Jenụwarị 12-18

AỊZAYA 21-23

Jenụwarị 12-18

Abụ nke 120 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Ihe Ndị Anyị Ga-amụta n’Ihe Mere Shebna

(Nkeji 10)

Akwụsịla ịdị umeala n’obi ma nzukọ Jehova nye gị ọrụ (Aịza. 22:15-19; w18.03 25 ¶7-9)

Ọ bụrụ na nzukọ Jehova anapụ gị ọrụ e nyere gị, kpebisie ike na ị ga-eji obi gị niile na-efe Jehova (Aịza. 36:3; w18.03 26 ¶10)

Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna ma ọ bụkwanụ na ị bụ okenye, mgbe ọ bụla i si na Baịbụl na-adọ mmadụ aka ná ntị, meso onye ahụ ihe otú Jehova si meso Shebna (w18.03 26 ¶11)

Aka ná ntị e ji ịhụnanya na-adọ anyị nwere ike ịbụ ụzọ Chineke si akpụzi anyị

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Aịza. 21:1​—Gịnị mere Baịbụl ji kpọọ Babịlọn “ala ịkpa nke dị ka oké osimiri”? (w06 12/1 11 ¶2)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(1 nkeji) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Ka gị na mmadụ na-akparịta ụka, mee ka ọ mata na ị bụ Onyeàmà Jehova n’agwaghị ya ihe ọ bụla gbasara Baịbụl. (lmd isi nke 2 nọmba nke 4)

5. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Kụziere mmadụ otu n’ime eziokwu ndị dị n’ihe ndị ọzọ a kọwara nke A na broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya. (lmd isi nke 1 nọmba nke 3)

6. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 2) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Onye ahụ ji ọrụ n’aka. (lmd isi nke 7 nọmba nke 4)

7. Okwu

(Nkeji 5) ijwyp isiokwu nke 71—Isiokwu: Olee Otú M Ga-esi Họrọ Onye Na-eme Nke Ọma M Ga Na-eme Ka Ya? (th ihe ọmụmụ nke 9)

Inwe onye na-eme nke ọma ị ga na-eme ka ya nwere ike ime ka i mezuo ihe ndị ị chọrọ iji ndụ gị eme

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 124

8. Mkpa Ọgbakọ

(Nkeji 15)

9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) lfb isi nke 52-53

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 3 na Ekpere