Mach 3-9

ILU 3

Mach 3-9

Abụ nke 8 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Gosi na Ị Tụkwasịrị Jehova Obi

(Nkeji 10)

Tụkwasị Jehova obi, ọ bụghị onwe gị (Ilu 3:5; ijwbv isiokwu nke 14 ¶4-5)

Gosi na ị tụkwasịrị Jehova obi. Otú ị ga-esi egosi ya bụ ịchọ ka ọ na-eduzi gị na isoro nduzi ya (Ilu 3:6; ijwbv isiokwu nke 14 ¶6-7)

Echekwala na ị marachaala ihe niile (Ilu 3:7; be 76 ¶4)

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘M̀ na-achọ ka Jehova na-eduzi m n’ihe niile m na-eme ná ndụ m?’

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ilu 3:3​—Olee otú anyị nwere ike isi yiri ịhụnanya na ịbụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi ka ihe olu, deekwa ha edee n’obi anyị? (w06 9/15 17 ¶6)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Zaghachi onye kwuru ihe ndị na-achọghị ịnụ ozi ọma na-ekwukarị. (lmd isi nke 1 nọmba nke 5)

5. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 4) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Gwa onye ahụ gbasara jw.org, nyekwa ya kaadị jw.org. (lmd isi nke 3 nọmba nke 3)

6. Okwu

(Nkeji 5) w11 3/15 14 7-10​—Isiokwu: Gosi na Ị Tụkwasịrị Chineke Obi Mgbe Ndị Mmadụ Na-enweghị Mmasị n’Ozi Ọma Ị Na-ezisa. (th ihe ọmụmụ nke 20)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 124

7. Gosi na Ị Tụkwasịrị Nzukọ Jehova Obi

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

O nwere ike ịdịtụrụ anyị mfe ịtụkwasị ntụziaka si n’Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl e si n’ike mmụọ nsọ dee, obi. Ma, o nwere ike ịka siere anyị ike ịtụkwasị ntụziaka si n’aka ndị mmadụ na-ezughị okè na-eduzi nzukọ Jehova obi, karịchaa, ma ọ bụrụ na anyị aghọtaghị ntụziaka ha nyere ma ọ bụ na ọ dịchaghị anyị mma.

Gụọ Malakaị 2:7. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Gịnị mere na o jughị anyị anya na Jehova na-eji ụmụ mmadụ na-ezughị okè eduzi ndị ya?

Gụọ Matiu 24:45. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Gịnị mere anyị ji kwesị ịtụkwasị ntụziaka nzukọ Jehova na-enye anyị obi?

Gụọ Ndị Hibru 13:17. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-akwado mkpebi ndị Jehova họpụtara idu ndị ya na-eme?

Kpọnye Vidio Si na Vidio Bụ́ Akụkọ Si n’Aka Òtù Na-achị Isi Maka Afọ 2021​—Agba nke 9. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Olee otú ntụziaka anyị nwetara n’oge ọrịa koronavaịrọs si mee ka ị tụkwasịkwuo nzukọ Jehova obi?

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 57 na Ekpere