Mach 31–Eprel 6

ILU 7

Mach 31–Eprel 6

Abụ nke 34 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Zere Ihe Ndị Nwere Ike Ime Ka A Rata Gị Ime Omume Rụrụ Arụ

(Nkeji 10)

Otu nwa okorobịa na-enweghị uche kpachaara anya gara banye n’ógbè ndị akwụna (Ilu 7:7-9; w00 11/15 29 ¶5)

Otu nwaanyị akwụna gakwuuru ya ka ọ rata ya ka ha kwaa iko (Ilu 7:10, 13-21; w00 11/15 30 ¶4-6)

Ebe ahụ nwa okorobịa ahụ gara mere ka a rata ya, ya emebie mmekọrịta ya na Jehova (Ilu 7:22, 23; w00 11/15 31 ¶2)

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ilu 7:3​—Gịnị ka ike iwu Chineke ná mkpịsị aka anyị na ide ha n’obi anyị pụtara? (w00 11/15 29 ¶1)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Mgbe ikpeazụ ị gara na nke onye nwe ụlọ, ọ natara akwụkwọ i ji kpọọ ya ka ọ bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs, gosikwa na o nwere mmasị. (lmd isi nke 9 nọmba nke 5)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Mgbe ikpeazụ gị na onye ahụ kparịtara, ọ natara akwụkwọ i ji kpọọ ya ka ọ bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs, gosikwa na o nwere mmasị. (lmd isi nke 9 nọmba nke 4)

6. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Mgbe ikpeazụ gị na onye ahụ kparịtara, ọ natara akwụkwọ i ji kpọọ ya ka ọ bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs, gosikwa na o nwere mmasị. (lmd isi nke 9 nọmba nke 3)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 13

7. Oge Ọzọ Ga-adaba Adaba (Luk 4:6)

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Kpọnye VIDIO. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Olee otú Ekwensu si nwaa Jizọs ọnwụnwa, oleekwa otú e nwere ike isi nwaa anyị ụdị ọnwụnwa ahụ?

  • Olee otú anyị nwere ike isi merie ọnwụnwa Ekwensu?

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) w23 Janụwarị, Isiokwu A Na-amụ Amụ nke 1 Obi Sie Gị Ike na ‘Okwu Chineke Bụ Eziokwu’ ¶10-17

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 70 na Ekpere