Mach 2-8
AỊZAYA 41-42
Abụ nke 8 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. “Atụla Egwu”
(Nkeji 10)
Jehova ga-eme ka e nwee “onye si ebe ọwụwa anyanwụ,” onye ga-eme ka ndị mmadụ maa jijiji (Aịza. 41:2, 5; ip-2 20 ¶10)
Ma, ndị na-efe Jehova ekwesịghị ịtụ egwu (Aịza. 41:10; ijwbv isiokwu nke 5 ¶4-7)
Jehova ga-enyere ha aka (Aịza. 41:13)
AJỤJỤ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Olee otú amụma dị n’Aịzaya isi 41 si enyere Ndị Kraịst aka taa?—w16.07 18 ¶4-5.
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Aịza. 41:8—Olee otú Jehova si gosi na Ebreham bụ enyi ya? (w01 10/1 20 ¶3)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Aịza. 42:1-13 (th ihe ọmụmụ nke 11)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Onye i ziri ozi ọma natara akwụkwọ i ji kpọọ ya ka ọ bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs, gosikwa na o nwere mmasị ịbịa. (lmd isi nke 6 nọmba nke 4)
5. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Kpọọ onye ikwu gị ka ọ bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs, jirikwa jw.org gosi ya ebe dị ya nso a ga-anọ eme ya. (lmd isi nke 3 nọmba nke 5)
6. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere
(Nkeji 5) Okwu. ijwbq isiokwu nke 60—Isiokwu: Olee Otú Ị Ga-esi Kwụsị Ịtụ Ụjọ Ọnwụ? (th ihe ọmụmụ nke 1)
Abụ nke 19
7. A Ga-ebido Ịkpọ Ndị Mmadụ Ka Ha Bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs na Satọdee, Mach 7
(Nkeji 5) Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-ekwu okwu a. Kwuo nhazi ọgbakọ unu mere maka ịkpọ ndị mmadụ òkù, maka okwu ihu ọha pụrụ iche, nakwa maka Ncheta Ọnwụ Jizọs. Gbaa ndị nkwusa niile ume ka ha gbakwuo mbọ n’ozi ọma n’ọnwa Mach na Eprel. Ndị nkwusa ndị ga-arụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa ndị a nwere ike inye awa iri na ise.
8. Ihe Nzukọ Jehova Na-eme nke Ọnwa Mach
(Nkeji 10) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Kpọnye VIDIO. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị gbara na vidio a.
9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) lfb isi nke 66-67

