Mach 9-15
AỊZAYA 43-44
Abụ nke 63 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Amụma E Dere Ihe Dị Ka Narị Afọ Abụọ Tupu Ya Emezuo
(Nkeji 10)
A ga-eme ka osimiri ndị dị na Babịlọn “taa” (Aịza. 44:27; lff isi nke 3 nọmba nke 5)
Onye na-achị ndị Peshia aha ya bụ Saịrọs ga-abụrụ Chineke “onye ọzụzụ atụrụ” (Aịza. 44:28a; it “Saịrọs” ¶7)
Saịrọs ga-enye iwu ka ndị Chineke laghachi Jeruselem iji rụghachi ya na ụlọ nsọ ya (Ezra 1:1-3; Aịza. 44:28b; it “Saịrọs” ¶17)
IHE Ị GA-EMERE NCHỌNCHỌ: Olee otú Saịrọs si mezuo ihe e dere n’Aịzaya 45:1-4?
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Aịza. 44:28—Olee otú anyị si mara na Jehova amanyeghị Saịrọs ime uche ya? (w24.02 30 ¶8)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Aịza. 44:9-20 (th ihe ọmụmụ nke 10)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(1 nkeji) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Nye ya akwụkwọ anyị ji akpọ ndị mmadụ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. (lmd isi nke 4 nọmba nke 3)
5. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Kpọọ onye ị ma ka ọ bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. (lmd isi nke 3 nọmba nke 4)
6. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Gwa onye ị na-arụrụ ọrụ ka o nye gị ohere ka ị gaa Ncheta Ọnwụ Jizọs. (lmd isi nke 6 nọmba nke 3)
7. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gwa onye nataburu gị akwụkwọ i ji kpọọ ya ka ọ bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 7 nọmba nke 4)
Abụ nke 69
8. Mkpa Ọgbakọ
(Nkeji 15)
9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) lfb okwu mmalite nkebi nke 11 na isi nke 68-69

