Jenụwarị 26–Febụwarị 1
AỊZAYA 28-29
Abụ nke 28 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Jiri Ọnụ Gị na Obi Gị Na-asọpụrụ Jehova
(Nkeji 10)
Aịzaya baara ndị isi okpukpe e nwere n’oge ya mba maka na ha bụ ndị ihu abụọ (Aịza. 29:13; ip-1 299 ¶23)
Jizọs gwara ndị isi okpukpe e nwere n’oge ọ nọ n’ụwa otu ihe ahụ Aịzaya kwuru (Mat. 15:7-9; w21.05 9 ¶7)
Jehova chọrọ ka ndị na-efe ya ‘jiri obi ha na-erubere ya isi’ (Rom 6:17; w24.06 10 ¶8)
Jehova na-ahụ mgbe anyị na-eme ihe anyị na-ekwusa, ọ na-emekwa ya obi ụtọ
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
-
Aịza. 29:1—Gịnị mere o ji daba adaba na a kpọrọ Jeruselem Ariel? (it “Ariel” ¶1; it “Ariel” Nke 3)
-
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Aịza. 29:13-24 (th ihe ọmụmụ nke 2)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 2) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Chọpụta isiokwu ga-amasị onye ahụ. Mee ndokwa otú ị ga-esi akpọtụrụ ya mgbe ọzọ. (lmd isi nke 1 nọmba nke 5)
5. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Zaa ajụjụ onye ahụ jụrụ n’oge gara aga unu kwurịtara okwu. (lmd isi nke 9 nọmba nke 3)
6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
(Nkeji 2) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gwa ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 10 nọmba 3)
7. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
Abụ nke 89
8. “M Na-eme Ihe Dị Ya Mma Mgbe Niile”
(Nkeji 8) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
E nwere mgbe Jizọs kwuru, sị: “M na-eme ihe dị [Jehova] mma mgbe niile.” (Jọn 8:29) Anyị na-eme ka Jizọs, na-agbalị ike anyị niile ịna-eme ihe otú Jehova kwuru. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ọ bụghị mgbe niile ka ọ ga-adịrị anyị mfe ime otú ahụ, ma ime ya na-abara anyị uru mgbe niile.
Kpọnye VIDIO Bụ́ Na-eme Ihe Otú Jehova Kwuru. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:
-
Gịnị ka anyị mụtara gbasara ịna-eme ihe otú Jehova kwuru mgbe a na-akpagbu anyị, mgbe a na-anwa anyị ka anyị mee omume rụrụ arụ, ma ọ bụ mgbe mpako chọrọ ime ka onwe anyị buwe anyị isi?
9. Mkpa Ọgbakọ
(Nkeji 7)
10. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) lfb isi nke 56, okwu mmalite nkebi nke 10, na isi nke 57

