Jenụwarị 5-11
AỊZAYA 17-20
Abụ nke 153 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Ihe “A Ga-eme Ndị Meriri Anyị”
(Nkeji 10)
Baịbụl ji ndị mmadụ tụnyere oké osimiri nke na-amali elu (Aịza. 17:12; w18.06 7 ¶16)
Anyị na-atụ anya na ndị mmadụ ga na-emegide anyị maka na anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa n’esemokwu ụwa a (Jọn 15:18, 19; w16.04 22 ¶4)
N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-anapụta anyị n’aka “ndị meriri anyị” (Aịza. 17:13, 14; ip-1 198 ¶20)
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
-
Aịza. 20:2—Aịzaya ọ̀ gba ọtọ n’eziokwu na-agagharị ruo afọ atọ? (w06 12/1 11 ¶1)
-
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Aịza. 19:1-12 (th ihe ọmụmụ nke 11)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Kụziere onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye otu n’ime eziokwu ndị dị n’ihe ndị ọzọ a kọwara nke A na broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya. (lmd isi nke 2 nọmba nke 3)
5. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gwa ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 8 nọmba nke 4)
6. Okwu
(Nkeji 5) lmd ihe ndị ọzọ a kọwara nke A nọmba nke 14—Isiokwu: Chineke Chọrọ Ka Anyị Na-ekpe Ekpere, Na-akọrọ Ya Mkpa Anyị. (th ihe ọmụmụ nke 8)
Abụ nke 148
7. ‘Cheta Oké Nkume, Bụ́ Ebe Anyị A Rụsiri Ike’
(Nkeji 10) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Jehova bụ Oké Nkume bụ́ ebe anyị a rụsiri ike. (Aịza. 17:10) Ọ na-anapụta ndị gbabara n’ime ya. (Ọma 144:1, 2) Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị mgbe niile ka Jehova na-egbochi mmegide a na-emegide anyị, ma o nweghị mgbe ọ na-anaghị enye ndị enyi ya ihe ga-enyere ha aka idi mmegide.—1 Kọr. 10:13.
Otu ụzọ anyị si egosi na anyị na-echeta Jehova bụ ịna-erubere ya isi. Kpọnye VIDIO Bụ́ Mụta Ihe n’Aka Ndị Enyi Jehova—Hananaya, Mishel, na Azaraya. Gwa ụmụaka ị họọrọ ka ha gbagote n’elu ikpo okwu ka ị jụọ ha ajụjụ ndị a, ma ọ bụ gị ajụọ ha ụmụnna:
-
Olee otú Jehova si napụta ndị enyi ya?—Dan. 3:24-28
-
Olee otú Hananaya, Mishel, na Azaraya si gosi na ha bụ ndị enyi Jehova?
-
Olee mgbe ọ na-esiri gị ike irubere Jehova isi?
-
Olee ihe ị ga-eme ka ị na-erubere Jehova isi?
8. Wepụta Oge Kwa Ụbọchị Ka Ị Mụta Ihe n’Aka Ndị Enyi Jehova
(Nkeji 5) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
E wepụtara vidio ndị a kpọrọ Mụta Ihe n’Aka Ndị Enyi Jehova maka ụmụaka ndị na-amụ otú e si agụ ihe. Ọ na-akụziri ha gbasara ndị hụrụ Jehova n’anya. Vidio nke ọ bụla n’ime ha na-agba ụmụaka ume ka ha ‘wepụta oge kwa ụbọchị ka ha mụta ihe n’aka ndị enyi Jehova.’
-
Olee otú ị ga-esi na-ewepụta oge kwa ụbọchị ka ị mụta gbasara Jehova na ndị enyi ya?
-
Olee ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl ị ga-achọ ịmụtakwu gbasara ha? Ọ̀ bụ maka gịnị?
9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) lfb isi nke 50, okwu mmalite nkebi nke 9, na isi nke 51

