Jenụwarị 19-25
AỊZAYA 24-27
Abụ nke 159 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. “Onye A Bụ Chineke Anyị”
(Nkeji 10)
E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji jiri Chineke anyị, bụ́ Jehova, na-anya isi (Aịza. 25:9; cl 15 ¶21)
E nwere ọtụtụ ihe o kwere nkwa na ọ ga-emere anyị n’ụwa ọhụrụ. Otu n’ime ha bụ na ọ ga-enye anyị ezigbo nri n’ụba (Aịza. 25:6; w24.12 6 ¶14)
Ọ ga-enye anyị ndụ ebighị ebi (Aịza. 25:7, 8; w25.01 28-29 ¶11-12)
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘M mewe ihe ndị dịịrị m n’izu a, ònye ka m ga-akọrọ nkwa ndị Jehova kwere?’
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
-
Aịza. 24:2—Gịnị bụ otu n’ime ihe ndị e degharịrị na Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ amaokwu a gosiri? (w15 12/15 17 ¶1-3)
-
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Aịza. 25:1-9 (th ihe ọmụmụ nke 10)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Chọpụta isiokwu ga-amasị onye ahụ. Gosi ya ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, ya bụ, jw.org. (lmd isi nke 1 nọmba nke 3)
5. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Kụziere mmadụ otu n’ime eziokwu ndị dị n’ihe ndị ọzọ a kọwara nke A na broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya. (lmd isi nke 9 nọmba nke 4)
6. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere
(Nkeji 5) Ihe ngosi. ijwbq isiokwu nke 160—Isiokwu: Gịnị Mere E Ji Kpọọ Jizọs Ọkpara Chineke? (th ihe ọmụmụ nke 3)
Abụ nke 144
7. Jiri Obi Gị Niile Tụkwasị Jehova Obi Mgbe Ị Na-akwadebe Ịga Ụlọ Ọgwụ Ma Ọ Bụ Ịwa Ahụ́
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Jehova na-echebe “ndị ji obi ha niile tụkwasị [ya] obi.” (Gụọ Aịzaya 26:3.) Mgbe anyị na-akwadebe ịga ụlọ ọgwụ ma ọ bụ ịwa ahụ́, anyị ga-egosi na anyị ji obi anyị niile tụkwasị Jehova obi ma anyị nabata aka o si ná nzukọ ya na-enyere anyị.
Kpọnye VIDIO Bụ́ Ì Jikerela Maka Ihe Nwere Ike Ime Ka E Buga Gị Ụlọ Ọgwụ? Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:
-
Olee ihe atọ ga-enyere anyị aka ịkwadebe maka ịga ụlọ ọgwụ ma ọ bụ ịwa ahụ́?
-
Olee otú akwụkwọ ndị e wepụtara a na-ekwu gbasara ahụ́ ike si enyere anyị aka?
-
Gịnị mere o ji kacha mma ịkpọtụrụ Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ?
-
Olee otú obi dị gị maka ụzọ ndị a Jehova si enyere anyị aka maka na ọ hụrụ anyị n’anya?
Nkwa Jehova kwere n’Aịzaya 26:3 na ọ ga-eme ka ndị ya “na-ebi n’udo mgbe niile” apụtaghị na ọ ga-echebe anyị ka ọrịa ọ bụla ghara ịrịa anyị. Kama, ihe ndị o si ná nzukọ ya na-enye anyị maka na ọ hụrụ anyị n’anya na-enyere anyị aka ka obi ruo anyị ala ma anyị rịawa ọrịa.
8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) lfb isi nke 54-55
Okwu Mmechi (Nkeji 3) | na Ekpere
a Ihe Ụmụ Nwaanyị Dị Ime Kwesịrị Ịma (S-401), Ihe Ndị A Chọrọ Ịwa Ahụ́ na Ndị Na-arịa Ọrịa Kansa Kwesịrị Ịma (S-407), na nke a na-akpọ Ihe Ndị Nne na Nna Nwere Ike Ime Iji Hụ na A Mịnyeghị Ụmụ Ha Ọbara (S-55). I nwere ike ịgwa ndị okenye ka ha nye gị nke ị chọrọ.

