Jenụwarị 26–Febụwarị 1

AỊZAYA 28-29

Jenụwarị 26–Febụwarị 1

Abụ nke 28 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Jiri Ọnụ Gị na Obi Gị Na-asọpụrụ Jehova

(Nkeji 10)

Aịzaya baara ndị isi okpukpe e nwere n’oge ya mba maka na ha bụ ndị ihu abụọ (Aịza. 29:13; ip-1 299 ¶23)

Jizọs gwara ndị isi okpukpe e nwere n’oge ọ nọ n’ụwa otu ihe ahụ Aịzaya kwuru (Mat. 15:7-9; w21.05 9 ¶7)

Jehova chọrọ ka ndị na-efe ya ‘jiri obi ha na-erubere ya isi’ (Rom 6:17; w24.06 10 ¶8)

Jehova na-ahụ mgbe anyị na-eme ihe anyị na-ekwusa, ọ na-emekwa ya obi ụtọ

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Aịza. 29:1​—Gịnị mere o ji daba adaba na a kpọrọ Jeruselem Ariel? (it “Ariel” ¶1; it “Ariel” Nke 3)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 2) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Chọpụta isiokwu ga-amasị onye ahụ. Mee ndokwa otú ị ga-esi akpọtụrụ ya mgbe ọzọ. (lmd isi nke 1 nọmba nke 5)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Zaa ajụjụ onye ahụ jụrụ n’oge gara aga unu kwurịtara okwu. (lmd isi nke 9 nọmba nke 3)

6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

(Nkeji 2) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gwa ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 10 nọmba 3)

7. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 89

8. “M Na-eme Ihe Dị Ya Mma Mgbe Niile”

(Nkeji 8) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

E nwere mgbe Jizọs kwuru, sị: “M na-eme ihe dị [Jehova] mma mgbe niile.” (Jọn 8:29) Anyị na-eme ka Jizọs, na-agbalị ike anyị niile ịna-eme ihe otú Jehova kwuru. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ọ bụghị mgbe niile ka ọ ga-adịrị anyị mfe ime otú ahụ, ma ime ya na-abara anyị uru mgbe niile.

Kpọnye VIDIO Bụ́ Na-eme Ihe Otú Jehova Kwuru. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Gịnị ka anyị mụtara gbasara ịna-eme ihe otú Jehova kwuru mgbe a na-akpagbu anyị, mgbe a na-anwa anyị ka anyị mee omume rụrụ arụ, ma ọ bụ mgbe mpako chọrọ ime ka onwe anyị buwe anyị isi?

9. Mkpa Ọgbakọ

(Nkeji 7)

10. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 55 na Ekpere