu dị njikere iso ntụziaka na ịtụkwasị Jehova obi ma e nwee ọdachi?​—w24.07 5 ¶11.

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ilu 14:17​—Olee ụzọ ndị o nwere ike isi bụrụ na a kpọrọ “onye na-echebara ihe echiche” asị? (it-2 1094)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Jiri ihe si na Baịbụl zie onye gwara gị na ya na-echegbu onwe ya n’ihi ihe isi ike ozi ọma. (lmd isi nke 3 nọmba nke 3)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Nye ya magazin kwuru banyere ihe masịrị ya n’oge ikpeazụ unu kwurịtara okwu. (lmd isi nke 9 nọmba nke 4)

6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

(Nkeji 5) Gbaa onye ị na-amụrụ ihe ume ka ọ na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, gosikwa ya otú ọ ga na-esi eme ya. (th ihe ọmụmụ nke 19)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 126

7. Dị Njikere Maka Ọdachi

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Ọ bụ okenye ga-eme ihe omume a. Gwakwa ụmụnna ihe alaka ụlọ ọrụ na ndị okenye kwuru gbasara ịkwadebe maka ọdachi, ma ọ bụrụ na e nwere ihe ha kwuru.

Ka anyị na-atachi obi ‘n’oge ikpeazụ a,’ anyị na-atụ anya na ihe ga na-akakwu njọ. (2 Tim. 3:1; Mat. 24:8) Ndị Jehova na-enwetakarị ntụziaka nwere ike ịzọ ha ndụ tupu e nwee ọdachi ma ọ bụkwanụ n’oge e nwere ọdachi. Ihe nwere ike ịzọ anyị ndụ ma mee ka okwukwe anyị sie ike ma ụdị ihe a mee bụ irube isi na ịkwadebe akwadebe ugbu a.​—Ilu 14:6, 8.

  • Mee ka okwukwe gị sikwuo ike: Na-amụchi ihe anya, na-agụchikwa Baịbụl anya. Gbalịa na-abụkwu aka ochie n’isi n’ụzọ dị iche iche ekwusa ozi ọma. Ekwela ka ụjọ jide gị ma e nwee mgbe gị na ndị ọgbakọ unu na-anọghịzi otu ebe. (Ilu 14:30) E nweghị ihe ga-ekewapụ gị n’ebe Jehova Chineke na Kraịst Jizọs nọ.​—od 176 ¶15-17

  • Kwadebe akwadebe iji zọọ onwe gị ndụ: E wepụ inwe akpa ndị e tinyere ihe ndị a ga-eji agbapụ n’oge nsogbu, ezinụlọ ọ bụla kwesịkwara idowe nri na mmiri butụrụ ibu n’ụlọ, nweekwa ọgwụ na ihe ndị yiri ha, a dịghị ama ama ya bụrụ na ha agaghị apụta èzí ruo oge ụfọdụ.​—Ilu 22:3; g17.5 4

Kpọnye VIDIO Bụ́ Ì Jikerela Maka Ọdachi? Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  •   Olee otú Jehova nwere ike isi nyere anyị aka ma e nwee ọdachi?

  •   Olee ihe ndị anyị nwere ike ime iji kwadebe maka ọdachi?

  •   Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka ma e nwee ọdachi?

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) w23 Mach, Isiokwu A Na-amụ Amụ nke 10, Gịnị Mere Ị Ga-eji Mee Baptizim? ¶1-10 na igbe dị na peeji nke 4

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 116 na Ekpere