Eprel 21-27

ILU 10

Eprel 21-27

Abụ nke 76 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Gịnị Ga-eme Ka Ndụ Na-atọ Anyị Ezigbo Ụtọ?

(Nkeji 10)

Ịgba mbọ n’ọrụ ikwusa ozi ọma so n’ihe ga-eme ka ndụ na-atọ anyị ezigbo ụtọ (Ilu 10:4, 5; w01 7/15 24 ¶8 25 ¶1-2)

Ezi omume bara uru karịa akụnụba (Ilu 10:15, 16; w01 9/15 24 ¶3-4)

Ọ bụ ngọzi Jehova ga-eme ka ndụ na-atọ anyị ezigbo ụtọ (Ilu 10:22; it-1 340)

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ilu 10:22​—Ebe ọ bụ na e nweghị nsogbu ya na ngọzi Jehova na-eso, gịnị mere ọtụtụ ọnwụnwa ji abịara ndị na-efe Chineke? (w06 5/15 30 ¶18)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Onye ahụ gwara gị na ya ekweghị na Chineke. (lmd isi nke 4 nọmba nke 3)

5. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Gwa ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 4 nọmba nke 4)

6. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Gosi onye ahụ otú ọ ga-esi chọta ihe ga-amasị ya na jw.org. (lmd isi nke 9 nọmba nke 4)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 111

7. Olee Ngọzi Ndị Na-eme Ndị Na-efe Chineke Ọgaranya?

(Nkeji 7) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Ngọzi Jehova na-agọzi ndị na-efe ya n’oge ikpeazụ a nke siri ike na-enyere anyị aka ịnọgide na-efe ya, na-emekwa ka ndụ anyị ka mma. (Ọma 4:3; Ilu 10:22) Gụọnụ amaokwu ndị e dere n’okpuru. Jụzie ụmụnna otú ngọzi nke ọ bụla si eme ka anyị baa ọgaranya.

Ụfọdụ ndị na-ejekwuru Jehova ozi ugbu a karịa ka ha na-emebu, nke mere ka ha na-enwekwu obi ụtọ.

Kpọnye VIDIO Bụ́ Ndị Na-eto Eto​—Họrọnụ Ụzọ Ga-eme Ka Unu Nwee Udo Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Harley, Anjil, na Carlee?

8. Akụkọ Si n’Aka Ndị Na-ahụ Maka Ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Afọ 2025

(Nkeji 8) Okwu. Kpọnye VIDIO.

9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) w23 Febụwarị, Isiokwu A Na-amụ Amụ nke 7 Mee Ka Baịbụl Ị Na-agụ Na-abakwuru Gị Uru ¶1-8

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 115 na Ekpere