Eprel 7-13

ILU 8

Eprel 7-13

Abụ nke 89 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Gee Ntị n’Amamihe Jizọs

(Nkeji 10)

Jehova kere Jizọs, onye a kpọrọ amamihe n’akwụkwọ Ilu, ya “abụrụ mmalite ụzọ ya” (Ilu 8:1, 4, 22; cf 131 ¶7)

Amamihe Jizọs nọ na-ebukwu ibu, ya ana-ahụkwukwa Nna ya bụ́ Jehova n’anya n’oge niile o so ya na-eke ihe (Ilu 8:30, 31; cf 131-132 ¶8-9)

Amamihe Jizọs ga-abara anyị uru ma ọ bụrụ na anyị ana-ege ya ntị (Ilu 8:32, 35; w09 4/15 31 ¶14)

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ilu 8:1-3​—Olee otú o si bụrụ na amamihe “na-eti mkpu n’oké olu”? (g 7/14 p. 16)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Zaa onye na-eche echiche ịbịa Ncheta Ọnwụ Jizọs ajụjụ ndị ọ jụrụ gbasara otú anyị si eme Ncheta Ọnwụ Jizọs. (lmd isi nke 9 nọmba nke 3)

5. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Nabata onye bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs maka na ọ hụrụ akwụkwọ ịkpọ òkù n’ọnụ ụzọ ụlọ ya. Nyekwara ya aka ma a gbasaa. (lmd isi nke 3 nọmba nke 5)

6. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere

(Nkeji 5) Okwu. ijwbq isiokwu nke 160​—Isiokwu: Gịnị Mere E Ji Kpọọ Jizọs Ọkpara Chineke? (th ihe ọmụmụ nke 1)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 105

7. Mkpa Ọgbakọ

(Nkeji 15)

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30)w23 Febụwarị, Isiokwu A Na-amụ Amụ nke 6  Ihe Baịbụl Na-akụziri Anyị Gbasara Onye E Dere Uche Ya na Ya ¶1-10

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 7 na Ekpere