Febụwarị 23–Mach 1
AỊZAYA 38-40
Abụ nke 4 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
Ebe onye ọzụzụ atụrụ n’Izrel oge ochie ku nwa atụrụ n’ahụ́
1. “Ọ Ga-azụ Ìgwè Atụrụ Ya Otú Onye Na-azụ Atụrụ Si Azụ Atụrụ”
(Nkeji 10)
Jehova nyere anyị Okwu ya, bụ́ Baịbụl, ma chekwaa ya ka o jiri ya dọta anyị ka anyị na ya dịrị ná mma (Aịza. 40:8; w23.02 2-3 ¶3-4)
Ọ na-eji obiọma elekọta anyị (Aịza. 40:11; cl 68 ¶7)
Ọ ma anyị otu otu, ọ na-enyekwara anyị aka idi nsogbu ndị na-abịara anyị (Aịza. 40:26-29; w18.01 8 ¶4-6)
AJỤJỤ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Olee otú obi dị gị gbasara Jehova n’ihi otú a e si kọwaa onye ọzụzụ atụrụ n’Aịzaya 40:11?
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
-
Aịza. 40:3—Olee otú ihe e kwuru n’amaokwu a si mezuo n’oge Jizọs nọ n’ụwa? (ip-1 400 ¶7)
-
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Aịza. 40:21-31 (th ihe ọmụmụ nke 11)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 2) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Ka gị na mmadụ na-ekwurịta okwu, chọta otú ị ga-esi kọọrọ ya ihe ị mụtara n’ọmụmụ ihe n’oge na-adịbeghị anya. (lmd isi nke 4 nọmba nke 3)
5. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 2) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Ka gị na mmadụ na-ekwurịta okwu, chọta otú ị ga-esi kọọrọ ya banyere ọrụ ịkụzi Baịbụl ị na-arụ. (lmd isi nke 4 nọmba nke 4)
6. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 2) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. (lmd isi nke 7 nọmba nke 5)
7. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
(Nkeji 5) lff nchịkọta isi nke 18, ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ, na ihe ị ga-agba mbọ mee. Jiri otu n’ime isiokwu ndị gbara ‘n’Ihe Ị Ga-elebakwu Anya’ nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ka ọ ghọtakwuo otú Ndịàmà Jehova si hụ ibe ha n’anya. (lmd isi nke 11 nọmba nke 3)
Abụ nke 160
8. Akụkọ Ozi Afọ Ije Ozi Gara Aga
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Ị gụchaa akwụkwọ ozi si n’aka alaka ụlọ ọrụ banyere akụkọ ozi afọ ije ozi gara aga, gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ndị ọzọ na-agba ume e kwuru n’Akụkọ Ozi Ndịàmà Jehova n’Ụwa Niile n’Afọ Ije Ozi 2025. Gbaa ndị nkwusa ụfọdụ i bu ụzọ gwa ajụjụ ọnụ. Ha ga-akọ ihe ndị na-agba ume mere n’ozi ọma ha gara n’afọ gara aga.
O si n’aka NASA/Visible Earth imagery
N’afọ 2025, ndị Jehova ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ, mụọkwara ndị mmadụ Baịbụl
-
Olee ihe ndị na-agba ume ị hụrụ n’Akụkọ Ozi Afọ Ije Ozi 2025 ị ga-achọ ịkọ?
9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) lfb isi nke 64-65

