Eprel 20-26

AỊZAYA 54-55

Eprel 20-26

Abụ nke 86 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Olee Ihe Ndị Ị Dị Njikere Ime Ka Jehova Kụziere Gị Ihe?

(Nkeji 10)

Jehova kwere nkwa na ya ga-akụziri ụmụ ya ihe (Aịza. 54:13; w09 9/15 21 ¶3)

Anyị ga-ewepụtarịrị oge tupu anyị amụta eziokwu ndị dị na Baịbụl (Aịza. 55:1, 2; w18.11 4 ¶6-7)

Anyị ga-agbarịrị mbọ iji na-ege ntị nke ọma mgbe Jehova na-akụziri anyị ihe. Ma, ime otú ahụ ga-azọ anyị ndụ (Aịza. 55:3; be 14 ¶2-4)

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee ihe ndị m ga-eme ka m na-amụkwu ihe nke ọma?’

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Aịza. 54:17​—Olee ihe atọ dị mkpa ahịrịokwu nke mbụ n’amaokwu a na-echetara anyị? (w19.01 6 ¶14-15)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 2) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Kụziere mmadụ otu n’ime eziokwu ndị dị n’ihe ndị ọzọ a kọwara nke A na broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya. (lmd isi nke 1 nọmba nke 4)

5. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 2) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Kụziere mmadụ otu n’ime eziokwu ndị dị n’ihe ndị ọzọ a kọwara nke A na broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya. (lmd isi nke 2 nọmba nke 3)

6. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 2) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Nye onye ahụ kaadị jw.org. (lmd isi nke 9 nọmba nke 3)

7. Okwu

(Nkeji 5) be 28 ¶3–31 ¶2​—Isiokwu: Otú E Si Amụ Ihe. (th ihe ọmụmụ nke 14)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 97

8. Merie Ihe Ndị Nwere Ike Igbochi Gị Ịna-amụ Ihe

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

E nwere ọtụtụ ihe nwere ike ime ka mmadụ ghara ịna-amụchi ihe anya. Weregodị ya na ị chọrọ ịgba nwanna ọ na-esiri ike ịna-amụchi ihe anya nakwa ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị ume. Ọ gwara gị ihe ndị e dere n’okpuru ebe a, ndị na-egbochi ya ịna-amụchi ihe anya. Ná nke ọ bụla n’ime ha, dee otu aro bara uru, otu ihe Baịbụl kwuru, ma ọ bụ otu ihe e kwuru n’akwụkwọ anyị, ma ọ dịkarịa ala, ga-enyere ya aka ịna-amụchi ihe anya.

  • “Amachaghị m agụ ihe”

  • “Ịmụ ihe anaghị atọ m ụtọ”

  • “Amaghị m ebe m ga-ebido gụwa na Baịbụl ma ọ bụkwanụ ebe m ga-agụru n’ụbọchị ọ bụla”

  • “Ihe a ga-amụ amụ karịrị akarị. Amaghị m nke m ga-amụ n’izu ọ bụla”

  • “Ọrụ zuru m ahụ́, anaghị m enwe ohere ịmụ ihe”

  • “Uche m anaghị adịkarị n’ihe m na-amụ, mgbe ụfọdụ, anaghịkwa m echeta ihe m gụrụ”

Kpọnye VIDIO Bụ́ Na-amụ Ihe nke Ọma. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Olee nke kacha masị gị n’ime aro ndị a tụrụ banyere otú ị ga-esi na-amụkwu ihe nke ọma?

9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) lfb isi nke 78-79

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 70 na Ekpere