Mee 12-18

ILU 13

Mee 12-18

Abụ nke 34 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Ekwela Ka “Ọkụ Ndị Ajọ Omume” Megharịa Gị Anya

(Nkeji 10)

Ihe agaghị adịrị ndị ajọ omume mma n’ọdịnihu (Ilu 13:9; it-2 196 ¶2-3)

Gị na ndị na-eme ka ihe ọjọọ yie ihe ọma akpakọrịtala (Ilu 13:20; w12 7/15 12 ¶3)

Jehova na-agọzi onye ezi omume (Ilu 13:25; w04 7/15 31 ¶6)

Ndị na-achụ ihe ndị na-agụ ụmụ mmadụ agụụ anaghị enwe obi ụtọ otú o yiri ka hà na-enwe. Ma, ndị na-eme uche Jehova na-enwe ezigbo obi ụtọ

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ilu 13:24​—Olee ndụmọdụ amaokwu a na-enye anyị gbasara ịhụnanya na-ekwesịghị ekwesị? (it-2 276 ¶2)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Jiri okwu a kpụ n’ọnụ malite izi ya ozi ọma, gị esizie na Baịbụl gwa ya ihe ga-aka abara ya uru. (lmd isi nke 2 nọmba nke 5)

5. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Kpọọ onye ahụ ka ọ bịa ọmụmụ ihe. (lmd isi nke 2 nọmba nke 3)

6. Okwu

(Nkeji 5) lmd ihe ndị ọzọ a kọwara nke A nọmba nke 9​—Isiokwu: Ihe Ga-agaziri Ụmụaka Na-asọpụrụ Nne na Nna Ha ma Na-erubere Ha Isi. (th ihe ọmụmụ nke 16)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 77

7. “Ìhè Ndị Ezi Omume Na-enwusi Ike”

(Nkeji 8) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Amamihe dị n’Okwu Chineke nakwa ihe ndị ọzọ a na-amụta na ya enweghị oyiri. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka ọ na-eduzi anyị, ihe ga-agaziri anyị ná ndụ, anyị ga-enwekwa obi ụtọ karịa. Ụwa a enweghị ike imere anyị ya.

Kpọnye VIDIO Bụ́ Ụwa Agaghị Enyeli Gị Ihe Ọ Na-enweghị. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Olee otú ihe mere Nwanna nwaanyị Gainanshina si egosi na “ìhè ndị ezi omume” ka “ọkụ ndị ajọ omume” mma?​—Ilu 13:9

Ya enwela mgbe ị ga-eji oge gị na-eche gbasara ihe ndị dị n’ụwa a ma ọ bụ na-akwa mmakwaara maka mkpebi ndị i merela bụ́ ndị nyeere gị aka ife Jehova. (1 Jọn 2:15-17) Kama ime otú ahụ, lekwasị anya n’otú ihe ndị ị mụtarala si ‘baara gị ezigbo uru.’​—Fil. 3:8.

8. Mkpa Ọgbakọ

(Nkeji 7)

9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) w23 Febụwarị, Isiokwu A Na-amụ Amụ nke 9, Jiri Ndụ Chineke Nyere Anyị Kpọrọ Ihe ¶10-18

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 43 na Ekpere